Igbo Mass Readings for Pentecost Vigil – May 18 2024, Ụka Iche Nche Maka Ndakwasị Nke Mmụọ Nsọ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for Pentecost Vigil – May 18 2024, Ụka Iche Nche Maka Ndakwasị Nke Mmụọ Nsọ
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis
Isi Okwu: A kpọrọ ya Babel, n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka etinyere ọgba-aghara n’asụsụ ụwa niile.
N’oge ahụ, mmadụ niile bi n’ụwa na-asụ otu asụsụ, na-ekwukwa otu ụdị okwu. Mgbe ha nọ na njem ịkwafe laa ọwụwa anyanwụ, ha pụtara hụ ebe ala dị larịị na Shina.
Ha wee biri n’ebe ahụ. Ha bidoro ịsị ibe ha: “Ngwanụ ka anyị kpụwa aja a zọrọ azọ; ka anyị hụwa aja ahụ n’ọkụ iji mee ka o sie oke ike.” Ha jiri aja ahụ a kpụrụ akpụ, a hụrụ n’ọkụ mere okwute; bịakwa were ụpụrụtụ mmanụ ala mee ụrọ.
Ha wee sị: ‘Ngwanụ ka anyị wuoro onwe anyị otu nnukwu obodo na otu ụlọ elu nke ọnụnụ ya ga-emetụ na mbara igwe. Ọ bụ ihe a ka a ga-eji anụ aha anyị.
Ihe ndị ga-ejikọta anyị n’otu, meekwa ka anyị ghara ịgbasa n’elu ụwa niile. Onyenweanyị gbadatara ịhụ nnukwu obodo ahụ na ụlọ elu ahụ mmadụ wuru.
Mgbe ahụ ka Onyenweanyị jiri kwuo: “Ọ bụrụ na ha ebidola ụdị ihe a ugbu a ha bụ otu agbụrụ na-asụ otu asụsụ, n’ọdịnihu, o nweghị ihe ga-egbochi ha ime ihe ọ bụla ha bu n’obi.
Ngwanụ ka anyị gaa tinye ọgba aghara n’asụsụ ha. Ka anyị nye ha ọtụtụ asụsụ dị iche iche, nke ga-egbochi ha ịnụ ihe ibe ha na-ekwu. Onyenweanyị wee si otu a si n’ebe ahụ chụsaa ha n’elu ụwa niile.
Ha wee kwụsị iwu nnukwu obodo ahụ. Nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel, nke pụtara ‘Ọgba Aghara,’ n’ihi na ọ bụ n’ebe abụ ka Onyenweanyị tinyere ọgba aghara n’asụsụ ụwa niile. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka O siri chụsaa ha n’elu ụwa niile.
Ma ọ bụ
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:3-8,16-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ
Isi Okwu: Onyenweanyị gbadatara n’ugwu Saịnaị n’ihu ndị mmadụ.
Mosis rịgooro n’elu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ ka Onyenweanyị ji kpọọ ya oku sị ya: “Lee ihe ịga-agwa ụlọ Jekọp. Gwa ụmụ Izrel: ụnụ ejila anya ụnụ hụ ihe M mere ndị ljipt.
Ụnụ jikwara anya ụnụ hụ ka M si buru ụnụ na nku dịka ugo, si otu a dọtara ụnụ onwe m. N’ihi ya, ọ bụrụ na ụnụ egezie M ntị n’olu, bịakwa na-edebe ọgbụgba ndụ M, ụnụ ga-abụ ndị nke M n’ụzọ pụrụ iche.
Ụnụ ga-adị M n’obi karịa ndị ọzọ niile, ọ bụ ezie na ụwa niile bụ nke M. Ụnụ ga-abụrụ M alaeze ndị nchụaja na obodo dị nsọ. Ọ bụ ihe a ka ịga-agwa ụmụ Izrel.”
N’ihi ya, Mosis jere kpọkọọ ndị okenye niile nke Izrel. O weere okwu niile ahụ Onyenweanyị nyere ya n’iwu guzobe ha n’ihu. Mmadụ niile jikwa otu olu zaghachi ya sị: “Ihe niile a Onyenweanyị kwuru, anyị ga-emezucha ya.”
Mosis gwara Onyenweanyị ihe niile ndị Izrel kwuru. N’ụtụtụ ụbọchị nke atọ, egbe eluigwe na amụma malitekwara ịgba aghara aghara. Nnukwu igwe ojii wee kpuchichaa elu ugwu ahụ.
Enwee oke ụda opi ike, nke na mmadụ niile bidoro mawa jijiji tụọ egwu n’ebe obibi. Ma Mosis si n’ebe obibi dupụta ndị mmadụ ahụ ka ha bịa zute Chineke.
Ha niile gbakọrọ n’ala ugwu. Mgbe ahụ anwụrụ ọkụ kpuchiri ugwu Saịnaị niile maka na Onyenweanyị rịdatara dị ka ire ọkụ n’elu ugwu ahụ. Anwụrụ ọkụ rịgooro elu dị ka anwụrụ ọkụ nke ọhịa na-ere ọkụ.
