Igbo Mass Readings for July 19 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 19 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 38:1-6, 21-22, 7-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Isaiah
N’oge ahụ, Hezekaya dara n’oke ọrịa nke gaara igbu ya. Onyeamụma Aịzaya nwa Amọz bịakwutere ya sị: “Yahweh kwuru sị, ‘Dozie ezinụụlọ gị nke ọma n’ihina ị ga-anwụ. Ị gaghị esite n’akwa ọrịa gị bilie.”
Mgbe Hezekaya nụrụ ya, ọ tụgharịrị chee ihu n’aja kpọkuo Chineke sị, “O Chukwu! chetakwa otu m siri were obi m niile, kwụdosie ike na gị, chetakwa ụzọ niile m si gbalịsie ike ime ihe dị mma n’ihu gị.”
Hezekaya bere akwa nke ukwuu. Mgbe ahụ Chineke ziri Aịzaya ozi sị: “Jee gwa Hezekaya, ‘otu a ka Osebụrụwa Chineke nke Devid bụ nnanna gị kwuru; Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri gị.
Ugbu a, aga m agbakwunyere gị afọ iri na ise ọzọ n’ihu. Aga m azọpụta gị n’obodo a site n’aka eze ndị Asiria. Aga m echekwa obodo a.”‘
Aịzaya agwala ndịozi siị ha: “Werenụ mmanụ Fiig tee ya n’etuto ahụ toro Hezekaya, ahụ ga-adịkwa ya mma ọzọ.” Hezekaya jụkwara ajụjụ sị: “Olee ihe ịrịbaama ga-egosi na m ga-eje n’ụlọ nke Yahweh?”
“Nke a bụ ihe ịrịbaama si n’aka Osebụrụwa nke ga-egosị na ọ ga-emezu ihe o kwuru. N’ụzọ ihe nrugo nke Eze Ahaz rụrụ, Yahweh ga-eme ka onyinyo gaghachi azụ nzọụkwụ iri.” Onyinyo wee laghachị azụ nzọụkwụ iri.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Isa. 38:10, 11, 12, 16.
Azịza: Ị weghachitela ndụ m site n’olulu mbibi; Ị gbagharala m mmehie m niile.
1. Echere m n’oge m nọ n’okorobịa,
ka m ga-ala n’ala ndị nwụrụ anwụ,
na-eketala m ọnụụzọ nke ala mmụọ
maka ụbọchị m niile nke fọdụrụ na ndụ m. Azịza
2. Echere m na agaghị m ahụ Osebụrụwa ọzọ
n’ala ndị dị ndụ,
na agaghịkwa m ahụ mmadụ ọzọ n’ime ụwa. Azịza
3. E wepụla ndụ m
dịka onye nche atụrụ si ewepụ ụlọ ya.
Dịka okwe akwa si apịakọta akwa, ọ pịakọtala ndụ m,
o bepụla ndụ m dịka okwe akwa si ebepụ akwa n’igwe e ji ekwe ya. Azịza
4. Chukwu ihe ndị a jupụtara na ndụ mmadụ;
ọ bụkwa n’ihe a ka m dị ndụ nke mmụọ.
Bido gwọọ m, mekwaa ka m dị ndụ. Azịza
MBEKU – Heb 4:12
Alleluia, Alleluia:
Okwu Chineke dị ndụ, dị ike. Ọ na-enyocha echiche na izu niile nke obi.
Alleluia.
OZIỌMA – 12:1-8
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’oge ahụ Jesu si n’ubi ọka na-agafe n’ụbọchị Sabat. N’ihina agụụ na agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha malitere ghọba ogbe ọka na-ata mkpụrụ ha.
Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha sịrị Jesu. “Lee, ndị na-eso ụzọ gị na eme ihe megidere iwu n’ụbọchị Sabat”. Jesu zara ha sị, “Ọ bụ na ụnụ agụtabeghị ihe Devid na ndị ya na ha so mere mgbe agụụ gụrụ ha: Otu o siri banye n’ụlọnsọ Chineke were achịcha a na-eche n’ihu Chineke rie, nke ya mọbụ ndị ya na ha so etosịghị irinụ; kama ọ bụ naanị ndị nchụaja kwesịrị iri ya?
Ka ọ bụ na ụnụ agụbeghị ihe e dere n’iwu Mosis, otu ndị nchụaja n’ụlọnsọ si emerụ ụbọchị Sabat ma a naghụ agụrụ ha nke a n’iwu.
Ana m agwa ụnụ na ihe ka ụlọnsọ nọ ebe a. Ọ bụrụ na ụnụ ghọtara ihe nke a pụtara, ihe na-amasị m bụ ebere, ọ bụghị aja, ụnụ akaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe. N’ihina Nwa nke mmadụ bụ onyenwe ụbọchị Sabat”.
Igbo Mass Readings for July 20 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for July 19 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.