Igbo Mass Readings for July 5 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 5 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:4-6, 9-12

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Amọs

Nụrụnụ nke a ụnụ ndị na-azọgbu ndị mkpa na-akpa, ma na-ekpochapụ ndị ogbenye nọ n’ala a na-asị, “Kedụ oge ọnwa ọhụrụ ga-agwụ ka anyị wee nwe ike ree ọka anyị?

Olee mgbe ezumike ga-agwụ ka anyị nwee ike ire ọka wiit anyị, ka anyị were iko anyị dị nta, meekwa ka ọnụ ahịa anyị la elu ka anyị jiri ike iko aghụghọ anyị ree ahịa.

Ka anyị were ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye jirikwa akpụkpọ ụkwụ abụọ zụta ndị mkpa na-akpa, ka anyị reekwa efulife ọka wiit anyị?”

Ma ụbọchị ahụ, ọ bụ Yahweh na-ekwu; aga m eme ka anwụ lakpuo n’etiti ehihie, meekwa ka ụwa jupụta n’ọchịchịrị n’ehihie ọcha nabọ.

Aga m atụgharị oriri ụnụ ka ọ bụrụ iru ụjụ, ukwe ụnụ niile ka ọ ghọrọ mkpu akwa; Aga m eme ka onye ọbụla n’ime ụnụ yiri akwa mkpe, mee ka ụnụ kpụchaa isi ụnụ, aga m eme ụbọchị ahụ ka ọ dịka ụbọchị iru ụjụ, maka ọnwụ sọọsọ otu nwa, ebe ngwụcha ya ga-adị ka ụbọchị lukarịchara ilu.

Lee ụbọchị ahụ na-abịa, Yahweh Chineke anyị na-ekwu, mgbe m ga-ezite ụnwụ n’ala ahụ ma ọ gaghị abụ ụnwụ nri mọbụ nke agụụ mmiri, kama ọ ga-abụ nke agụụ ịnụ okwu Chineke.

Ha ga-awagharị site n’otu osimiri ruo na nke ọzọ, site n’ugwu ruo n’ọwụwa anyanwụ: ha ga na-agbagharị ihu na azụ ịchọ okwu Chineke, ma ha agaghị achọta ya.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:2, 10, 20, 30, 40, 131

Azịza: Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.

1. Ngọzi dịrị ndị niile na-edobe ihe niile Chineke nyere n’iwu,

ndị ji obi ha niile achọ ya. Azịza

2. Eji m obi m niile achọ gị,

ekwela ka m jehie ụzọ n’iwu gị. Azịza

3. Ọ na-agụ mkpụrụobi m nnukwu agụụ

ịmụta ihe gbasara ụzọ gị mgbe niile. Azịza

4. Ahọrọla m ịkwụdosiike

atụkwasịrị m obi n’iwu gị. Azịza

5. Lee ka mkpụrụobi m si achọ gị

nye m ndụ site n’eziomume gị. Azịza

6. Eghebere m ọnụ na-eku ume

n’ihi agụụ nke iwu gị. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluịa:

Okwu gị Onyenweanyị bụ eziokwu, were eziokwu gị doo anyị nsọ.

Alleluịa.

OZIỌMA – 9:9-13

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ka Jesu hapụrụ ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu, ka ọ nọ n’ụlọụtụ. Jesu sịrị ya, “Sobe m” O wee bilie sobe ya.

Ka Jesu nọ n’oriri n’ụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ bịara soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri.

Mgbe ndị Farisii nọ n’ebe ahụ hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị: “Gịnị mere onye nkuzi ụnụ ji eso ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ eri nri?

Mgbe Jesu nụrụ nke a, Okwuru sị: “Ọ bụghị ndị ahụ dị ike na-achọ dibịa, kama ọ bụ ndị ahụ adịghịị. Gaanụ chọpụta ihe nke a pụtara, ihe na-amasị m bụ ebere, ọ bụghị aja. N’ihina abịaghị m ịkpọ ndị eziomume kama ndị omenjọ”.

Igbo Mass Readings for July 6 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for July 5 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 9, 2022