Ugwu niile wee na-ama jijiji nke ukwu. Ụda opi ike ahụ wee na-adasikwa ike. Mgbe Mosis na-ekwu okwu, Chineke ji egbe eluigwe na-azaghachi ya. Mgbe Onyenweanyị gbadatara n’ugwu Saịnaị, Ọ kpọrọ oku ka Mosis rịgote n’elu ugwu, bịa zute ya.
Ma ọ bụ
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 37:1-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Izikiel
Isi Okwu: Ọkpụkpụ kpọrọ nkụ! A ga m etinye mmụọ m n’ime ụnụ, ka ụnụ wee dị ndụ.
Aka nke Onyenweanyị dakwasara m. O wee duru m n’ime Mmụọ nke Onyenweanyị, pụọ guzobe m n’etiti otu ndagwurugwu. Ma ndagwurugwu ahụ jupụtara n’ọkpụkpụ.
O mere ka m gagharịa agagharị na ndagwurugwu ahụ. M wee hụ na ọkpụkpụ ghasara na ndagwurugwu ahụ nke dị ukwuu n’ọnụ ọgụgụ; hụkwa na ha niile bụ ọkpụkpụ kpọrọ nkụ.
O wee sị m: “Nwa nke Mmadụ, ọkpọkpụ ndị a enwere ha ike ịdị ndụ? Azara m ya sị: “Onyenweanyị Chineke, sọ Gị ma nke ahụ.” O wee sị m: “Buo amụma n’elu ọkpụkpụ ndị a, sị ha: “Ọkpụkpụ kpọrọ nkụ!
Nụrụnụ okwu nke Onyenweanyị. Lee ihe Onyenweanyị Chineke gwara ọkpụkpụ ndị a. Ụnụ ahụla. Aga M etinye mmụọ n’ime ụnụ, ka ụnụ wee dị ndụ. Aga M etinye akwara n’elu ụnụ, bịakwa mee ka anụ ahụ topụta ụnụ n’elu.
Aga M eyikwasa ụnụ akpụkpọ ahụ. Aga M etinye Mmụọ M n’ime ụnụ ka ụnụ wee nweta ume ndụ. Mgbe ahụ ka ụnụ ga-amata na abụ M Onyenweanyị.” E buru m amụma dịka e siri gwa m.
Otu ihu ahụ m na-ebu amụma ka m nụrụ ụzụ, ụzụ mkpọtụ. E nwere mkpọtụ mgbe ọkpụkpụ na-abịakọta ọnụ, na-ejikọtakwa ọnụ. Ahụrụ m ka ha na-agbapụta akwara, na-etopụtakwa anụ ahụ.
Akpụkpọ ahụ wee kpuchie ha, ma mmụọ adịghị n’ime ha. O wee sị m: “Nwa nke mmadụ, buoro mmụọ amụma sị: Lee ihe Onyenweanyị Chineke kwuru: “Mmụọ, si n’akụkụ anọ nke ụwa bịa kukwasa ndị a e gburu egbu ume ndụ ka ha wee dị ndụ.
Eburu m amụma otu e si gwa m, mmụọ wee bata n’ime ha. Ha wee dị ndụ, kwụrụ ọtọ, ghọọ nnukwu igwe ndị agha.” Mgbe ahụ, O wee sị m: “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a bụ ụlọ niile nke Izrel.
Kemgbe ka ha na-ekwu sị: “Ọkpụkpụ anyị akpọọla nkụ. Olile anya anyị alaala n’iyii. A kụchapụla anyị.” N’ihi ya, buo amụma gwa ha sị: “Lee ihe Onyenweanyị Chineke kwuru: ‘Ndị nke M, aga M emeghe ọnụ ili ụnụ, bịakwa mee ka ụnụ si na ha bilitechaa.
Aga M akpọlata ụnụ n’ala Izrel. Mgbe ahụ ka ụnụ ga-amata na abụ M Onyenwe ụnụ. Ndị nke M, mgbe M ga-emeghe ọnụ ili ụnụ, bịakwa mee ka ụnụ si na ha bilitechaa, aga M akụnye Mmụọ M n’ime ụnụ ka ụnụ wee dị ndụ.
Aga M ebiwe ụnụ n’ala ụnụ. Otu ahụ ka ụnụ ga-esi amata na abụ M onyenwe ụnụ.” Onyenweanyị kwuru sị: “Ekwela M ụnụ nkwa. Aga M emezurịrị nkwa ahụ.
Ma ọ bụ
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Joel
Isi Okwu: Ọ bụladị ohu m nwoke na ndị nwanyị, a ga m awụsa ha Mmụọ Nsọ m.
Lee ihe Onyenweanyị kwuru: “Aga M awụsa mmadụ niile Mmụọ M. Ụmụ ụnụ nwoke na ụmụ ụnụ nwanyị ga-ebu amụma. Ụmụ okorobịa ụnụ ga-ahụkwa ọhụ.
