Igbo Mass Readings for October 30 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 30 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-11

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndi Filipi.

Pọl na Timoti ụmụodibo Jesu Kristi, na-edetara ụnụ ndị nsọ niile n’ime Jesu Kristi, ndị nọ na Filipi akwụkwọozi a, ụnụ na ndị Bishọp na ndị Dikin.

Amara dịrị ụnụ, ya na udo nke si n’aka Chineke Nna, na Dinwenụ anyị Jesu Kristi. Ana m ekele Chineke n’ihi ụnụ mgbe ọbụla m chetara ụnụ.

Mgbe ọbụla m na-ekpere ụnụ ekpere ana m ekpe ya n’ọñụ. Ana m ekele ụnụ maka enyemaka n’ịgbasa oziọma site n’ụbọchị nke mbụ ruo ugbu a.

Eji m n’aka na onye bidoro ọrụ ọma a n’ime ụnụ ga-arụzu ya ụbọchị Kristi ga-abịa. O kwesịrị ka ihe banyere ụnụ na-emetụta m n’obi, n’ihina ụnụ dị m n’obi mgbe niiile,

maka na ụnụ soro m keta oke n’amara ahụ; na mgbe m nọ na mkpọrọ, mgbe m na-echekwawa oziọma, na mgbe m na-eme ka ọ kwụdosie ike.

Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ ụnụ niile si agụsi m ike site n’ịhụnaanya nke Jesu Kristi.

Ekpere m bụ ka ịhụnaanya ụnụ na-abawanye ụba nke ukwu, ka ụnụ jupụtakwa n’amamiihe na ezi mkpebi niile;

Ka ụnụ nwee ike ịkwado ihe dị mma. Mgbe ahụ ụnụ ga-adị ọcha n’enweghị ntụpọ ọbụla maka ụbọchị nke Kristi,

ụnụ ejupụtakwa na mkpụrụ nke eziomume nke si n’aka Jesu Kristi maka otito na ebube nke Chineke.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 111:1-2, 3-4, 5-6.

Azịza: Lee ka ọrụ Onyenweanyị si dị ịtụnaanya.

1. Eji m obi m niile enye Onyenweanyị ekele,

n’ọgbakọ ndị eziomume,

Ọrụ Onyenweanyị niile dị ịtụnaanya

ndị niile ọ na-amasị kwesịrị ilekwasa ya anya. Azịza.

2. Ọrụ niile ọ na-arụ jupụtara n’otito na ebube

Eziomume ya enweghị ike ịgbanwe agbanwe

Ọ na-ekwe ka anyị na-echeta ọrụ ebube ya.

Onyenweanyị dị ebere dị obiọma. Azịza.

3. Ọ na-enye ndị na-atụrụ ya egwu nri;

ọ naghị echezọ ọgbụgbandụ ya.

Ọ na-echetara ndị nke ya ike ọ na-akpa

site n’inye ha oke mba ndiọzọ. Azịza.

MBEKU – Ps. 119:18

Alleluịa, Alleluịa:

Meghee anya m Onyenweanyị ka m wee hụ ihe ịtụnaanya dị n’iwu gị.

Alleluịa.

OZIỌMA – 14:1-6.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

N’otu ụbọchị Sabat, ka Jesu gara oriri n’ụlọ otu onye ọchịchị onye so n’otu ndị Farisii, ndị mmadụ nọ na-ele ya anya.

Ma lee o nwere otu nwoke nọ n’ihu ya, onye nwere ọzịza. Jesu jụrụ ndị ọkaiwu na ndị Farisii nọ ebe ahụ sị, “O ziri ezi n’iwu ịgwọ ọrịa n’ụbọchị Sabat ka ọ bụ na o zịghị?”

Ha gbara nkịtị. Jesu wee kpọrọ onye ahụ nwere ọzịza, gwọọ ya, hụ ya ka ọ laba. Ọ were sị ha,

Olee onye n’ime ụnụ ga-enwe ịnyịnyaibu mọbụ ehi, na-agaghị agụpụta ya ngwa ngwa ma ọ daba n’olulu mmiri n’ụbọchị Sabat?” Ha enweghị ike ịza ajụjụ a.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for October 30 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: December 18, 2020