Igbo Mass Readings for August 16 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 16 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 16:1-15, 60, 63

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel

Okwu nke Yahweh bịakwutere m sị; “Nwa nke mmadụ, mee ka Jerusalem mata arụ ya niile, ma kwuo sị: ‘Nke a ka Yahweh gwara Jerusalem; isi mmalite gị na omume gị sitere n’ala ndị Kenaan, nna gị bụ onye Amọraịt, ebe nne gị bụ onye Hitaịt.

Banyere ọmụmụ gị, n’ụbọchị a mụrụ gị e gbubighị eriri alọ gị, a sachakwaghị gị ka ị dị ọcha, mọbụ tee gị nnu mọbụ wanye gị akwa nwa.

O nweghị anya ọbụla ji ọmịiko lekwasa gị, iji meere gị ihe ndị a n’obi ebere, kama a tụfuru gị na mbara ezi n’ihina a kpọrọ gị asị n’ụbọchị ahụ a mụrụ gị.

Ma mgbe m gafere n’ebe ị nọ, hụ gị ka ị na-atụgharị n’ime ọbara gị, asịrị m gị, dị ndụ, ma tokwaa dịka osisi n’ime ọhịa.

I wee tolite, dị ogologo, ma tozuo agbọghọ; ara gị wee pụta, ntụtụ gị etojuo; mana ị ka gba ọtọ n’eyighị ihe ọbụla.

Mgbe m gafere ọzọ n’ebe ị nọ ma lekwaa gị anya, m hụrụ na i toruola ogo maka ịhụnaanya, e kpugidere m gị akwa m n’ahụ iji kpuchie ịgba ọtọ gị.

Añụọrọ m gị iyi, mụ na gị agbaa ndụ, i wee ghọọ nke m, Ọ bụ Yahweh na-ekwu. Ejiri m mmiri saa gị ahụ, sachapụ gị ọbara ma teekwa gị mmanụ.

Eyibere m gị uwe a kpara nke ọma, yibe gị akpụkpọ ụkwụ; ma kekwaa gị akwa isi, were uwe ụlarị kpuchie gị. Ejiri m ngwa ọla dị icheiche chọọ gị mma, gbanye gị ọla n’aka abụọ, bịa nyawakwa gị ihe olu.

A gbanyere m gị ọla imi na ọla ntị, ma kpuwekwa gị okpu eze mara mma n’isi. Otu a ka m siri were ọlaọcha na ọlaedo chọọ gị mma, uwe gị bụkwa ụlarị mara mma na uwe ọcha na akwa a kpara nke ọma.

Nri gị bụ ntụọka mara mma mmanụ añụ na mmanụ dị oke ọnụ. Ị bịa maa mma nke ukwu ruo ogo eze nwaanyị.

Aha gị gazuru mba niile n’ihi mma gị nke zuru oke site n’onyinye niile m nyere gị, Ọ bụ Yahweh na-ekwu. Ma ị tụkwasara obi na mma gị wee mee onwe gị onye akwụna n’ihi oke aha gị, ma werekwa onwe gị nye onye ọbụla bịakwutere gị.

Ma aga m echetakwa ọgbụgbandụ mụ na gị mgbe ị dị na nwata, aga m edotakwa n’etiti mụ na gị ọgbụgbandụ ga-adị ebighịebi, ka ị wee cheta ma nwee mgbagwojuanya, ma gharakwa imeghe ọnụ gị ọzọ n’ihi ihere gị, oge m ga-agbaghara gị n’ihe niile i mere, Ọ bụ Yahweh na-ekwu.

  MỌBỤ

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 16:59-63

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel

Ee otu a ka Yahweh Chineke na-ekwu. Aga m emeso gị dịka omume gị si dị, gị onye ledara iyi ị ñụrụ anya, bịa mebie ọgbụgbandụ ahụ.

Ma aga m echetakwa ọgbụgbandụ mụ na gị mgbe ị dị na nwata, aga m edotakwa n’etiti mụ na gị ọgbụgbandụ ga-adị ebighịebi.

