Igbo Mass Readings for February 18 2028, Fraịde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 18 2028, Fraịde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:14-24, 26
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis
Ụmụnna m, Uru gịnị ka ọ baara mmadụ ịsị: Enwere m okwukwe! Ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe n’ọrụ ya? Okwukwe dị otu a ọ pụrụ ịzọpụta ya?
Mba! Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke mọbụ nwanne anyị nwaanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya n’ụbọchị, otu onye n’ime ụnụ asị ya: Gaa nke ọma!
Kpuchikwaa onwe gị nke ọma! Rijukwaa afọ! n’enyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara? N’otu aka ahụ okwukwe na-enweghị ezi ọrụ nwụrụ anwụ n’onwe ya.
E leghị anya otu onye ga-asị: Gị onwe gị nwere okwukwe, mụ onwe m nwere ọrụ. Ọsịsa m bụ nke a: Gosị m ihe bụ okwukwe gị ma e wepụ ọrụ gị?
Aga m egosị gị okwukwe m site n’ọrụ m! I kwere na Chukwu bụ naanị otu? I mere nke ọma! Ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kwere, wee kụja, makwaa jijiji n’ihi egwu.
Gị onye nzuzu! Ị na-eche ka mmadụ gwa gị agwa n’okwukwe na-enweghị ezi ọrụ bụ ihe abaghị uru ọbụla? Ọ bụ na nna anyị Abraham abụghị onye a gụrụ n’onye eziomume site n’ọrụ ya mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja n’ekwu nchụja?
Ụnụ ahụghị na okwukwe ya na ọrụ ya soro rụkọọ ọrụ n’otu? E sitekwara n’ọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo oke. N’ụzọ dị otu a e mezuola ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ sị Abraham kwere na Chineke.
Chineke gụrụ ya onye eziomume n’ihi okwukwe ya. N’ihi nke a a kpọrọ ya enyi Chineke. Nke a ga-egosị ụnụ na Chineke na-esite n’ọrụ mmadụ gụọ ya onye eziomume ọ bụghị site naanị n’okwukwe ya.
Ya bụ otu ahụ si bụrụ ihe nwụrụ anwụ ma ọ bụrụ na mmụọ adịghị ya, etu ahụ ka okwukwe si bụrụ ihe nwụrụ anwụ ma ọ bụrụ na ọrụ adịghị ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 112:1-2, 3-4, 5-6
Azịza: Añụrị na-adịrị ndị ji ọñụ na-edebe iwu nke Onyenweanyị
1. Alleluia! Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu,
onye ji ọñụ na-edebe iwu ya!
Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa,
agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi. Azịza
2. Ezinụụlọ ya ga-enweta akụnụụba,
eziomume ya agaghị enwe mgbanwe.
N’ihina onye ezigbo omume ga-achawapụta dịka ihe n’etiti ọchịchịrị
ọ dị ebere, n’ịhụnaanya na-akwụba aka ọtọ. Azịza
3. Ya bụ ezigbo mmadụ anaghị ana ọmụrụnwa ma o binye ego,
ọ bụ onye eziokwu n’ihe niile ọ na-eme.
Ebe eziomume chedoro ya, ọ na-enwe ịkwụdosike,
ọ na-ahapụ ncheta ga-adị ebeebe n’azụ ya. Azịza
MBEKU – Luk 8:15
Alleluia, Alleluia:
Añụrị ga adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesi ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 8:34-9:1
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu kpọkọtara igwe mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ iso m, ya jụ onwe ya, buru obe ya sobe m n’azụ.
N’ihina onye ọbụla nke na-achọ ichekwaba ndụ ya ga-atufu ya; ma onye ọbụla nke ga-atufu ndụ ya n’ihi m na n’ihi oziọma, ga-azọpụta ya. Uru gịnị ka ọ ga-abaara mmadụ ma o ritechaa akụnụụba niile nke ụwa a, ma tụfuo ndụ ya?
Gịnị ka mmadụ ga-eji kwụghachi ụgwọ ndụ ya? N’ihina onye ọbụla mụ onwe m na okwu m na-eme ihere n’ọgbọ nke a, na-eme ihe ọjọọ na-akwakwa iko, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke mmadụ mgbe ọ ga-abịa n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọọma ya dị nsọ”
Ọ sịrị ha, “N’ịgwa ụnụ eziokwu, o nwere ụfọdụ n’ime ndị guzoro n’ebe a na-agaghị anwụ ọnwụ ruo mgbe ha ga-ahụ ọchịchị nke Chineke ka ọ bịara n’ike”.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.