Igbo Mass Readings for April 8 2023, Ụka Mbilite N’Ọnwụ Onyenweanyị (Satọdee N’Izuụka Dị Asọ) – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ IgboMass Readings for April 8 2023, Ụka Mbilite N’Ọnwụ Onyenweanyị (Satọdee N’Izuụka Dị Asọ) – Afọ nke Mbụ.

Agba Ochie

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-2:2 ma ọ bụ 1:26-31

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Jenesis

Isi Okwu: “Chineke hụrụ ihe niile O kere eke; n’ezie, ha mara mma nke ukwu.”

N’isi mbido, Chineke kere igwe na ala. Ma o nweghị ihe ọ bụla dị n’ala karịa sọ ọchịchịrịị. Mmụọ nke Chineke na-erugharị n’elu mmiri. Chineke wee kwuo sị: “Ka ihè dị”, ihè wee dị. Chineke hụ na ihè dị mma, O were kewaa ihè na ọchịchịrị.

Chineke kpọọ ihè ụbọchị, kpọọ ọchịchịrị anyasị. Uhuruchi na ụtụtụ bịa: ụbọchị mbụ gaa. Chineke kwuo sị: “Ka urukpu dị na mmiri, nke ga-ekewa mmiri ụzọ abụọ.” Urukpu wee dị. Chineke mee urukpu ka o kewaa mmiri dị n’igwe na nke dị n’okpuru ya.

Chineke kpọọ urukpu, eluigwe. Uhuruchi na ụtụtụ bịa: ụbọchị nke abụọ gaa. Chineke kwuo sị: “Ka mmiri niile dị n’okpuru igwe gbakọta ọnụ n’otu ebe; ka ala akọrọ wee dị.” O wee si otu a dị.

Chineke kpọọ ala akọrọ, elu ala, kpọọkwa mmiri, osimiri. Chineke hụ n’ihe ndị a dị mma. Chineke kwuo sị: “Ka ala pupụtawa osisi na mkpụrụ ga-amịta osisi, na ifuru nke ga-enwe mkpụrụ n’ime ya n’ụwa.”

O wee si otu a dị. Ala pupụtara osisi; osisi nke nwere mkpụrụ dị iche iche, ma osisi ukwu ma osisi nta, ụdị mkpụrụ dị iche iche, dị n’ime ha. Chineke hụ na ihe ndị a dị mma.

Uhuruchi na ụtụtụ bịa: ụbọchị nke atọ gaa. Chineke kwuo sị: “Ka lhè dị n’igwe, were kewaa ụbọchị na anyasị, ka ha na-egosi oge oriri, ụbọchị na afọ. Ka lhè dị n’igwe na-acha n’ụwa.”

Ha wee si otu a dị. Chineke wee kee nnukwu ọkụ abụọ. Nke kachanụ ga na-achị ụbọchị; nke ntakịrị ga na-achị anyasị. Chineke kekwara kpakpando niile.

Chineke tinyechaa ha n’igwe ka ha na-amụkesị n’ụwa, bịakwa na-achị ụbọchị na anyasị. Chineke hụ na ihe ndị a dị mma. Uhuruchi na ụtụtụ bịa: ụbọchị nke anọ gaa. Chineke kwuo sị: “Ka azụ na anụ mmiri nwere ume ndụ juputanụ n’ime mmiri, ka nnụnụ na-efe n’ụwa n’okpuru igwe.”

Ihe ndị a mere otu Chineke siri chọọ. Chineke kee nnukwu agwọ na-ebi na mmiri, na ụdị anụ ọ bụla na-ebi na mmiri, na anụ ọ bụla nwere nku. Chineke hụ na ọ dị mma.

Chineke gọzie ha sị: “Na-amịtanụ mkpụrụ, mụbaanụ, ka ụnụ ju mmiri nke osimiri; ka nnụnụ mụbaa n’elu ụwa.” Uhuruchi na ụtụtụ bịa: ụbọchị nke ise gaa. Chineke kwuo sị: “Ka ala wepụta ụdị anụ ọ bụla dị ndụ; anụ ụlọ, anụ na-akpụ akpụ, na anụ ọhịa niile.

