Igbo Mass Readings for March 31 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 31 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 20:10-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Jeremaya

Ana m anụ ntamu, nsogbu nọgidere m n’akụkụ niile. Ka anyị jụnụ ya, ka anyị jụ ya bụ ihe ndị enyi m niile na-ekwu, ndị nke na-achọ nsogbu m na ọdịda m.

“E nwere ike anyị aghọgbuo ya, merie ya, ma megwarakwa ya.” Ma Chineke nọnyere m mgbe niile dịka n’agha, ya mere, ndịiro m ga-adasị, ha agaghị emerikwa m ọzọ, ihere ga emegbu ha, ma ha agaghị emerikwa.

A gaghị echefukwa ihere ha. O Yahweh nke igwe ndị agha, onye na-ekpe ikpe nkwụmọtọ, onye na-ahụzu obi na echiche mmadụ mee ka m hụ ọbọ ị ga-abọtara m n’isi ha, maka na ọ bụ n’aka gị ka m tinyere ihe niile.

Kweere Yahweh ukwe, nye ya otito! Maka na ọ zọpụtala ndụ nke onye ahụ nọ na mkpa n’aka ndị omenjọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 18:2-3, 3-4, 5-6, 7.

Azịza: Akpọkuru m Osebụrụwa mgbe m nọ na nsogbu, mkpu akwa m wee ruo ya ntị.

1. Ahụrụ m gị n’anya Osebụrụwa, gị bụ ike m.

Osebụrụwa bụ nkume m,

na ebe nkwụdosike m, onye ogbugbo m. Azịza

2. Onye nzọpụta m bụ Chineke m,

Onye ogbugbo m,

Ebe nchedo m na ebe mgbaba m,

Osebụrụwa kwesịrị inye otito,

N’ihi na-akpọrọ m ya,

Ọ zọpụtara m n’aka ndịiro m. Azịza

3. Eriri nke ọnwụ agbaala m okirikiri,

Ajọomume ndị mmadụ na-akpagbu m,

Eriri nke ala mmụọ ekedosielam ike,

Ejila ọnwụ kweere m ọnya. Azịza

4. Akpọkuru m Osebụrụwa mgbe m nọ nsogbu,

bekuere Chineke m akwa enyemaka,

O si n’ụlọnsọ ya wee nụ olu m,

Mkpu akwa m wee ruo ya ntị. Azịza

MBEKU

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Mkpụrụ ahụ bụ okwu nke Yahweh, Kristi bụ onye na-agha mkpụrụ, onye ọbụla bịakwutere ya ga-adị ndụ ebeebe.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 10:31-42.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Mgbe ndị Juu tụtụkwaara okwute ọzọ ka ha tụọ ya, Jesu gwara ha sị, “Ezila m ụnụ ọtụtụ ezi ọrụ nke sitere n’aka Nna m. Olee nke ọ bụ n’ime ndị a ka ụnụ ga-eji tụọ m okwute?”

Ndị Juu azaa ya sị, “Anyị anaghị atụ gị okwute n’ihi ezi ọrụ gị kama n’ihi nkwulu nke i na-ekwulu Chukwu; Ị bụ naanị mmadụ nkịtị, ma ị na-eme onwe gị Chineke!” Jesu zara ha sị, “Ọ bụ na-edeghị ya n’iwu ụnụ sị, ‘Ekwuru m, ụnụ bụ chi.’

Anyị makwa na ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ enweghị mgbanwe. Ndị Chineke zitere okwu ya ka ọkpọrọ ndị bụ chi. Ụnụ na-asị na onye Chineke doro nsọ wee zite n’ime ụwa, na-ekwulu Chineke n’ihina ọ sị, ‘Abụ m nwa Chineke’ Ọ bụrụ na m anaghị arụ ọrụ nna m, ụnụ ekwela na m.

Ma ọ bụrụ na m, na- arụ ha, ọ bụladị na a sị na ụnụ ekweghị na m, kwerenụ n’ọrụ ndị a, ka ụnụ wee mata ma ghọta nke ọma na Nna m bi n’ime m, m biri n’ime Nna.

Ha chọkwara ijide ya ọzọ, ma o siri n’aka ha mịpụ. Jesu laghachiri azụ ọzọ, n’ofe osimiri Jọdan n’ebe Jọn na-eme mmirichukwu na mbụ, Ọ nọgidere ebe ahụ.

Ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya, na-asị, “Jọn arụghị ọrụ ebube ma ihe niile o kwuru banyere nwoke a bụ eziokwu. Ọtụtụ ndị nọ ebe ahụ kwenyere na ya.

Igbo Mass readings for April 1 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for March 31 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2023 (Kindle Version)

X
Scroll to Top
error: Alert: Content is protected !!

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.