Igbo Mass Readings for July 28 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 28 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 20:1-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
Chineke kwukwara okwu niile ndị a sị, “Abụ m Yahweh na Chineke gị, onye nke kpọpụtara gị site n’ala Ijipt, ebe ị nọ dịka ohu”. “Ị gaghị enwe chi ọzọ belụsọ m.
Ị gaghị emere onwe gị ihe ọbụla n’ụdị oyiyi nke ihe dị n’eluigwe, na n’okpuru eluigwe mọbụ n’ụwa, mọbụ n’ime osimiri, mọbụ n’ime ala.
“Akpọla isiala nye ha mọbụ fee ha ofufe, n’ihina mụ onwe m bụ Yahweh na Chineke gị bụ Chineke ekworo, ana m ata ụmụ ahụhụ maka ajọomume nke nnanna ha mere bido n’ụmụụmụ nke mbụ ruo na nke atọ nakwa nke anọ bụ ndị kpọrọ m asị.
Ana m egosikwa puku kwuru puku mmadụ ndị hụrụ m n’anya, na-edebe iwu m ịhụnaanya nke m na-enweghị ube.
“Akpọla aha Yahweh Chineke gị na nkịtị, n’ihina Yahweh agaghị ahapụ ịma onye kpọrọ aha ya na nkịtị ikpe. “Cheta ụbọchị izu ike, doo ya nsọ.
Mkpụrụ ụbọchị isii ka i nwere ike ịrụ ọrụ ọbụla ị chọrọ ịrụ; ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike, bụrụkwa ụbọchị ị ga-ehunyere Yahweh Chineke gị, ị gaghị arụ ọrụ ọbụla na ya, gị mọbụ nwa gị nwoke mọbụ nwa gị nwaanyị mọbụ ndị ohu gị nwoke na nwaanyị, mọbụ ehi gị, mọbụ onye ọbịa bi n’ụlọ gị.
N’ihina ọ bụ n’ime mkpụrụ ụbọchị isii ka Chineke ji kee eluigwe na ụwa, na osimiri na ihe niile bi n’ime ya, ma zuo ike n’ụbọchị nke asaa; ya mere Yahweh ji gọzie ụbọchị izu ike a, doo ya nsọ.
“Sọpụrụ nna gị na nne gị ka i wee bie ogologo ndụ n’ala nke Yahweh Chineke gị ga-enye gị. “Gị egbula ọchụ. “Gị ayịla ọyị. “Gị ezula ohi. “Gị agbala ama asị megide mmadụ ibe gị.
“Gị enwela anya ukwu n’ebe ụlọ mmadụ ibe gị dị, gị enwela anya ukwu n’ebe nwunye mmadụ ibe gị nọ, ohu ya nwoke, mọbụ ohu ya nwaanyị nọ, n’ebe ehi ya, mọbụ ịnyịnyaibu ya nọ, mọbụ n’ebe ihe ọbụla bụ nke onye agbataobi gị dị”.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 19:8, 9, 10, 11
Azịza: Onyenweanyị, ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebeebe.
1. Iwu nke Onyenweanyị zuru oke
Ọ na-enye mkpụrụobi ndụ ọhụrụ
Atụmaatụ Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi
Ọ na-enye ndị dị umeala amamihe. Azịza
2. Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ,
ọ na-enye obi añụrị;
iwu nke Onyenweanyị pụtara ihe,
ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ. Azịza
3. ịtụ egwu Onyenweanyị bụ ihe dị mma;
ọ na-adị ebeebe;
Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu;
ha niile kwụkwa ọtọ. Azịza
4. Ọ dị mkpa karịa ọlaedo:
ọ bụladị ọlaedo kacha mma;
okwu ya dị ụtọ karịa mmanụ añụ,
ọ bụladị mmanụ añụ a zara aza. Azịza
MBEKU – Jemis 1:21
Alleluia, Alleluia:
Werenụ nwaayọ nara okwu ahụ nke a kụrụla n’obi ụnụ dị ka mkpụrụ, nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụobi ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 13:18-23
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, Nụrụnụ nkọwa ụkabụilu ọgha mkpụrụ. Mgbe onye ọbụla nụrụ okwu gbasara alaeze ma ọ ghọtaghị ya, ekwensu na-abịa pụnarị ya okwu ahụ a kụrụ n’obi ya.
Nke a bụ mkpụrụ ahụ dara n’okporo ụzọ. Mkpụrụ nke dara n’ala okwute bụ onye ahụ nụrụ okwu Chineke, jiri ọñụ nara ya, otu oge ahụ.
Ma n’ihina okwu ahụ enweghị mgbọrọgwụ n’ime ya, ihe ọ na-anọ bụ nwa oge. Mgbe nsogbu mọbụ mkpagbu bịara n’ihi okwu ahụ, ọ na-adapụ n’okwukwe ozigbo ahụ.
Mkpụrụ nke dara n’etiti ogwu bụ onye nụrụ okwu ahụ ma nchekasị nke ụwa na ịhụ akụ nke ụwa n’anya na-akpagbu okwu ahụ mekwaa ka ọ ghara ịmịta mkpụrụ.
Nke dara n’ala dị mma bụ onye nụrụ okwu ahụ ma ghọtakwa ya; wee mịta mkpụrụ. N’otu akụkụ ọ mịtara otu narị mkpụrụ, n’akụkụ nke ọzọ iri isii, na nke ọzọkwa iri atọ”.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.