Igbo Mass Readings for July 14 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 14 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 46:1-7, 28-30
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Izrel biliri njem, ya na ihe niile o nwere. Mgbe ọ bịarutere Biasheba, ọ chụụrụ Chineke nke nna ya Aịzik aja. N’ime ọhụ nke ọ hụrụ n’abalị ahụ, Chineke kpọrọ ya sị: “Jekọb, Jekọb, o wee zaa ya sị: “Anọ m ebe a”.
Ọ gwa ya sị, “Abụ m Osebụrụwa, Chineke nke nna gị; ụjọ atụla gị n’ịbanye ljipt, n’ihina ebe ahụ ka m ga-eme gị nnukwu obodo.
Aga m eduru gị gaa ljipt, emechaa aga m akpọghachi gị azụ, aka Josef n’onwe ya ga-ekpuchi iku anya gị”. Jekọb wee hapụ obodo Biasheba, Ụmụ Izrel wee buru nna ha Jekọb na ụmụ ha na ndị nwunye ha n’ụgbọala ahụ nke Fero zitere ka e jiri bute ha.
Ha kpụkwaara chi niile ha nwere, ma akụnụụba ndị ha kụtara n’ala Kenaan, wee banye Ijipt, Jekọb na ụmụ ya niile, ụmụ ya ndị nwoke, ụmụụmụ ya ndị nwoke, ụmụ ya ndị nwaanyị, ụmụụmụ ya ndị nwaanyị na akụnụụba ya niile sooro ya bata n’ljipt.
Izrel buru ụzọ zipụ Juda ka ọ gaa gwa Josef ka o zute ya na Goshen. E mechaa ha batara Goshen. Josef kwadoro ụgbọala ya jee izute nna ya Izrel na Goshen, Ozigbo o rutere, Josef makụrụ nna ya, nọrọ n’ubu ya bee akwa ogologo oge.
Izrel gwara Josef sị, “Ugbu a, m hụrụla gị ihu na ihu, ma matakwa na ị ka nọ ndụ, ọnwụ gbuzie m”.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 37:3-4, 18-19, 27-28, 39-40
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
1. Tụkwasịobi gị n’Onyenweanyị ma mekwaa ezi ihe
ka I wee biri na-ala ebe obibi gị ma nwee udo.
Nwebe añụrị n’ime Onyenweanyị
ka O wee nye gị ihe obi gị na-achọ. Azịza
2. Onyenweanyị na-echekwa ndụ ndị eziomume
ihe nketa ha ga-adịgide ebeebe;
Ha agaghị ata ahụhụ n’oge ihe siri ike,
n’oge oke agụụ, ha ga-enwe ihe oriri n’uju. Azịza
3. Zere njọ, ma mebe mma,
ka i wee nweta ụlọ dị ebeebe.
N’ihina Onyenweanyị hụrụ ihe ziri ezi n’anya;
Ọ naghị ahapụ ndị kwere na ya.
Ndị ajọomume ga-ebibicha.
Otu mgbe, a ga-achụpụcha ụmụ ha. Azịza
4. Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa,
Ọ na-echekwaba ha n’oge nsogbu;
Onyenweanyị na-enyere ha aka, na-azọpụtakwa ha
Ọ na-azọpụta ha n’ihina ọ bụ onye nchedo ha. Azịza
MBEKU – Jọn 14:23
Alleluia, Alleluia
Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edobe okwu m, Nna m, ga-ahụkwa ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.
Alleluia.
OZIỌMA – 10:16-23
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, Lee, ana m ezipụ ụnụ dịka ụmụatụrụ n’etiti ọdụm. Ya bụ, chaanụ akwụ dịka agwọ, ma dịnụ umeanị n’omume dịka nduru.
Zerenụ ndị mmadụ, n’ihina ha ga-arara ụnụ nye n’ụlọikpe, ha ga-apịa ụnụ ihe n’ụlọ nzukọ ha dị icheiche. Ha ga-akpụgara ụnụ ndị na-achị achị na ndịeze n’ihi m.
Ụnụ ga-eji obere ahụ gbaara m akaebe n’ihu ha na ndị mba ọzọ. mgbe ha raara ụnụ nye, ụnụ echegbula onwe ụnụ banyere ihe ụnụ ga-ekwu, mọbụ banyere otu ụnụ ga-esi kwuo ya, n’ihina a ga-akuziri ụnụ ihe ụnụ ga-ekwu n’oge ahụ.
Maka na ọ bụghị ụnụ ga-ekwu, kama mmụọ nke Nna ụnụ ga-esi n’ime ụnụ kwuo okwu. Nwanne ga-arara nwanne ya nye n’ọnwụ; nna ga ararakwa nwa ya nye n’ọnwụ.
Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha, mee ka e gbuo ha. Mmadụ niile ga-akpọ ụnụ asị n’ihi m, ma onye nọgidesiri ike ruo n’isi njedebe ka a ga-azọpụta.
Ọ bụrụ na ha emegide ụnụ n’otu obodo, gbaganụ ọsọndụ n’obodo ọzọ; n’ezie agwa m ụnụ, ụnụ agaghị agazuo obodo niile nke Izrel tupu Nwa nke mmadụ abịa.
Nwata akwụkwọ anaghị akari onye nkuzi ya, odibo akarighịkwa nna ya ukwu; O kwesịrị ekwesị ka nwata akwụkwọ dịka onye nkuzi ya, ka odibo dịka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebụl, ụdị aha gịnị ka ha ga-enye ndị ezinụụlọ ya.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.