Igbo Mass Readings for May 10 2024, Fraịde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 10 2024, Fraịde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:9-18

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Mgbe Pọl nọ na Kọrịnt, n’otu abalị, Chineke gwara ya n’ọhụ sị: “Ụjọ atụla gị; kama na-ekwupụta m! Agbala nkịtị; n’ihi na a nọnyere m gị, mmadụ agaghị emeta gị ihe ọbụla.

Maka na enwere m ọtụtụ mmadụ n’obodo a.” Pọl nọrọ na Kọrịnt otu afọ na ọnwa isii, na-akụziri ndị mmadụ okwu Chineke. Ma n’oge Galio bụ gọvanọ na-achị ndị Rom ala Akaya, ndị Juu zukọrọ, jide Pọl kpụga ya n’ihu ọka ikpe, na-ekwu sị: “nwoke a na-amanye ndị mmadụ, ka ha na-ekpere Chineke n’ụzọ megidere iwu.”

Mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu Galio gwara ndị Juu sị: “Ndị Juu, agaara m enwe ndidi gee ụnụ ntị ma ọ bụrụ na okwu a bụ ihe gbasara mmejọ mmadụ mejọrọ ibe ya, ma ọ bụ arụ mmadụ mere megide obodo.

Ma ebe ọ bụ esemokwu gbasara okwu e kwuru ekwu, n’aha dị iche-iche ndị mmadụ na-ekwupụta, n’iwu ụnụ, dozienụ nke ahụ n’onwe ụnụ. Ajụrụ m ajụ ikpe ikpe dị otu a!”

Ọ chụpụrụ ha n’ụlọ ikpe. Ha niile jidere Sostenes, bụ onyeisi ụlọ nzukọ ha were iwe tie ya ihe n’ihu ụlọ ikpe ahụ. Ma Galio mere anya ka ọ hụghị nke a. Pọl nọnyere ụmụnna n’ime Kristi ọtụtụ ụbọchị na Kọrịnt.

O mechara hapụ ha, banye n’ụgbọ mmiri ruo Siria, ya na Prisila na Akwila. Ọ kpachasịrị isi ya na Kenkrei, n’ihi na o kwere Chineke nkwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 47: 2-3, 4-5, 6-7.

Azịza: Chineke bụ eze nke ụwa niile.

1. Ndị mmadụ niile kụọnụ aka ụnụ,

were mkpu ọñụ tikuo Chineke.

N’ihi na Onyenweanyị onye kacha dị elu ka anyị ga-atụrụ egwu,

ọ bụ nnukwu eze nke na-achị ụwa niile. Azịza

2. Ọ na-edobe mmadụ n’okpuru anyị,

meekwa ka mba niile nọrọ n’okpuru ụkwụ anyị.

Ọ bụ ya na-enye anyị oke ruuru anyị,

nke O nyere Jekọb n’ihi ịhụnaanya O nwere n’ebe ọ nọ. Azịza

3. Chineke ji mkpu ọñụ agbago,

Onyenweanyị ji olu opiike arịgo,

kweerenụ Chineke anyị ukwe otito,

kweerenụ ya ukwe,

kweerenụ eze anyị ukwe otito,

kweerenụ ya ukwe. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Agaghị m ahapụ ụnụ ka ndị na-enweghị nne na nna, kama aga m abịakwute ụnụ. Obi ụnụ ga-ejupụta n’añụrị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 16: 20-23.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: N’eziokwu agwa m ụnụ, ụnụ ga-ebe akwa, nwekwaa mwute ma ụwa ga-enwe añụrị. Ụnụ ga-eru ụjụ, ma nke a ga-emechaa bụụrụ ụnụ ihe añụrị.

Mgbe ime na-eme nwaanyị ọ na-anọ na mwute, n’ihi n’oge ihe ụfụ nke ime omume abịala. Ma mgbe ọ mụpụtachara nwa, ọ naghị echetakwa ahụhụ dị n’ịmụ nwa, n’ihi añụrị na-amụtara nwa n’elu ụwa.

Ọ na-ewute ụnụ ugbu a, ma aga m ahụ ụnụ ọzọ, Obi ụnụ ga-ejupụta n’añụrị. O nweghịkwa onye ọbụla ga-anapụ ụnụ ọñụ ụnụ. N’ụbọchị ahụ ụnụ agaghị arịọ m ihe ọbụla. Ma ana m agwa ụnụ eziokwu, ọ bụrụ na ụnụ arịọ Nna m ihe ọbụla n’aha m, ọ ga-enye ya ụnụ.

Igbo Mass readings for May 11 2024, Satọde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for May 10 2024, Fraịde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Last Update: April 15, 2022