Igbo Mass Readings for January 12 2024, Fraịdee n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 12 2024, Fraịdee n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:4-7, 10-22

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ mbụ nke Samuel

Ndị okenye Izrel zukọrọ, bịakwute Samuel na Rama, wee sị ya, “Ugbu a, ị ghọọla agadị. Ma ụmụ gị anaghị eso ụkpụrụ gị. Ya mere họpụtara anyị eze ga-achị anyị, ka anyị nwee eze dị ka mba ndịọzọ”. Arịrịọ ha rịọrọ ka e nye ha eze wutere Samuel.

O wee kpee ekpere ịmata uche Yahweh. Yahweh gwara ya, “Gee ha ntị n’ihe ọbụla ha na gwa gị, n’ihina ọbụghị gị ka ha jụrụ; Kama, ọ bụ mụ onwe m ka ha jụrụ ịbụ eze ha.

Samuel gwara ndị Izrel, ndị na-arịọ eze n’aka ya, ihe niile Yahweh gwara ya. Ọ sịrị ha: “Otu a ka eze ụnụ ga-esi emeso ụnụ. Ọ ga-achịrị ụmụ ụnụ ndị nwoke nuba ha n’agha.

Ụfọdụ n’ime ha ga anya ụgbọịnyịnya agha ya niile. Ụfọdụ ga na-eji ịnyịnya alụrụ ya agha. Ụfọdụ ga-ebutere ndị ụgbọịnyịnya agha niile ụzọ. Ọ ga-eme ụfọdụ n’ime ha ndịisi usuu puku ndịagha. Ndịọzọ ga-abụkwa ndịisi usuu iri ndịagha.

Ụmụ ụnụ ndị nwoke ga-arụrụ ya ọrụ ubi ya, wekwaara ya ihe ubi ya. Ụfọdụ ga-akpụ ngwaagha ya niile, na ihe ụgbọịnyịnya ya niile. Ụmụ ụnụ ndị nwaanyị ga-abụkwa ndị na-emere ya ude na-esi isi ọma. Ha ga-abụkwara ya ndị na-esiri ya nri na ndị na-emere ya achịcha.

Ọ ga-anarakwa ụnụ ebe kachasị mma n’ala ubi ụnụ, na ubi vaịn ụnụ, na ọhịa osisi oliv ụnụ, were ha nye ndịodibo ya. Ọ ga-anarakwa ụnụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ụnụ wetere n’ubi, na nke ubi vaịn ụnụ, nye ndị na ejere ya ozi na ndịodibo nọ n’ezinụụlọ ya.

Ọ ga-akpọrọkwa ụmụodibo ụnụ ndị nwoke na ndị nwaanyị kacha mma, werekwa ndị kachasị mma n’ehi ụnụ niile, na ịnyịnyaibu ụnụ, mee ka ha rụọrọ ya ọrụ. Ọ ga ewerekwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke igwe ewu na atụrụ ụnụ. Ụnụ onwe ụnụ ga-abụkwa ndị ohu ya.

Mgbe oge ahụ ruru, ụnụ ga-etikwa mkpu n’ihi ihe eze ụnụ họpụtaara onwe ụnụ na-eme ụnụ, ma Osebụrụwa agaghị ege ụnụ ntị. Ma ndị Izrel añaghị Samuel ntị.

Kama ha sịrị, “Mba! Anyị chọrọ eze ka anyị wee dị ka mba ndịọzọ, eze ga na-achị anyị, nke ga na-edu anyị eje agha, nke nwekwara ike ịlụrụ anyị agha.”

Samuel nụchara ihe niile ndị Izrel kwuru, wee jee kọọrọ Yahweh. Yahweh gwara Samuel sị, “Meere ha ihe ha chọrọ, nye ha eze.” Ya mere Samuel wee gwa ụmụnwoke ndị Izrel niile ka ha laa n’ụlọ ha.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 89:16-17, 18-19

Azịza: Agam ekwupụta ịdị mma nke Dinwenụ ebeebe ebeebe

1. Ngọzi ga-adịrị ndị niile ji ukwe eto gị

ndị na-aga n’ihe nke obiọma gị, O Onyenweanyị

Ha ga-añụrị ọñụ n’aha gị ụbọchị niile

Na-enwekwa mbuli elu site n’eziomume gị. Azịza

2. Ịbụ ike anyị na otito anyị

Site n’obiọma gị anyị na-enwe mmeri

Ebe ọ bụ na nchedo anyị na eze anyị

bụ nke Onyenweanyị onye dị nsọ nke Izrel. Azịza.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile, omume ya niile jupụtara n’obi ebere.

Alleluia.

OZIỌMA – 2:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Ka ụbọchị olemaole gachara, Jesu laghachiri na Kapanaum, akụkọ wee gazuo na ọ nọ n’ụlọ. Ma ọtụtụ mmadụ zukọtara nke mere na ohere ọbụla adịghịkwa, ọ bụladị n’ọnụụzọ; ma ọ gwabara ha okwu Chineke.

Mmadụ ụfọdụ buteere ya otu onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, nke mmadụ anọ n’ime ha bu. Ebe ha na-enweghị ike ịbịaru ya nso n’ihi igwe mmadụ ahụ, ha meghere oghere n’elu ụlọ, n’akụkụ ebe ahụ Jesu nọ.

Mgbe ha meghechara ya, ha budara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ n’ute ọ na-edina. Ma mgbe Jesu hụrụ okwukwe ha, o sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Nwa m, a gbagharala gị mmehie gị niile”.

Ụfọdụ ndị odeakwụkwọ nọdụrụ ebe ahụ na-ajụ n’ime obi ha sị, “Gịnị mere nwoke a ji ekwu okwu otu a? Ọ bụ nkwulu! O nwere onye nwere ike ịgbaghara mmehie ma ọ bụghị Chineke?”

Ngwangwa, Jesu chọpụtara na mmụọ ya na ha na-atule okwu a n’ime obi ha; ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere ụnụ ji atule okwu a otu a n’ime obi ụnụ?

Olee nke ka mfe ime, ịsị onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, A gbagharala gị mmehie gị niile, ka ọ bụ ịsị ya, “Bilie chịrị ute gị gagharịba?.

Ma ka ụnụ mara na Nwa nke mmadụ nwere ike ịgbaghara mmehie n’ụwa a, ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Ana m agwa gị, bilie, chịrị ute gị laba.

O biliri, chịrị ute ya ngwangwa si n’ihu ha niile pụọ. Nke a tụrụ ha niile n’anya ha wee too Chineke sị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a mbụ!”

Igbo Mass Readings for January 13 2024, Satọde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for January 12 2024, Fraịdee n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 5, 2022