Ha si otu ahụ dị: Chineke kee ụdị anụ ọhịa ọ bụla, ụdị anụ ụlọ niile, na ụdị anụ ọ bụla na-akpụ akpụ (na-akpụ afọ n’ala): Chineke bịa hụ na ọ dị mma. Chineke kwuo sị: “Ka Anyị kee mmadụ ka ọ dị ka Anyị, ka ọ dị n’oyiyi Anyị; ka ha bụrụ nna ukwu azụ bi na mmiri, nnụnụ nke igwe, anụ ụlọ na anụ ọhịa niile; na anụ niile na-akpụ afọ n’ala.”

Chineke kee mmadụ n’ụdị Ya Onwe Ya; na ụdịdị Chineke ka O kere ya. O kere ha nwoke na nwanyị. Chineke bịa gọzie ha sị: “Mịtanụ mkpụrụ, mụbaanụ, juputanụ ụwa ka ụnụ merie ya.

Bụrụnụ nna ukwu azụ bi na mmiri, nnụnụ nke igwe, na anụ niile dị ndụ n’elu ụwa.” Chineke kwuo sị: “Lee, ana M enye ụnụ osisi niile na-amịta ihe n’ụwa, ma osisi ukwu ma osisi nta na-amịta mkpụrụ.

Ha ga-abụ nri ụnụ. Gbasara anụ ọhịa niile, nnụnụ niile nke igwe, na anụ niile na-akpụ akpụ n’elu ụwa, enye M ha akwụkwọ osisi ọ bụla ka ọ bụrụ nri ha. O wee si otu ahụ dị.

Chineke hụ na ihe niile O kere bụ sọ mma. Uhuruchi na ụtụtụ bịa: ụbọchị nke isii gaa. Otu a ka e siri wee kechasị eluigwe na ụwa na ebube ha niile. N’ụbọchị nke asaa, Chineke arụchaa ọrụ Ọ malitere ịrụnụ. O zuru ike n’ụbọchị ahụ ka Ọ rụchara ọrụ Ya niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 103:1-2, 5-6, 10, 12-14, 24.35 Az. 30

Azịza: Onyenweanyị, zipụta Mmụọ Gị, mee ihu ụwa ka ọ dị ọhụrụ.

1. Mkpụrụobi m, gọzie Onyenweanyị.

Chineke m, onyenwe m, I buka!

I yi ebube na otito dị ka uwe,

bịakwa were Ihè yie n’ahụ ka akwa. Azịza.

2. Ị tọrọ ntọala ụwa n’ọnọdụ guzosiri ike,

ka ọ nọgidesie ike ruo mgbe ebighị ebi.

I ji osimiri kpuchie ya dị ka uwe.

Osimiri tolitere elu karịa ugwu. Azịza.

3. Ị na-eme iyi dị iche iche ka ha si na ndagwurugwu na-asọpụta.

Ha na-asọpụta n’etiti adị ugwu nta.

N’akụkụ ha ka nnụnụ nke igwe bi,

bịa si na ngalaba osisi na-ekwe ukwe ha. Azịza.

4. I siri n’ebe obibi Gị na-ehudata mmiri n’elu ugwu.

Ala ji onyinye mmiri Gi na-añụju afọ.

Gị na-eme ka ahịhịa topụta, zụọ anụ ụlọ na anụ ọhịa;

na-eme ka osisi a kụrụ n’ala gboo mkpa ndị mmadụ. Azịza.

5. Onyenweanyị, leekwa ka ọrụ gị si dị ụba!

I sitere n’amamihe Gị mee ha niile;

Ụwa jupụtara n’ihe I mere.

Mkpụrụobi m, gozie Onyenweanyị. Azịza.

Ma ọ bụ

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 32:4-7, 12-13, 20, 22 Az. 5.

Azịza: Ụwa jupụtara n’ịhụnanya nke Onyenweanyị.

1. Okwu nke Onyenweanyị kwụ chịm.

Ọrụ Ya niile kwesịrị ịtụkwasị obi.

Ezi omume na ịkwụba aka ọtọ na-eso Onyenweanyị.

Ụwa jupụtara n’ịhụnanya Ya. Azịza.

2. Ọ bụ okwu Ya ka e jiri kee igwe,

N’ụfụrụ si n’ọnụ Ya ka kpakpando niile jiri dị.

Ọ bụ ya na-ejikọ osimiri niile.

Na-echekwa ogbu mmiri nke osimiri. Azịza

3. Ha dị ngọzi bụ ndị Onyenweanyị bụ Chineke ha:

Ndị Ọ họọrọ ka ndị nke Ya.

Onyenweanyị si n’igwe na-elepụta anya.

