Igbo Mass Readings for February 17 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 17 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis

Ụwa niile nwere otu asụsụ na mkpụrụ okwu olemaole. Ugbu a, ka ndị mmadu nọ na-abawanye, ha ghasara ruo n’akụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ha chọtara ala dị larịị n’ala Shina biri ebe ahụ.

Ha gwara onwe ha, “Ngwanụ ka anyị kpụọ aja bịa ñaa ha n’elu ọkụ”. Ha ewere aja akpụrụakpụ n’ọnọdị nkume, ma werekwa mgba n’ọnọdị ụrọ.

Ha gwakwara onwe ha sị, “Bịanụ ka anyị wuoro onwe anyị otu obodo mepere emepe nakwa otu ụlọ elu nke ofe isi ya ga-erute Eluigwe. Ka anyị bụrụ ndị a ma ama, ka anyị ghara ịgbasa n’akụkụ ụwa niile”.

N’oge ahụ Yahweh alọdata ịhụ obodo ahụ mepere emepe na ụlọelu nke ndị mmadụ ahụ wuru. Yahweh Chineke kwuru sị, “Lee, ha bụ otu mba, nwekwaa otu asụsụ; nke a bụ naanị mbido ihe ha nwere ike ime ugbu a, o nweghị ihe ha ga-achọ ime ga-akari ha.

Bịanụ ka anyị gbadaa gaa gbarụọ asụsụ ha ebe ahụ, otu ha na-agaghị aghọta asụsụ onwe ha”. Site n’ebe ahụ ka Yahweh mere ka ha gbasaa n’elu ụwa niile; ha kwụsịrị ịrụ obodo ahụ.

Nke a mere e ji kpọọ ya Babel, ebe ọ bụ n’ebe ahụ ka Yahweh megharịrị ha anya n’asụsụ ha, nyekwa ha asụsụ dị icheiche, ọ bụkwa site n’ebe ahụ ka ọ gbasachara ha n’elu ụwa niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.:33:1011, 12-13, 14-15

Azịza: Añụrị na ngọzi na-adịrị mba Chineke bụ Chukwu ha, ndị nke ọ họọrọ dịka ndị nke ya.

1. Onyenweanyị na-emebi atụmaatụ mba niile,

Ọ na-eme ka echiche ha laa n’iyi.

Mana atụmaatụ Chineke ga-adị ọkpụ

Echiche obi ya niile ga-adị ebeebe. Azịza

2. Añụrị na ngọzi na-adịrị mba Chineke bụ Chukwu ha,

ndị nke ọ họọrọ dịka ndị nke ya

Chineke si n’eluigwe eledata anya

Ọ na-ahụ ụmụmmadụ niile. Azịza

3. si n’ebe Ọ nọ na-ele anya,

na-ele ndị niile bi n’ụwa anya.

Onye nke mere obi mmadụ niile,

na-agbakọkwa ihe niile ha na-eme. Azịza

MBEKU – Luk 8:15

Alleluia, Alleluia:

Añụrị ga adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesi ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 8:34-9:1

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu kpọkọtara igwe mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ iso m, ya jụ onwe ya, buru obe ya sobe m n’azụ.

N’ihina onye ọbụla nke na-achọ ichekwaba ndụ ya ga-atufu ya; ma onye ọbụla nke ga-atufu ndụ ya n’ihi m na n’ihi oziọma, ga-azọpụta ya.

Uru gịnị ka ọ ga-abaara mmadụ ma o ritechaa akụnụụba niile nke ụwa a, ma tụfuo ndụ ya? Gịnị ka mmadụ ga-eji kwụghachi ụgwọ ndụ ya?

N’ihina onye ọbụla mụ onwe m na okwu m na-eme ihere n’ọgbọ nke a, na-eme ihe ọjọọ na-akwakwa iko, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke mmadụ mgbe ọ ga-abịa n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọọma ya dị nsọ”

Ọ sịrị ha, “N’ịgwa ụnụ eziokwu, o nwere ụfọdụ n’ime ndị guzoro n’ebe a na-agaghị anwụ ọnwụ ruo mgbe ha ga-ahụ ọchịchị nke Chineke ka ọ bịara n’ike”.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for February 17 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 8, 2022