Igbo Mass Readings for June 25 2027, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 25 2027, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:1, 9-10, 15-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Mgbe Abram gbara iri afọ itoolu na itoolu, Yahweh gosịrị ya onwe ya sị, “Abụ m Osebụrụwa Chineke ji ike niile. Na-aga n’ihu m ma kwụba aka gị ọtọ.” Chineke gwara Abraham sị: “N’akụkụ nke gị, ị ga-edoberịrị ọgbụgbandụ m, gị na ụmụụmụ gị ndị ga-esochi gụ site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.
Ugbu a, nke a bụ ọgbụgbandụ m, nke ị ga-edoberịrị n’etiti mụ na gị, nakwa ụmụ gị ndị ga-esochi gị” a ga ebirịrị ụmụ gị ndị nwoke niile ugwu.
Chineke gwakwara Abraham ọzọ sị, “A bịa n’ihe gbasara nwunye gị Seraị, ị gaghị akpọkwa ya Seraị kama Sera bụ ihe ị ga-akpọ ya. Aga m agọzi ya ma nyekwa gị nwa nwoke site na ya. Aga m agọzi ya, ọ ga-amụtakwa ọtụtụ mba; ndịeze mba dị icheiche ga-esite na ya pụta”.
Abraham kpudoro ihu n’ala chịakwa ọchị, na-eche n’onwe ya, “Ọ bụ nwoke gbara otu narị afọ ka a ga-amụrụ nwa; ka Sera ọ ga-amụ nwa n’oge a ọ gbarala iri afọ itoolu?”
Abraham sịrị Chineke, “kwere ka Ishmel biri n’ihu gị, nke ahụ ga-ezu”. Ma Chineke zaghachiri ya sị, mba, nwunye gị Sera ga-amụrụ gị nwa nwoke onye ị ga-akpọ Aịzik.
Mụ na ya ga-agbakwa ndụ, ọgbụgbandụ ga-adị ebeebe, ịbụ Chineke ya na Chineke nke ụmụụmụ ya ndị ga-esochi ya. N’ebe Ishmel nọ, aga m emere gị ihe ị rịọrọ.
Agọziela m ya, agakwa m eme ya ka ọ mụbaa, dị ụbara. Ọ ga-abụ nna ọkpara ndịeze iri na abụọ, aga m eme ya ka ọ ghọọ nnukwu mba.
Ma mụ na Aịzik onye Sera ga-amụtara gị oge ugbu a n’afọ ọzọ ga-agba ndụ”. Mgbe ọ gwachara Abraham okwu, Chineke si n’ebe ọ nọ pụọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 128:1-2, 3, 4-5
Azịza: Lee, otu Onyenweanyị si agọzi ndị na-atụrụ ya egwu.
1. Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu,
na-eso ụzọ ya.
Ihe aka gị kụtara ka ị ga-eri,
añụrị na ọganihu ga-abụ nke gị.
Azịza: Lee, otu Onyenweanyị si agọzi ndị na-atụrụ ya egwu.
2. Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn,
na-amị mkpụrụ n’ime ụlọ gị,
ụmụ gị ga-adị ka osisi Oliv,
gbaa oche nri gị gburugburu.
Azịza: Lee, otu Onyenweanyị si agọzi ndị na-atụrụ ya egwu.
3. Lee, otu ahụ ka a ga-esi gọzie onye ahụ,
nke na-atụrụ Chineke egwu.
Ka Onyenweanyị si na Zayọn gọzie gị,
ka ị hụkwa ọganiihu nke Jerusalem
ụbọchị ndụ gị niile.
Azịza: Lee, otu Onyenweanyị si agọzi ndị na-atụrụ ya egwu.
MBEKU – Ps. 119:27
Alleluia, Alleluịa:
Mee ka nghọta ihe iso ụzọ gị pụtara, ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.
Alleluia.
OZIỌMA – 8:1-4
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe Jesu siri n’elu ugwu ahu rịdata, oke igwe mmadụ sooro ya; otu onye ekpenta bịakwutere ya, sekpuru ala n’ihu ya rịọ ya sị, “Dinwenụ, ọ bụrụ na ị chọrọ, mee ka m dị ọcha”.
Jesu setịrị aka ya, metụ ya aka sị: “Achọrọ m; dị ọcha”. Ozigbo ahụ, ọrịa ekpenta ya wee laa. Ma Jesu sịrị ya, “Hụkwa na ị gwaghị onye ọbụla; gaba, gosi onye ụkọchukwu onwe gị, tụọ mmamma dịka Mosis nyere n’iwu, iji gosi ndị mmadụ na ahụ adịla gị mma”.
Igbo Mass Readings for June 26 2027, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for June 25 2027, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.