Igbo Mass Readings for June 14 2024, Fraịde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 14 2024, Fraịde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:9, 11-16

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze

Ka Elijah ruru (Họreb), ọ banyere n’otu ọgba nọrọ ebe ahụ. Mgbe ahụ ka Yahweh bịakwutere ya jụọ ya sị, “Elaịja gịnị ka ị na-eme ebe a?” Yahweh gwara ya sị, “Gaa guzoro n’elu ugwu ahụ n’ihu Yahweh.”

Mgbe ahụ Yahweh abịa gafee. Oke ikuku agbawaa ugwu ahụ tiwasịa okwute dị na ya n’ibe n’ibe. Ma Yahweh anọghị n’oke ikuku ahụ. Ka oke ikuku kuchara, e nwere ala ọmajijiji, ma Yahweh anọghị n’ime ala ọmajijiji ahụ.

Ka nke a kwụsịrị, ọkụ gbawara. Ma Yahweh anọghị n’ọkụ ahụ. Ka ọkụ ahụ gafere, olu ntakịrị dị nwayọọ bịara. Oge Elaịja nụrụ nke a o ji akwa mkpuchi kpuchie ihu ya, gaa guzoro n’ọnụụzọ ọgba ahụ.

Mgbe ahụ ka olu bịara sị ya, “Gịnị ka ị na-eme n’ebe a Elaịja?” Ọ zaa sị, “Ejupụtara m n’oke mmasị na Yahweh Chineke nke igwe ndịagha, ma ndị Izrel echefuola ọgbụgbandụ gị, kwadachaa ekwuaja gị, bịakwa jiri mmaagha gbuo ndị amụma gị; ọ bụ naanị m fọrọ, ma ugbu a ha chọrọ igbu m.”

Yahweh gwara ya sị, Lawa si n’ụzọ ịkpa Damaskọs gaa tee Hazel ude, chie ya eze Siria. Ị ga-etekwa Jehu nwa Nimishi ude dịka eze Izrel, bịakwa tee Elaịsha nwa Shafat nke Abalmehola ude dịka onye amụma ga-anọchi anya gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 27: 7-8, 8-9, 13-14

Azịza: Onyenweanyị ana m achọ ihu gị

1. Onyenweanyị nụrụ mkpu akwa m!

meere m ebere! Zaa m!

Mkpụrụobi m na-ekwu maka gị sị,

Chọba ihu nke Onyenweanyị. Azịza

2. Onyenweanyị, ana m achọ ihu gị,

Ezonarịla m ihu gị,

ejila iwe chụpụ nwodibo gị.

Ọ bụ gị bụ onye enyemaka m.

Ahapụla m; agbahapụla m; Azịza

3. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke

n’ala ndị dị ndụ.

Chekwube na Dinwenụ. Obi sie gị ike

tụkwasị ya obi chekwube na ya. Azịza

MBEKU – Ps. 25:4,5

Alleluia, Alleluịa:

Kuziere m ụzọ gị, O Onyenweanyị, dube m n’ụzọ eziokwu gị.

Alleluia.                      

OZIỌMA – 5:27-32

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ anụla na e kwuru sị, ‘Akwala iko, ma ana m agwa ụnụ: Onye ọbụla lere nwaanyị anya agụụ nke ịkwa iko, akwasala ya rịị iko n’obi ya.

Ya bụ, ọbụrụ na anya aka nri gị ga akpatara gị ime njọ, ghụpụ ya tụfuo! Ọ kara gị mma ịtụfu otu akụkụ ahụ gị, karịa ime ka ahụ gị niile daba n’ọkụmmụọ. Ọ bụrụkwa na aka nri gị ga-akpatara gị ime njọ, gbupụ ya tụfuo!

Ọ ga-akara gị mma ịtụfu otu akụkụ ahụ gị, karịa ime ka ahụ gị niile daba n’ọkụmmụọ. “E kwukwara sị, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ya nye ya asambodo na-egosi nke a’.

Ma ana m agwa ụnụ, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma ọ bụghị n’ihina ọ kwara iko, na-eme nwaanyị ahụ ka ọ bụrụ onye na-akwa iko.

N’otu aka ahụ, onye ọbụla lụrụ nwaanyị a gbara alụkwaghị m na-akwa iko.

Igbo Mass Readings for June 15 2024, Satọde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 14 2024, Fraịde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 9, 2022