Anya Ya na-erutecha mmadụ niile. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 22:1-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Jenesis

Isi Okwu: Aja nke Ebreham, nna anyị n’okwukwe.

Chineke nwara Ebreham, ọnwụwa. Ọ kpọrọ ya sị: “Ebraham, Ebraham!” Ebraham azaa sị: “Anọ m ebe a.” Chineke asị ya: “Kpọrọ nwa gị, naanị otu nwa gị bụ Aịzik, onye Ị hụrụ n’anya, ka ụnụ jee n’obodo Morịya.

N’ebe ahụ ka ị ga-eji ya chụọ aja n’elu ugwu nke M ga-egosị gị.” Mgbe chi bọrọ, Ebreham arịgoro ịnyịnya ya, ya na ụmụodibo ya abụọ na nwa ya nwoke bụ Aịzik. O buuru ukwu nkụ maka ịchụ aja, wee bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya.

N’ụbọchị nke atọ, Ebreham lepụrụ anya hụ ebe ha na-aga. Ebreham gwara ụmụodibo ya sị: “Ụnụ na ịnyịnya nọrọ ebe a. Mụ na nwata a ga-eje ebe ahụ, ebe anyị ga-esekpuru Chineke ma bịakwutekwa ụnụ ọzọ.”

Ebreham boro Aịzik ukwu nkụ ahụ a ga-eji achụ aja, mana ya onwe ya buuru ọkụ na mma. Ha abụọ ewere gawa. Aịzik jụrụ nna ya Ebreham sị: “Nna m.” Nna ya aza ya: “Nwa m.” Nwa ya asị ya: “Lee, nke a bụ ọkụ na nkụ, ma kedụ atụrụ a ga-eji achụ aja?”

Ebreham zara ya sị: “Nwa m, Chineke ga-eweta ihe a ga-eji chụọ aja.” Ha abụọ were gawa. Mgbe ha ruru ebe Chineke gwara ya, Ebreham rụrụ ebe nchụaja, gbajisie nkụ tụkwasị n’elu ya.

O jidere nwa ya bụ Aịzik, kee ya ụdọ, buru ya tụkwasị n’ebe nchụaja. Ebreham amatịa aka ya, mịrị mma ka o gbuo nwa ya. Mana Mmụọ ozi Chineke si n’eluigwe kpọọ ya oku sị: “Ebreham! Ebreham!” Ebreham azaa sị: “Lee m.”

Mmụọ ozi wee gwa ya sị: “E gbukwala nwata ahụ; e merụkwala ya ahụ; aghọtala m ugbu a na ị na-atụrụ Chineke egwu. Ị jụghị inye M nwa gị, naanị otu nwa ị mụtara.” “Mgbe ahụ ka Ebreham lelitere anya elu, wee hụ otu ebulu ahịhịa dị n’ọhịa jidere na mpi.

Ebreham jiri ebulu ahụ chụọ aja, kama iji nwa ya. Ebreham kpọrọ ebe a Dinwenụ Na-Egbo Mkpa. “Nke a mere e ji ekwukwa ruo taa: N’elu ugwu ọ bụ Dinwenụ Na-Egbo Mkpa.”

Mmụọ ozi nke Dinwenụ si n’eluigwe kpọọ nke ugboro abụọ sị ya: “Dinwenụ na-ekwu sị: Ewere M onwe M ñụọ iyi: maka na i rubeere M isi, n’ihi na ị jụghị inye M nwa gị, naanị otu nwa gị, aga M ehukwasị gị ngọzi; aga M eme ka ụmụ ụmụ gị dị ka kpakpando nke igwe na mkpụrụ aja dị n’agịga mmiri. Ụmụ ụmụ gị ga-emeri ndị iro ha. Mba niile dị n’ụwa ga-esi n’aka ụmụ ụmụ gị nweta ngọzi n’ihi nrube isi gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 15:5.8-11, Az. 1

Azịza: Chineke m, chekwaba m, agbabatala m n’ime Gị.

1. Dinwenụ, Gị bụ oke m na iko m;

Gị bụ ụgwọ m ga-erite.

Ana m akwụba Dinwenụ n’ihu m mgbe niile:

Ebe Ọ kwụ n’akụkụ m, aga m akwụsi ike. Azịza.

2. Ya mere obi m na-egori;

mmụọ m na-añụrị.

Ahụ m ga-enweta ezumike,

n’ihi na Ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m n’etiti ndị nwụrụ anwụ,

ma ọ bụ kwe ka onye Ị hụrụ n’anya, ree ure. Azịza.