Ndị okenye ụnụ ga-arọkwa nrọ. Ee, ọ bụladị ohu M nwoke na ohu M nwanyị, aga M awụsa ha Mmụọ M na mgbe ahụ. Aga M eme ka ihe dị egwu pụta ihe n’eluigwe, gosikwa ihe ịrịba ama n’ụwa n’okpuru ya.
Ọbara ga-awụsi, ọkụ eree, anwụrụ ọkụ e wee na-akpagharị. Anyanwụ ga-agbanwo ghọọ ọchịchịrị; ọnwa agbanwoo ghọọ ọbara, tupu ụbọchị Onyenweanyị ahụ abịa, bụ ụbọchị ukwu ahụ ga-apụta ihe.
Dịka Onyenweanyị si kwuo ya, a ga-enwe ndị e gbuforo egbufo n’Ugwu Zayọn. A ga-enwekwa ndị a zọpụtara azọpụta na Jerusalem, ndị Onyenweanyị ga-akpọ ndị nke Ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 103:1-2, 24, 27-30, 35 Az. 30
Azịza: Onyenweanyị zidata Mmụọ Gị. Mee ka ihu ụwa dị ọhụrụ.
Ma ọ bụ Aleluya
1. Mkpụrụobi m, too Onyenweanyị.
Onyenweanyị na Chineke m, n’ezie I nweghị atụ!
I ji ugwu eze na ebube mere uwe.
I jikwa ihe mere uwe mwụda. Azịza
2. Onyenweanyị, ọrụ Gị dị n’iche n’iche,
ma I jiri amamihe hazie ha niile nke ọma.
Ihe I kere eke jupụtara ụwa n’ọnụ.
Mkpụrụobi m, too Onyenweanyị, Azịza.
3. Ihe niile I kere eke wụkwasara Gị anya n’aka,
ka I nye ha ihe oriri ha na mgbe ya.
Ọ bụrụ na I nye ha nri, ha erie.
I were obi ọma Gị sagheere ha aka, ha nwee afọ ojuju. Azịza
4. Nke ọ bụla Ị napụrụ ume ndụ,
o kubie ume, wee laghachi n’aja, ebe ha si pụta.
I zidata Mmụọ Gị, e kezie ha.
I wee mee ka ihu ụwa dị ọhụrụ. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 8:22-27
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Rom
Isi Okwu: Mmụọ Nsọ n’akọwapụta onwe ya n’ụzọ ọnụ enweghị ike ịkọwa.
N’ihi na anyị maara na site kemgbe ụwa bidoro ruo ugbu a, ihe niile e kere eke na-asụkọ ude n’otu, dịka nwanyị ime na-eme. Ọ bụghị naanị ihe e kere eke.
Anyị onwe anyị kwa bụ ndị nwetara mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, sokwa na-asụ ude n’ime onwe anyị, ebe anyị nọ na-eche ka a bịa gbapụta ahụ anyị. N’ihi na olile anya anyị nyere anyị afọ ojuju na a ga-azọpụta anyị.
Ihe ọ pụtara bụ na anyị ejibeghị anya abụọ hụ nzọpụta ahụ anyị na-atụ anya ya. Maka na ọ bụrụ na mmadụ ahụla ihe ọ na-ele anya ya, ihe ahụ abụghịkwa olile anya.
N’ezi asụsụ, mmadụ ọ na-elerịrị anya ihe o jirila anya ya abụọ hụ? Ma ọ bụrụ na anyị na-ele anya ihe anyị na-ahụghị anya, anyị na-ewere ntachi obi na-eche ihe ahụ.
Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka n’ime adịghị ike anyị. N’ihi na anyị amaghị ka e si ekpe ekpere dịka o kwesịrị. Ma Mmụọ Nsọ n’onwe Ya ji ịsụ ude, nke ọnụ na-apụghị ịkọwapụtacha, na-arịọrọ anyị arịrịọ.
Ma Chineke, Onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bu n’uche, n’ihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ.
MBEKU
Aleluya, aleluya!
Bịa Mmụọ Nsọ nọjuo n’obi ndị kwerenụ. Mụnye n’ime ha ọkụ nke ịhụnanya Gị.
Aleluya!
OZIỌMA – 7:37-39
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Mmiri iyi ga-esi n’obi ya na-erupụta.
N’ụbọchị nke ikpeazụ, bụ oke ụbọchị nke Emume ahụ, Jesu guzoro ọtọ tie mkpu sị: “Onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwute M. Onye ọ bụla kwere na M, ya bịa ñụrụ mmiri”.
Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwu: ‘Mmiri iyi nke na-enye ndụ ga-esi n’obi ya na-erupụta.” Ma Jesu na-ekwu nke a banyere Mmụọ Nsọ nke ndị kwere na Ya ga-anata. N’oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ Nsọ, n’ihi na mgbe ahụ Jesu abanyebeghị n’otito Ya.
Igbo Mass Readings for May 19 2024, Ụka Ndakwasa nke Mmụọ Nsọ – Pentikọst
Igbo Mass Readings for Pentecost Vigil – May 18 2024, Ụka Iche Nche Maka Ndakwasị Nke Mmụọ Nsọ