Igbo Mass Readings for May 12 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 12 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:22-31

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Nke a masịrị ndịozi na ndị okenye na nzukọ Kristi niile nọ na Jerusalem. Ha kpebiri ịhọpụta mmadụ ụfọdụ n’etiti ha, ziga ha na Pọl na Banabas n’Antiọk.

Ha họpụtara Judas onye a na- akpọkwa Basabas na Saịlas, bụ ndị a na-asọpụrụ n’etiti ụmụnna. Ha nyekwara ha akwụkwọozi dị otu a ka ha ziga, sị: “Anyị bụ ndịozi na ndị okenye, na ụmụnna ụnụ.

Anyị na-ewetara ụnụ ozi ekele, ụmụnna anyị ndị bi n’Antiọk na Siria na Silisia, ụnụ niile bụ ndị a mụrụ na mba ọzọ, ndeewonụ. Anyị anụla na ụfọdụ ndị otu anyị siri ebe a bịakwute ụnụ, na-esogbu ụnụ were okwu mee ka obi lọọ ụnụ mmiri.

Ma ọdịghị mgbe ọbụla ha natara ike n’aka anyị ime otu a. N’ihi nke a anyị ezukọọla, were otu obi kpebie izitere ụnụ ndịozi ụfọdụ ha na ndị anyị hụrụ n’anya bụ Banabas na Pọl, ndị werela ndụ ha tinye n’ihi aha na ozi nke Onyenweanyị Jesu Kristi.

Nke a mere, anyị ji ezite Judas na Saịlas, ndị ga-akọwara ụnụ ihu n’ihu, ihe ndị a anyị dere n’Akwụkwọozi. N’ihina ọ dị anyị na Mmụọ Nsọ mma, ka a ghara ibo ụnụ ibu arọ karịa naanị ihe ndị a dị mkpa.”

Ụnụ erila ihe ọbụla a chụrụ n’aja nye arụsị, ụnụ erila ọbara; ụnụ erila anụ anyagburu anyagbu, ụnụ akwala iko, ụnụ jide onwe ụnụ ghara ime ihe ndị a, ụnụ ga-eme nke ọma, nọdụnụ mma.”

Mgbe e zipụrụ ndịozi ahụ, ha gara Antiọk. Ka ha ruru, ha kpọrọ nzukọ nke ndị kwere ekwe, nye ha akwụkwọozi ahụ. Mgbe ọgbakọ ahụ gụchara akwụkwọozi ahụ, ọñụ juru ha obi, n’ihi ozi ịgba ume ha natara.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 57: 8-9, 10-12.

Azịza: Aga m ekele gị n’etiti ndị mmadụ niile, O Onyenweanyị.

1. Obi m dị nkwadebe, O Chineke,

obi m dị nkwadebe.

A ga-ekwere gị ukwe, kụọkwara gị egwu.

Obi m teta n’ụra,

tie ụbọ akwara, na opi,

aga m akpọte chi ọbụbọ! Azịza

2. Aga m ekele gị n’etiti ndị mmadụ,

Onyenweanyị, aga m akụrụ gị egwu n’etiti mba niile,

ịhụnaanya gị dị elu dịka eluigwe,

gosipụta ike gị n’eluigwe, Chineke.

Ka ebube gị dịrị n’elu ụwa. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Jesu Kristi, ị bụ onye akaebe dị ntụkwasịobi, onye mbụ si na ndị nwụrụ anwụ pụta; ị hụrụ anyị n’anya, were ọbara gị sachapụ njọ anyị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 15:12-17.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Nke a bụ iwu m nyere ụnụ: ka ụnụ hụrịta onwe ụnụ n’anya, dịka m si hụ ụnụ n’anya. Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnaanya kariri nke a: Na mmadụ ga-atụfu ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.

Ụnụ bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na ụnụ edobe iwu m nyere ụnụ. Anaghị m akpọkwa ụnụ ndị odibo ọzọ, n’ihi na odibo anaghị ama ihe nna ya ukwu na-eme.

Kama ana m akpọzi ụnụ ndị enyi, n’ihina agwala m ụnụ ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m. Ọ bụghị ụnụ họọrọ m, kama a họọrọ m ụnụ; wepụtakwa ụnụ iche ka ụnụ gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-anọgide.

Nke a ga-eme ka Nna m nye ụnụ ihe ọbụla ụnụ rịọrọ ya n’aha m. Ya bụ, nke a ka m na-enye ụnụ n’iwu. Hụrịtanụ onwe ụnụ n’anya.

Igbo Mass readings for May 13 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for May 12 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Last Update: April 15, 2022