Igbo Mass Readings for July 18 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 18 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:10-12:14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
Mosis na Erọn rụchara ọrụ ebube ndị a niile n’ihu Fero ma Yahweh kpọchiri obi Fero nke na o kweghị ka ụmụ Izrel si n’ala ya pụọ.
Yahweh gwara Mosis na Erọn n’ala ljipt sị, “Ọnwa nke a ga-abụrụ ụnụ isi mbido ọnwa niile; ọ ga-abụ ọnwa nke mbụ n’afọ.
Gwa ọgbakọ ndị Izrel, sị: Ụbọchị ọnwa a ga-adị na mkpụrụ ụbọchị iri, nwoke ọbụla ga eweta otu nwaatụrụ dịka otu ụlọ nna ha siri dị; otu nwaatụrụ maka ezinụụlọ ọbụla.
Mana ọ bụrụ na e nwere ezinụụlọ dị nta nke na ha agaghị ericha otu nwaatụrụ, ha ga-esonyere ndị agbataobi ha dịkwa nta, ha na ha ga-enwe ike iricha otu nwaatụrụ.
A ga-akpachapụ anya mata ole onye ọbụla ga-enwe ike iricha iji mata mmadụ ole ha ga-adị. Nwaatụrụ ahụ agaghị enwe ntụpọ ọbụla; ọ ga-adị ka chi si kee ya, gbaa naanị otu afọ.
Ụnụ ga-esi n’etiti atụrụ mọbụ ewu were ya. Ụnụ ga edobe ya ruo mgbe ọnwa gbara iri na anọ, bụ mgbe ọgbakọ Izrel niile ga-egbugbado nwaatụrụ ha n’oge mgbede.
E mechaa ha ga-ewere ụfọdụ n’ime ọbara anụ ahụ tee n’ide nke ọnụụzọ na n’elu mgbo nke dị n’ụlọ niile ha ga-anọ rie ụmụatụrụ ahụ.
Ha ga-eri ha n’abalị ahụ ma a ga-ahụ ya n’ọkụ, ha ga-eji achịcha ekoghị eko na akwụkwọ ilu were rie ya. Ụnụ agaghị eri nke ọbụla dị ndụ mọbụ nke e siri esi kama ụnụ ga-ahụ akụkụ ahụ ya niile tinyerè isi ya, ukwu ya na ime ahụ ya n’ọkụ.
Ụnụ ga-agbakwa mbo hụ na o nweghị nke ọbụla n’ime ya ga-abọ chi, ihe ọbụla fọdụrụ afọdụ ruo n’ụtụtụ ụnụ ga-akpọ ya ọkụ.
N’usoro a ka ụnụ ga-esi rie ya, ụnụ ga-ekechisi akwa ụnụ ike, gbara akpụkpọ ụkwụ, jidekwa mkpọ ụnụ n’aka, wee rie ya ngwangwa. Ọ bụ oriri ngabiga nke Yahweh.
N’ihina aga m esi n’ala Ijipt gafee n’abalị ahụ, were gbuchapụ nwa nwoke mbụ niile nọ n’ala ahụ, ma mmadụ ma anụọhịa, aga m ekpekwa chi niile nọ n’ala Ijipt ikpe were nye ha ọnọdụ kwesịrị ha, ọ bụ m bụ Yahweh.
Ọbara ahụ ga-abụrụ akara ịrịbaama nke ga egosị ụlọ ndị ụnụ bi n’ime ya. Mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m esi ebe ụnụ nọ gafee, o nweghị nsogbu ọbụla ga-adakwasa ụnụ, mgbe m ga akụsasị ala ljipt niile.
Ụbọchị a ga-abụrụ ụnụ ihe ncheta, nke ụnụ ga edobe n’ụzọ pụrụ iche ka ọ bụrụ ụbọchị oriri nke Yahweh ụnụ ga na asọpụrụ ya ka iwu ndụdụgandụ niile.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 116:12-13, 15-16, 17-18
Azịza: Aga m ebuli iko nzọpụta, wee kpọkuo aha nke Onyenweanyị.
1. Kedụ ihe m ga-enye Onyenweanyị?
Maka iheọma niile o meere m.
Aga m ebuli iko nzọpụta,
wee kpọkuo aha nke Onyenweanyị.
Azịza: Aga m ebuli iko nzọpụta, wee kpọkuo aha nke Onyenweanyị.
2. Ọnwụ onye eziomume dị oke ọnụ,
n’ebe Onyenweanyị nọ,
Onyenweanyị abụ m nwodibo gị nwa nwaanyị ezigbo omume,
ị tọpụla m n’agbụ.
Azịza: Aga m ebuli iko nzọpụta, wee kpọkuo aha nke Onyenweanyị.
3. Aga m achụrụ gị aja ekele
wee kpọkuo aha nke Onyenweanyị.
Aga m emejupụta nkwa m kwere Onyenweanyị
n’ihu ndị nke ya niile.
Azịza: Aga m ebuli iko nzọpụta, wee kpọkuo aha nke Onyenweanyị.
MBEKU – Heb 4:12
Alleluia, Alleluia:
Okwu Chineke dị ndụ, dị ike. Ọ na-enyocha echiche na izu niile nke obi.
Alleluia.
OZIỌMA – 12:1-8
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’oge ahụ Jesu si n’ubi ọka na-agafe n’ụbọchị Sabat. N’ihina agụụ na agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha malitere ghọba ogbe ọka na-ata mkpụrụ ha.
Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha sịrị Jesu. “Lee, ndị na-eso ụzọ gị na eme ihe megidere iwu n’ụbọchị Sabat”. Jesu zara ha sị, “Ọ bụ na ụnụ agụtabeghị ihe Devid na ndị ya na ha so mere mgbe agụụ gụrụ ha: Otu o siri banye n’ụlọnsọ Chineke were achịcha a na-eche n’ihu Chineke rie, nke ya mọbụ ndị ya na ha so etosịghị irinụ; kama ọ bụ naanị ndị nchụaja kwesịrị iri ya?
Ka ọ bụ na ụnụ agụbeghị ihe e dere n’iwu Mosis, otu ndị nchụaja n’ụlọnsọ si emerụ ụbọchị Sabat ma a naghụ agụrụ ha nke a n’iwu.
Ana m agwa ụnụ na ihe ka ụlọnsọ nọ ebe a. Ọ bụrụ na ụnụ ghọtara ihe nke a pụtara, ihe na-amasị m bụ ebere, ọ bụghị aja, ụnụ akaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe. N’ihina Nwa nke mmadụ bụ onyenwe ụbọchị Sabat”.
Igbo Mass Readings for July 19 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for July 18 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.