Igbo Mass Readings for November 24 2023, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 24 2023, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:36-37, 52-59

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Makabii nke Mbụ

Ka nke a gachara, Judas na ụmụnne ya kwuru sị, “Ugbu a anyị meririla ndịiro anyị, ka anyị gbagoonụ gaa wuchaa ụlọnsọ wee doogharịa ya nsọ. Ya mere ndịagha ha niile jiri zukọọ; ha wee gaba n’ugwu Zayọn.

N’ụzọ ụtụtụ nke ụbọchị iri abụọ na ise n’ime ọnwa nke itoolu bụ ọnwa nke Chislev, n’afọ nke otu narị na iri anọ na asatọ, ha biliri chụọ aja dịka iwu si kwuo, n’elu ekwu nchụaja ọhụrụ nke aja nsureọkụ ha wuru.

N’oge dakọrọ n’ụbọchị ahụ ndị mba ọzọ merụrụ ya bụ ebe nchụaja, ka ha ji ukwe, une na ụbọ akwara, opi ọnụ na epete, wee hunye ya n’aka Chineke.

Mmadụ niile madoro ihu n’ala, wee fee ma gọziekwa Onyenweanyị, onye nke mere ka ha nwee nnukwu agamniihu. Ha mere emume nhunye ebe nchụaja a nye Chineke mkpụrụ ụbọchị asatọ, jiri obi ụtọ chụọ aja nsureọkụ, aja nzọpụta na nke inye ekele.

Ha jiri okpu ndịeze e jiri ọlaedo mee chọọ ihu ụlọnsọ a mma, bịa rụnyekwa ọnụụzọ ọhụrụ na ebe obibi ndị ụkọchukwu, tinyechaa ha ụzọ. Ndị mmadụ niile nwere nnukwu añụrị ebe ọ bụ na e wepụla mkparị niile nke sitere n’aka ndị mba ọzọ.

Ka e mechara, Judas na ụmụnne ya na ọgbakọ niile nke Izrel kpebiri na a ga na-eme emume ncheta ụbọchị ahụ e hunyere ụlọnsọ ahụ n’aka Chineke kwa afọ, n’oge ahụ ha ji mee ya.

Emume a ga na-ewe ụbọchị asatọ, jupụtara n’obi ụtọ na añụrị, bido n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Chislev.

ABỤỌMA NA AZỊZA – 1 Chr 29:10, 11, 11-12, 12

Azịza: Chineke ji ike niile anyị na-enye ebube aha gị otito.

1. Ngọzi dịrị gị Onyenweanyị

Yahweh Chineke nke Izrel, nna anyị,

ebeebe ebeebe. Azịza

2. Onyenweanyị, Ị dị ukwu niile na ike bụ nke gị,

na otito na mmeri na ebube,

N’ihina ihe niile dị n’eluigwe na n’elụwa bụ nke gị. Azịza

3. Alaeze bụkwa nke gị, Onyenweanyị

A na-ebulikwa gị elu karichaa ihe niile dịka onyeisi

Ụba niile na ugwu niile si n’aka gị bịa. Azịza

4. Ọ bụkwa gị na-achị ihe niile,

ike na ebube dị gị n’aka

ibuli mmadụ elu nakwa inye onye ọbụla ike. Azịza

MBEKU – Jọn 14:5

Alleluịa, Alleluịa:

Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ, Dinwenụ na-ekwu; Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna m Ọ bụghị site na m.

Alleluịa.

OZIỌMA – 19:45-48

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu banyere n’ime ụlọnsọ Chineke malite ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa. Ọ gwara ha sị, “E dere ya, Ụlọ m ga-abụ ụlọ ekpere, ma ụnụ emegharịala ya ka ọ bụrụ ụlọ ndị ohi.

Ọ na-akuzikwa ihe ụbọchị niile n’ụlọnsọ. Ndịisi nchụaja, ndị ode-akwụkwọ na ndịisi nke ndị Juu nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, ma o nweghị ihe ha hụrụ ha nwere ike ime, n’ihina mmadụ niile kwenyere n’okwu ya.

Igbo Mass Readings for November 25 2023

Last Update: October 16, 2022