Igbo Mass Readings for August 11 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 11 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:32-40

lhe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Diuterọnọmi

Mosis gwara ụmụ Izrel sị “Jụọnụ ajụjụ banyere mgbe ochie gara aga, tupu a mụọ ụnụ jụrụnụ ajụjụ ruo mgbe Chineke kere mmadụ mbụ n’ụwa. Jụzuoonụ ajụjụ a n’ụwa niile.

O nweela mgbe oke ihe dị otu a mere n’ụwa mbụ? O nweela mgbe mmadụ nụrụ ihe dị otu a mbụ? O nweela ndị nụrụ olu Chineke dị ndụ mgbe o siri n’etiti ọkụ kwuo okwu dịka ụnụ nụrụ mechaa dịkwa ndụ ọzọ?

O nweela chi ọbụla jiri ịka anya jee mba ọzọ, si na ya kpọpụta otu mba, mee ha ndị nke ya dịka Yahweh bụ Chineke ụnụ mere ụnụ n’ljipt?

Ụnụ jiri anya hụ otu o siri were ọtụtụ mnwale na ọtụtụ ihe ịrịbaama na ọrụ ebube dị icheiche na oke ihe egwu dị icheiche na ike aka ya napụta ụnụ n’ljipt.

Yahweh gosiri ụnụ nke a ka ụnụ mara na ya onwe ya bụ Chineke n’ezie, e nweghị chi ọzọ ma ewepụ ya! O mere ka ụnụ nụ olu ya sitere n’eluigwe, ka o wee doo ụnụ aka na ntị.

O mekwara ka ụnụ hụ nnukwu ọkụ ya n’ụwa. Ụnụ nụkwara okwu ya sitere n’etiti ọkụ ahụ. N’ihina ọ hụrụ nnanna ụnụ ha n’anya, ọ họrọla ụnụ, werekwa nnukwu ike ya kpọpụta ụnụ n’ljipt.

Ọ chụpụkwaara ụnụ ọtụtụ mba dị ukwuu dịkwa ike karịa ụnụ ka o wee kpọbata ụnụ nye ụnụ ala ha, nke bụrịrị ala ụnụ ruo taa.

Ya bụ matanụ ya taa, tinyekwanụ ya n’obi ụnụ na Yahweh bụ Chineke ezie n’eluigwe na n’elu ụwa. O nweghị chi ọzọ ma e wepụ ya.

Dobenụ iwu ya niile nke m nyere ụnụ taa ihe ga-agakwara ụmụ ụmụ ụnụ niile nke ọma. Nke a ga-emekwa ka ụnụ bie ogologo ndụ n’ala ahụ Yahweh bụ Chineke ụnụ na-enye ụnụ ebeebe.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 77: 12-13, 14-15, 16, 21

Azịza: Aga mecheta ọrụ niile nke Onyenweanyị

1. Aga m echeta ọrụ niile nke Onyenweanyị

Ee, aga m echeta ọrụ ịtụnanya niile ị rụrụ mgbe ochie

Ana m atụle ọrụ gị niile n’obi m,

na-achịgharị n’uche ọrụ ebube gị niile. Azịza

2. Ụzọ gị O Chineke dị nsọ,

Kedụ Chineke ọzọ dị ukwu ka Chineke anyị?

Gị bụ Chineke na-arụ ọrụ ebube,

onye nke gosiri ike ya n’ebe ndị mba niile nọ. Azịza

3. Gị ji aka gị gbapụta ndị nke gị,

ụmụ Jekọb na ụmụ Josef

Ị na-edu ndị nke gị dịka igwe atụrụ,

site n’aka Mosis na Erọn. Azịza

MBEKU – Ps 27:11

Alleluia, Alleluia

Kuziere m ụzọ gị O Dinwenụ, Dube m n’ụzọ kwụ ọtọ.

Alleluia.

OZIỌMA – 16:24-28

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ọbụla chọrọ iso M ga-ajụ onwe ya, buru obe ya bịa sobe m.” N’ihina onye ọbụla na-achọ ịzọ ndụ ya ga-atụfu ya, ma onye ọbụla tụfuru ndụ ya n’ihi m ga-achọta ya.

Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile n’uru ma tụfuo ndụ ya? Mọbụ gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwo ndụ ya?

N’ihina Nwa nke mmadụ na ndị mmụọọma ya ga-abịa n’otito nke Nna ya. Mgbe ahụ ọ ga-akwụ onye ọbụla ụgwọ dịka omume ya siri dị.

N’ezie asị m ụnụ, e nwere ụfọdụ ndị kwụ n’ebe a agaghị ahụ ọnwụ ruo mgbe ha ga-ahụ nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’alaeze ya.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for August 11 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 10, 2022