Igbo Mass Readings for February 16 2024, Fraịde na-eso Wenezde Ntụ
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka February 16 2024, Fraịde na-eso Wenezde Ntụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 58:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
Besie akwa ike, ahapụkwala ihe ọbụla, welie olu gị elu dịka opiike gwa ndị nke m mmehie ha, gwakwa ụlọ nke Jekọb njọ ha.
N’agbanyeghị, ha na-achọ m kwa ụbọchị na enwe mmasị n’ịmata ụzọ m, ka a ga-asị na ha bụ mba ndị na-eme ihe ọma, ma ọ bụ ndị na-anaghị agbahapụ iwu nke Chineke ha; ha na-asị m nye ha ikpe nkwụmọtọ, ọ na-amasị ha ịbịakwute Chineke nso.
“Gịnị kpatara anyị jiri buo ọnụ ma ị hụghị ya? Kedụ ihe meree anyị jiri butuo onwe anyị ala, ma ị mara ụma dịka ị maghị maka nke a? Ma lee, n’ụbọchị ibu ọnụ ụnụ, ọ bụ ihe ụtọ nke ụnụ na-achọ, na-emegbu ndị niile na-arụrụ ụnụ ọrụ.
Lee, ụnụ na-ebu ọnụ ma na-aga n’ihu n’esemokwu na ịlụ ọgụ na iji obi ọjọọ na-etigbusi onwe ụnụ. Ụdị ibuọnụ ụnụ n’ụbọchị taa agaghị eme ka a nụ olu ụnụ n’ebe dị elu.
Ọ bụ ụdị ibuọnụ dị otu a na-amasị m; nke bụ ọnụ ụnụ buru ụbọchị mmadụ na-emerụ onwe ya ahụ? Ọ bụ ibudata isi ala dịka ahịhịa puru n’akụkụ mmiri ma ọ bụ I jiri akwa iru ụjụ na iwere ntụ wụọ n’ahụ?
Ụnụ ga-akpọ nke a ibuọnụ n’ụbọchị nke Osebụrụwa họọrọ? Ọ bụ na nke a abụghị ibuọnụ nke na-amasị m: Ị tọhapụ agbụ nke obi ọjọọ, ibutu ndị mmadụ ibu arụ, were hapụ ndị a na-akpagbu akpagbu ka ha nwere onwe ha wee kujisie ịnyagba niile?
Ọ bụghị ime ka ụnụ na ndị agụụ na-agụ kee nri ụnụ, ịkpọbata ndị ogbenye na-enweghị ụlọ n’ime ụlọ ụnụ; were kpuchie onye gbaọtọ akwa mgbe ụnụ hụrụ ya ka ọ ghara ịbụ na ụnụ na-ezo onwe ụnụ n’ebe ụmụnne ụnụ nọ.
Mgbe ahụ ka ihe ụnụ ga-achawapụta dịka ụtụtụ, otu aka ahụ ka ọgwụgwọ ọrịa ụnụ ga-esi abịa ngwa ngwa. Eziomume ụnụ ga-eburu ụnụ ụzọ. Ebube nke Chineke ga-abụ nche azụ ụnụ.
Mgbe ahụ ka ụnụ ga-akpọ Yahweh oku, o wee zaa ụnụ, mgbe ahụ ka ụnụ ga-ebeku ya akwa, o wee zaa ụnụ; Ebe a ka m nọ. Ọ bụrụ na ụnụ ewepụ n’etiti ụnụ mmegbu, ịtụ aka ma ọ bụ ikwu okwu na-agbawa obi.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 51: 3-4, 3-5, 18-19.
Azịza: Ị naghị ajụ obi gbawara agbawa na nke loghara elogha.
1. Meere m ebere O Chineke site n’ịhụnaanya gị,
Site na nnukwu obi ebere gị hichapụ njọ m niile;
Sachapụ mmehie m niile,
wụchapụ m na njọ m. Azịza
2. N’ihi na amarala m mmehie m niile,
njọ m nọ na mmụọ m oge niile.
Ọ bụ sọ gị, naanị gị ka m mere njọ megide,
ihe dị njọ na ihu gị ka m mere. Azịza
3. Ị naghị enwe mmasị ọbụla n’aja,
Aja nsureọkụ anaghị atọ gị ụtọ,
Aja a na-achụrụ Chineke bụ obi gbawara agbawa,
Ị naghị aju obi gbawara agbawa na nke loghara elogha. Azịza
MBEKU – Matiu 4:4
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 9:14-15.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Mgbe Jesu rutere n’akụkụ nke ọzọ, n’obodo Gadara, ụmụazụ Jọn bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere anyị na ndị Farisii ji ebu ọnụ ma ụmụazụ gị anaghị ebu ọnụ?”
Jesu zara ha sị, “Ndị bịara oriri agbamakwụkwọ ha ga-anọ n’uru mgbe ha na nwoke na-agba akwụkwọ ka nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-anapụ ha nwoke na-agba akwụkwọ mgbe ahụ, ha ga-ebube ọnụ.”
Igbo Mass readings for February 17 2024, Satọde na-eso Wenezde Ntụ.
Igbo Mass Readings for February 16 2024, Fraịde na-eso Wenezde Ntụ.