Mgbe ahụ ị ga-echeta ụzọ gị niile ma nwee ihere, mgbe m ga-ewere ụmụnnne gị ndị nwaanyị, ma nke okenye ma nke nta, nye gị ha dịka ụmụ, mana ọ bụghị n’ihi ọgbụgbandụ mụ na gị.

Aga m edotakwa ọgbụgbandụ mụ na gị, ị ga-amatakwa na abụ m Yahweh, ka i wee cheta ma nwee mgbagwojuanya ma gharakwa imeghe ọnụ gị ọzọ n’ihi ihere gị, oge m ga-agbaghara gị n’ihe niile i mere, ọ bụ Yahweh na-ekwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Aịzaya 12: 2-3, 4, 5-6

Azịza: Onyenweanyị Iwe gị adajụọla; I were kasie m obi.

1. Lee, Chineke bụ onye nzọpụta m;

enwere m nchekwube, egwu agaghị atụ m;

N’ihina Yahweh Chincke bụ ike m na ukwe m,

ọ bụ onye nzọpụta m.

Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmị nke nzọpụta. Azịza

2. Nyenụ Chineke ekele kpọkuonụ aha ya,

Meenụ ka a mata aka ọrụ ya n’ebe mba niile nọ.

Kwupụtanụ na aha ya dị elu. Azịza

3. Bụọrọnụ Yahweh abụ ọma, n’ihina ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube;

meenụ ka a nụ ya n’ụwa niile.

Tisienụ mkpu ike kweenụ ukwe ọñụ ụnụ ndị bi na Zayọn,

N’ihina onye nọ n’etiti ụnụ

bụ nnukwu onye dị nsọ nke Izrel. Azịza

MBEKU – Ps 25:4,5

Alleluia, Alleluia:

Mee ka m mata ụzọ gị, O Onyenweanyị, ma dube m n’ụzọ eziokwu gị.

Alleluia

OZIỌMA – 19:3-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ụfọdụ ndị Farisii bịara ịnwale Jesu site n’ịjụ ya sị, “O ziri ezi n’iwu mmadụ ịgba nwunye ya alụkwaghị m n’ihi ihe ọbụla?”

Jesu zara ha sị, Ọ bụ na ụnụ agụtabeghị na site na mbido, onye kere ha kere ha nwoke na nwaanyị, wee kwuo sị, “N’ihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya rapara n’ahụ nwunye ya.

Ha abụọ abụrụ otu ahụ. Ha abụghịkwa mmadụ abụọ kama ha bụzi otu ahụ. Ya bụ, ihe Chineke jikọrọ ọñụ mmadụ e kewala ya.”

Ndị Farisii ahụ wee jụọ ya sị, “Ọ bụ gịnị meziri Mosis ji nye iwu ka nwoke nye nwunye ya akwụkwọ alụkwaghị m ma chụpụ ya?”

Jesu zara ha sị, “Ọ bụ n’ihi mkpọchi obi ụnụ ka Mosis jiri hapụ ụnụ ka ụnụ gbaa nwunye ụnụ alụkwaghị m, ma ọ dịghị etu a site na mbido.

Ana m agwa ụnụ, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, na-abụghị n’ihi ịgba akwụna, lụrụ nwunye ọzọ, na-akwa iko.

Ndị na-eso ụzọ ya wee sị ya, “Ọ bụrụ na ọ dị otu a n’etiti di na nwunye, ọlụlụ di na nwunye abaghị uru.” Jesu sịrị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile pụrụ ị nara nkuzi nke a ma ọ bụghị naanị ndị e mere ka ha nara ya.

N’ihina o nwere ndị a mụrụ onozi site n’afọ nne ha, o nwekwara ndị mmadụ ibe ha mere ka ha bụrụ ndị onozi, bịa nwekwaa ndị mere onwe ha onozi n’ihi alaeze nke eluigwe.” Onye nwere ike ị nabata nke a, ya nara ya.

Igbo Mass Readings for August 17 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for August 16 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 11, 2022