Igbo Mass Readings for June 5 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 5 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:10-17
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Timoti
Ugbu a, ị chọpụtala nkuzi m, omume m, ebumnuuche m banyere ndụ nke a, ndidi m, ịhụnaanya m na nkwụdosịike m.
Ị matakwara mkpagbu m na ahụhụ m niile, na ihe niile dakwasara m n’Antiọk, Aịkọnium na Listra, na mkpagbu niile dịịrị m, ma Onyenweanyị zọpụtara m na ha niile.
N’eziokwu, a ga-akpagbu ndị niile na-achọ ịdị ndụ dị asọ n’ime Jesu Kristi. Ma ndị ajọomume na ndị mpako ga na-aga n’ihu n’ịkwanye njọ na ajọomume ha.
Ha na-eduhie ndịọzọ, ndịọzọ na eduhie ha. Ma gị onwe gị, nọgidesieike n’ihe ị mụtara na ihe i kwenyesiri ike na ya, ebe ị maara onye i si n’aka ya mụta ha.
Ị maara na ọ bụ site n’oge ị bụ nwata ka ihe e dere n’akwụkwọ nsọ doro gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site n’okwukwe i nwere na Jesu Kristi.
Ihe niile e dere n’Akwụkwọ nsọ si na mkpalite nke Chukwu. Ha bakwara uru iji na-akuzi ihe, ịgwa mmadụ mmehie ya, ịgbaziri na inye ọzụzụ na ndụ eziomume.
N’ụzọ dị otu a onye nke Chukwu ga-ezuoke dị nkwadebe maka ezi ọrụ ọbụla.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119: 157, 160, 161, 165, 166, 168
Azịza: Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo.
1. Ha dị ọtụtụ bụ ndị na-emegbu m, na ndị na-ebuso m agha,
mana anaghị m ahapụ iwu gị. Azịza
2. Okwu gị niile bụ eziokwu,
iwu gị niile ziri ezi na-adị ebeebe. Azịza
3. Ọ bụ ezie na ndị ọchịchị na-emegbu m n’enweghị ihe m mere ha.
mana obi m nọsiri ike n’ịtụrụ gị egwu. Azịza
4. Ndị niile hụrụ iwu gị n’anya nwere udo,
o nweghị ihe ga-eme ka ụkwụ kpọọ ha. Azịza
5. Enwere m nchekwube na-nzọpụta gị, O Onyenweanyị,
na-emekwa ihe i inyere n’iwu. Azịza
6. Ana m edobe iwu gị na nkuzi gị niile,
n’ihina ị maara ụzọ m niile. Azịza
MBEKU – Eph 1:17-18
Alleluia, Alleluia:
Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, Nna nke otito, meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 12:35-37
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe Jesu na-akụzi ihe n’ụlọnsọ Chineke, ọ jụrụ sị, “Olee otu ndị odeakwụkwọ ji ekwu na Kristi bụ nwa David?
David n’onwe ya site na mkpalite nke Mmụọ Nsọ kwuru sị, “Onyenweanyị gwara Nna m ukwu, Nọdụ ala n’aka nri m, Ruo mgbe m ga-edote ndịiro gị n’okpuru ụkwụ gị.
David n’onwe ya kpọrọ ya Nna ukwu, olee ka ọ ga-esi bụrụkwa nwa ya? Ya mere oke igwe mmadụ nọ n’ebe ahụ ji ọñụ nụrụ okwu ya.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.