Igbo Mass Readings for January 10 2025, Fraịde na-eso Ụka Epifani
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 10 2025, Fraịde na-eso Ụka Epifani.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:5-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi mbụ nke Jọn
Onye bụ onye na-emeri ụwa ma ọ bụghị onye kwere na Jesu Kristi bụ Nwa Chukwu? Nke a bụ onye sitere na mmiri na ọbara bịa. Ọ bụghị naanị mmiri ka o ji bịa, kama, o ji mmiri na ọbara.
Mmụọ ahụ bụ onye akaebe n’ihina ọbụ eziokwu. Enwere ndị akaebe atọ: Mmụọ, mmiri na ọbara; ha atọ kwekọrịtakwara n’otu. Ọ bụrụ na anyị na-anabata akaebe nke mmadụ, akaebe nke Chineke bụ ezi akaebe karịa.
Akaebe nke Chineke bụkwa nke ọ gbara banyere Nwa ya. Onye kwere na Nwa nke Chineke, nwere akaebe ahụ n’ime ya. Ma onye na-ekwenyeghị n’akaebe ahụ, emeela Chineke onye ụgha, n’ihi na o kwenyeghị n’akaebe Chineke gbara gbasara Nwa ya.
Akaebe ahụ bụ nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighịebi. Ndụ a dị na Nwa ya. Onye nwere Nwa ahụ nwere ndụ. Onye na-enweghị Nwa nke Chukwu, enweghị ndụ. Ana m edere ụnụ ihe ndị a, ụnụ ndị kwere n’aha nwa nke Chukwu, ka ụnụ mara na ụnụ nwere ndụ ebighịebi.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 147:12-13, 14-15, 19-20.
Azịza: Jerusalem too Onyenweanyị.
1. Jerusalem too Onyenweanyi,
Zayọn too Chineke gị,
n’ihina ọ bụ ya mere ọnụụzọ ama gị niile ka ha sie ike,
ọ na-agọzi ụmụ gị niile. Azịza
2. Ọ na-enye gị udo n’oke ala gị niile,
ọ na eji ọka nke kacha mma azụ gị nri.
Ọ na-etiri ụwa iwu,
okwu ya agazuo ụwa niile ọsọọsọ. Azịza
3. Ọ na-ekpughere ụmụ Jekọb okwu ya,
na-egosikwa ụmụ Izrel iwu ya na ikpe ya.
Ọ naghị emere mba ndị ọzọ otu a,
ọ naghị akụziri ha iwu ya. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Jesu na-ekwusakwa oziọma nke alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị mmadụ ọrịa na nrịanrịa ha dị iche-iche.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 5:12-16.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka Jesu nọ n’otu obodo, otu nwoke ekpenta jupụtara ahụ bịakwutere ya; mgbe ọ hụrụ Jesu, ọ dara, kpudo ihu n’ala na-arịọ ya sị, “Dinwenụ ọ bụrụ na ị chọrọ, I nwere ike ime ka m dị ọcha.
Jesu gbatịrị aka ya, metụ ya aka sị, “Achọrọ m; dị ọcha.” Ngwa-ngwa ọrịa ekpenta ya ahụ lara. Jesu nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ọbụla, kama, ọ sịrị ya, “Gaa gosi onye ụkọchukwu onwe gị, tụọkwa mmamma maka ịdị ọcha gị dịka Mosis nyere n’iwu ka ọ bụrụ ihe ga-egosi ndị mmadụ na ahụ adịla gị mma.
Ma akụkọ gbasara Jesu gbasawanyere karịa, oke igwe mmadụ wee gbakọọ ka ha nụrụ okwu ya, nwetakwa ọgwụgwọ ọrịa. Jesu siri ebe ahụ pụọ ga na ọzara ikpe ekpere.
Igbo Mass readings for January 11 2025, Satọde na-eso Ụka Epifani.
Igbo Mass Readings for January 10 2025, Fraịde na-eso Ụka Epifani.