Igbo Mass Readings for July 26 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 26 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:14-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah
“Lọghachikwutenụ m biko ụnụ ụmụ ntakịrị enweghị okwukwe,” Osebụrụwa na-ekwu. “N’ihina m bụ nna ụnụ ukwu, aga m akpọrọ ụnụ otu onye site n’otu obodo nakwa abụọ site n’otu ezinụụlọ.
Aga m akpọga ụnụ na Zayọn. Aga m enyekwa ụnụ ndị nche atụrụ na-eme uche m, ndị ga-eji amamihe na nghọta na-azụ ụnụ nri.
N’oge ahụ, mgbe ụnụ mụbawanyechara ma baakwa ụba n’ala ahụ,” Yahweh na-ekwu, “Ha agakwaghị ekwu ọzọ sị, ‘Ebee ka ụgbọ nke ọgbụgbandụ nke Yahweh dị.
Agaghị echetakwa ya n’echiche; ọ gaghị abatakwa n’obi ndị mmadụ, nke a na-enwekwa mwute ma ya; a gaghị arụgharịkwa ya ọzọ.
N’oge ahụ a ga-akpọ Jerusalem ocheeze nke Yahweh, mba niile ga ezukọta na ya n’ihu nke Chineke, ha agaghị esokwa ụzọ ọjọọ ha na mkpọchi obi ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Jer 31:10, 11-12, 13
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwaba anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
1. Geenụ ntị n’okwu nke Yahweh, ụnụ mba niile
meenụ ka a nụ ya n’ụwa niile,
Kwuonụ sị na onye nke kposara Izrel ga-ekpokọtakwa ya ọnụ ọzọ
ọ ga-echekwa ya dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya. Azịza
2. Maka na Yahweh agbapụtala Jekọb
mee ka o nwere onwe ya n’aka ndị na-akpagbu ya.
Ha ga-abịa bụọ abụ na-adasi ụda ike n’elu Zayọn.
ha ga na-egbuke site n’afọọma na ịmamma Chineke. Azịza
3. Mgbe ahụ ụmụagbọghọ ga-agba egwu ọñụ,
ụmụokorobịa na ndị okenye ga-ejupụtakwa n’añụrị.
Aga m agbanwe iru ụjụ ha ma mee ka ha nwee añụrị
aga m atasị ha obi were obi añụrị gbanwee ahụhụ ha. Azịza
MBEKU – Jemis 1:21
Alleluia, Alleluia:
Werenụ nwaayọ nara okwu ahụ nke a kụrụla n’obi ụnụ dị ka mkpụrụ, nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụobi ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 13:18-23
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, Nụrụnụ nkọwa ụkabụilu ọgha mkpụrụ. Mgbe onye ọbụla nụrụ okwu gbasara alaeze ma ọ ghọtaghị ya, ekwensu na-abịa pụnarị ya okwu ahụ a kụrụ n’obi ya.
Nke a bụ mkpụrụ ahụ dara n’okporo ụzọ. Mkpụrụ nke dara n’ala okwute bụ onye ahụ nụrụ okwu Chineke, jiri ọñụ nara ya, otu oge ahụ.
Ma n’ihina okwu ahụ enweghị mgbọrọgwụ n’ime ya, ihe ọ na-anọ bụ nwa oge. Mgbe nsogbu mọbụ mkpagbu bịara n’ihi okwu ahụ, ọ na-adapụ n’okwukwe ozigbo ahụ.
Mkpụrụ nke dara n’etiti ogwu bụ onye nụrụ okwu ahụ ma nchekasị nke ụwa na ịhụ akụ nke ụwa n’anya na-akpagbu okwu ahụ mekwaa ka ọ ghara ịmịta mkpụrụ.
Nke dara n’ala dị mma bụ onye nụrụ okwu ahụ ma ghọtakwa ya; wee mịta mkpụrụ. N’otu akụkụ ọ mịtara otu narị mkpụrụ, n’akụkụ nke ọzọ iri isii, na nke ọzọkwa iri atọ”.
Igbo Mass Readings for July 27 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for July 26 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.