Igbo Mass Readings for August 9 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 9 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1, 3; 3:1-3, 6-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Nahum

Onye mbibi abịakwasịla gị, Ninive. Tinye ndị nche n’ebe nchekwa gị niile, chee ụzọ gị niile nche, kee akwa gị n’ukwu, jikọtakwa ike gị niile ọnụ.

Ụta nke ndịagha ya na-acha ọbara ọbara, ndị bụ dike n’agha yikwa uwe agha na-acha uhieuhie, igwe e jiri rụọ ụgbọịnyịnya ha na-egbuke egbuke, ịnyịnya ha na-amalikwa elu.

Ahụhụ dịịrị ndị Ninive obodo jupụtara n’ụgha na igbu ọchụ, n’akụnụụba a ga-akwakọrọ n’agha nakwa ndị a ga-ebibi ebibi.

Gee ntị, nụrụ ụda ụtarị na ụda ụkwụ ụgbọịnyịnya, ikiti ụkwụ ịnyịnya na mkpọtụ nke ndị na-agba ụgbọala na-eme mgbe ha na-agbagharị n’ụzọ niile.

Ndịagha ịnyịnya na agbagharị na-efegharị mmaagha na ube ha na-amụkesị amụkesị. Ndị e gburu egbu dị ọtụtụ, ozu tọgbọkwa ebe niile.

Ndị mmadụ na-asọ ngọngọ mgbe ha na-agbakwasa ozu ụkwụ wee na-agafe. Aga m awụkwasị gị ihe ruru unyi, nye gị mkparị, mee ka ị bụrụ ihe nkiri nye mmadụ niile.

Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị, ‘E bibiela obodo Ninive, onye ga-eruru ya ụjụ? Ebee ka m ga-ahụ ndị ga-akasị ya obi?

ABỤỌMA NA AZỊZA – Deut 32:35-36, 39, 41

Azịza: Ọ bụ m na-enye ndụ na-eweta ọnwụ

1. Oge na-abịa ngwangwa mgbe ha ga-ada,

Ụbọchị nhuju anya ha dịkwa nso.

Osebụrụwa ga-agbapụta ndị nke ya,

mgbe Ọ hụrụ na ike adịghịkwa ha

Ọ ga-emekwara ndị ohu ya ebere,

mgbe Ọ hụrụ na ha enweghịkwa onye inyeaka. Azịza

2. Ụnụ ahụla ugbu a na mụ, naanị mụ onwe m bụ ezi Chukwu

Ọ dịghị chi ọzọ tinyere m.

Ọ bụ m na-enye ndụ, na-eweta ọnwụ,

Ọ bụ m na-etida mmadụ, na-akpọlitekwa ha. Azịza

3. Aga m amụchapụ mmaagha m na-egbu amụma,

Aga m ahụ na e nwere ikpe nkwụmọtọ.

Aga m abọ ọbọ n’ahụ ndịiro m,

Nyekwa ndị niile kpọrọ m asị ntaramahụhụ. Azịza

MBEKU – Ps 27:11

Alleluia, Alleluia

Kuziere m ụzọ gị O Dinwenụ, Dube m n’ụzọ kwụ ọtọ.

Alleluia.

OZIỌMA – 16:24-28

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ọbụla chọrọ iso M ga-ajụ onwe ya, buru obe ya bịa sobe m.” N’ihina onye ọbụla na-achọ ịzọ ndụ ya ga-atụfu ya, ma onye ọbụla tụfuru ndụ ya n’ihi m ga-achọta ya.

Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile n’uru ma tụfuo ndụ ya? Mọbụ gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwo ndụ ya?

N’ihina Nwa nke mmadụ na ndị mmụọọma ya ga-abịa n’otito nke Nna ya. Mgbe ahụ ọ ga-akwụ onye ọbụla ụgwọ dịka omume ya siri dị.

N’ezie asị m ụnụ, e nwere ụfọdụ ndị kwụ n’ebe a agaghị ahụ ọnwụ ruo mgbe ha ga-ahụ nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’alaeze ya.

Igbo Mass Readings for August 10 2024, Emume Ncheta Lawrence dị Asọ

Igbo Mass Readings for August 9 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Last Update: September 10, 2022