Igbo Mass Readings for June 20 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 20 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:18, 21-30

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl Degaara ndị Kọrịnt

Ebe ọtụtụ mmadụ ji ihe nke ụwa a anya isi, mụ onwe m ga-anyakwa isi dịka ha. Ọ na-eme m ihere ikwu na anyị enweghị ike ime ihe dị otu a. Ana m ekwu dịka onye enweghị uche.

Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi n’ihe ọbụla, mụ onwe m ga-anyakwa isi karịa. Ha bụ ndị Hibru? Mụ onwe m bụkwa. Ha bụ ndị Izrel?

Mụ onwe m bụkwa. Ha bụ ụmụ Abraham? Mụ onwe m bụkwa. Ha bụ ndị na-ejere Kristi ozi? Mụ onwe m na-ejekwara Kristi ozi karịa ha. Ana m ekwu dịka onyeisi adịghị mma.

Adọgbuola m onwe m n’ọrụ karịa ha. Atụọla m mkpọrọ ọtụtụ mgbe karịa ha, e tiela m ihe ọtụtụ mgbe karịa ha, nke na oge ụfọdụ abịaruru m n’ọnụ ọnwụ.

Ugboro ise ka ndị Juu pịara m ọnụ ụtalị iri anọ e wepụrụ otu. Ugboro atọ ka a pịara m ụtalị igwe; a tụrụ m okwute otu ugboro, ugboro atọ ka ụgbọ m nọ n’ime ya kpuru.

Otu ụbọchị a nọrọ m n’ụgbọ mmiri, mmiri na-ebugharị m ehihie na abalị. N’ụzọ ije m, ọtụtụ mgbe a nọ m n’ihe ize ndụ site n’aka ndị ohi, na site n’aka ndị Juu ibe m, na site n’aka ndị mba ọzọ, na site n’aka ndị nọ n’ime oke obodo.

Ihe ize ndụ chere m n’ime ịkpa, n’elu oke osimiri, na n’etiti ụmụnna m ndị bụ ndị enyi ụgha. Ọtụtụ mgbe ka m nọ n’ịdọgbu onwe m n’ọrụ na n’ịhụjụ anya.

Ọtụtụ abalị, adịghị m arahụ ụra. Kwa mgbe ka m nọ n’oke agụụ na n’oke akpịrị ịkpọ nkụ, na-ejegharị n’enweghị nri, nọrọ n’oke oyi ọtụtụ, n’enweghị ihe mgbochi oyi.

Ọ bụghị naanị ihe ndị na-anyịgbu m, kama kwa ụbọchị ka m nọ n’ichegbu onwe m banyere nzukọ niile nke Kristi. Ọ dị onye adịghị ike ma m eburughị ahụ mgbu ya ka ọ bụrụ nke m?

Ọ dị onye ọbụla n’etiti ụmụnna dabara na mmehie, ma m erughị ụjụ n’ihi ya? Ọ bụrụ na aghaghị m ịnya isi, aga m anyaisi n’ihe ndị na-egosi adịghị ike m.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 34:1-2, 3-4,5-6

Azịza: Onyenweanyị na-azọpụta ndị eziomume na nsogbu ha niile.

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile,

Otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ mmgbe ọbụla.

Mkpụrụobi m na-egori n’Onyenweanyị.

ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa.

Azịza: Onyenweanyị na-azọpụta ndị eziomume na nsogbu ha niile.

2. Soronụ m kwupụta ịdịukwu nke Onyenweanyị,

soronụ m too aha ya.

Akpọkuru m Onyenweanyị, Ọ za m,

Ọ zọpụtara m n’egwu niile na-atụ m.

Azịza: Onyenweanyị na-azọpụta ndị eziomume na nsogbu ha niile.

3. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke amụke,

ihere anaghị eme ya ma ọlị.

Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye,

Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile.

Azịza: Onyenweanyị na-azọpụta ndị eziomume na nsogbu ha niile.

MBEKU – Ps. 119:135

Alleluia, Alleluịa:

Mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị, ma kuziere m ime uche gị.

Alleluịa

OZIỌMA – 6:19-23

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ akpakọrọla onwe ụnụ akụ n’elu ụwa, ebe ọ ga-agba nchara mọbụ akịka ataa ya, ebe ndị ohi na-etiwa ma zuo ihe niile.

Kama kwadoronụ onwe ụnụ akụ n’eluigwe, ebe ọ na agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị ata ya, ebe ndị ohi na-agaghị etiwa ma zuo. N’ihina ebe akụ gị dị, ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.

Anya bụ mmụọkụ nke ahụ”. Ya bụ, ọ bụrụ na anya gị zuru oke, ahụ gị niile ga-ejupụta n’ihe. Ma ọ bụrụ na anya gị dị njọ, ahụ gị niile ga ejupụta n’ọchịchịrị, lee ka ọchịchịrị ahụ si buo oke ibu!

Igbo Mass Readings for June 21 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 20 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.