Igbo Mass Readings for June 13 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 13 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:7-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl Degaara ndị Kọrịnt

Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke a dị oke ọnụahịa dịka ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si n’aka Chineke ọ bụghị n’aka anyị.

A na akpagbu anyị n’ụzọ ọbụla ma anyị adịghị anwụru ala, mgbe ụfọdụ anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba; Ọtụtụ ndịiro na esogbu anyị mana ndị enyi adịghị akọ anyị; ha na-etida anyị n’ala, mana anyị adịghị ala n’iyi.

Anyị na-ebugharị n’ahụ anyị mgbe ọbụla ọnwụ Jesu, ka ndụ nke Jesu wee pụta ihe n’ahụ anyị. Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ n’ọnụ ọnwụ n’ihi Jesu, ka ndụ Jesu wee pụta ihe n’ahụ anyị pụrụ ịnwu anwụ.

Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsi ọrụ ike n’ime anyị, mana ndụ na-arụ ọrụ n’ime ụnụ. Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ dịka onye ahụ dere sị, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo”.

Anyị onwe anyị kwere. Nke a mere anyị ji ekwu, ebe anyị matara na onye ahụ kulitere Dinwenụ anyị Jesu Kristi ga-kulitekwa anyị na Jesu ma kpọbatakwa anyị na ụnụ n’ihu ya.

Ihe ndị a niile bụ maka ihi ụnụ ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otito nke Chineke.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 116:10-11,15-16,17-18

Azịza: Onyenweanyị, Aga m achụrụ gị aja ekele.

1. Enwere m okwukwe, ọ bụladị mgbe m sị,

“na e gwepịala m kpamkpam”.

N’oke ụjọ m, ekwuru m

na o nweghị onye ọbụla kwesịrị ịtụkwasịobi. Azịza

2. Ọnwụ onye eziomume dị oke ọnụ,

n’ebe Onyenweanyị nọ

Onyenweanyị abụ m nwodibo gị,

nwa nwaanyị ezigbo omume,

ị tọpụla m n’agbụ. Azịza

3. Aga m achụrụ gị aja ekele

wee kpọkue aha nke Onyenweanyị.

Aga m emejupụta nkwa m kwere Onyenweanyị,

n’ihu ndị nke ya niile. Azịza.

MBEKU – Ps. 25:4,5

Alleluia, Alleluịa:

Kuziere m ụzọ gị, O Onyenweanyị, dube m n’ụzọ eziokwu gị.

Alleluia.                      

OZIỌMA – 5:27-32

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ anụla na e kwuru sị, ‘Akwala iko, ma ana m agwa ụnụ: Onye ọbụla lere nwaanyị anya agụụ nke ịkwa iko, akwasala ya rịị iko n’obi ya.

Ya bụ, ọbụrụ na anya aka nri gị ga akpatara gị ime njọ, ghụpụ ya tụfuo! Ọ kara gị mma ịtụfu otu akụkụ ahụ gị, karịa ime ka ahụ gị niile daba n’ọkụmmụọ.

Ọ bụrụkwa na aka nri gị ga-akpatara gị ime njọ, gbupụ ya tụfuo! Ọ ga-akara gị mma ịtụfu otu akụkụ ahụ gị, karịa ime ka ahụ gị niile daba n’ọkụmmụọ.

“E kwukwara sị, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ya nye ya asambodo na-egosi nke a’. Ma ana m agwa ụnụ, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma ọ bụghị n’ihina ọ kwara iko, na-eme nwaanyị ahụ ka ọ bụrụ onye na-akwa iko.

N’otu aka ahụ, onye ọbụla lụrụ nwaanyị a gbara alụkwaghị m na-akwa iko.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for June 13 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 9, 2022