3. Ị ga-egosi m ụzọ nke ndụ;

nyekwa m añụrị zuru oke n’ihu gị,

na añụrị dị ebighị ebi n’aka nri Gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ATỌ – 14:15-15:1

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ

Isi Okwu: “Ụmụ Izrel gafere Osimiri n’ala ọkpọrọ”

Dinwenụ gwara Mosis sị: Kedụ ihe i ji akwara m akwa? Gwa ụmụ Izrel ka ha na-aga n’ihu. Ma gị onwe gị, welite mkpara gị, gbatịa aka gị n’elu osimiri kụọ mkpara n’elu ya, ka osimiri kewaa abụọ, ka ụmụ Izrel si n’ala ya dị kọrọ kọrọ gafee.

Mụ onwe M ga-akpọchi obi ndị ljipt, ka ha chụrụ ụmụ Izrel gawa. Ọ bụ site n’imesi Fero ike, ya na ndị agha ya niile na ịnyịnya agha ya niile ka M ga-esi wetara Onwe M otito.

Oge M wetara onwe M otito a site n’imesi Fero ike, ya na ịnyịnya ya na ndị agha ya, ndị ljipt ga-amata na M bụ Diawenụ. Mgbe ahụ ka Mmụọ ozi nke Dinwenụ, nke na-edu ndị agha nke Izrel, bugharịrị ogidi igwe ojii ahụ n’oge a mee ya ka ọ dịrị azụ ụmụ Izrel.

Nke a mere ka ogidi igwe ojii ahụ dịrị n’etiti ụmụ Izrel na ndị Ijipt. Igwe ojii gbachiri ha anya ka ọchịchịrị. N’anyasị niile ahụ, ndị agha ljipt ahụghị azụ ndị Izrel anya. Mosis wee setịa aka ya n’elu mmiri.

Dinwenụ mere ka oke ikuku si n’ọwụwa anyanwụ kugide n’abalị ahụ. Nke a mere osimiri ji sọlaa azụ, ala achawapụta. Osimiri wee kewaa abụọ, ụmụ Izrel esi n’ala dị kọrọ kọrọ gafee, mmiri anọrọ ha n’aka nri nọrọkwa ha n’aka ekpe.

Ndị Ijipt achụwa ha n’ike n’ike. Ịnyịnya Fero, ịnyịnya agha ya niile na ndị niile na-agba ịnyịnya banyere n’ebe ahụ ụmụ Izrel siri gafee, chụrụ ha gawa. N’isi ụtụtụ, Dinwenụ siri n’igwe ojii ledata anya hụ ndị agha Ijipt wee tinye ọgba aghara n’etiti ha.

O mere ka ụkwụ ụgbọ ala ha mịkpuo n’apịtị nke mere na ha enweghịkwa ike ịga n’ihu ma ọ bụ laa azụ. Ndị agha Ijipt wee tie mkpu si: “Ngwanụ, ka anyị laghachi azụ, hapụ ụmụ Izrel.

Dinwenụ na-alụrụ ha ọgụ na-emesi anyị ike. Dinwenụ gwara Mosis sị: “Gbatịa aka gị n’elu mmiri ka o kpuchigide ndị ljipt, ụgbọ agha ha na ndị na-agba ịnyịnya.”

Mosis esetịa aka ya n’elu osimiri. Ka chi na-abọ, osimiri rughachiri bịa dịkwa ka ọ dị na mbụ. Ndị Ijipt chọsiri ụzọ ha si agbapụ ike, ma Dinwenụ mere ka osimiri ahụ ruchigide ha.

Osimiri ahụ ruchigidere ndị agha niile, na ụgbọ ala niile, na ịnyịnya ibu niile, na ndị isi agha Fero niile, ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa n’ime osimiri ahụ. Mana ụmụ Izrel gafere osimiri a n’ala akọrọ, n’ihi na mmiri hulara aka nri, hulaakwa aka ekpe.

Ụbọchị ahụ ka Dinwenụ zọpụtara Izrel n’aka ndị ljipt. Ndị Izrel hụrụ ozu ndị Ijipt, ka ha tọgbọcha n’akụkụ mmiri. Ụmụ Izrel hụrụ ihe ịrịba ama dị otu a nke Chineke ji zọpụta ha site n’aka ndị Ijipt, egwu Chineke tụrụ ha. Ha wee kwenye na Dinwenụ na Mosis, bụ nwodibo Ya. Ọ bụ ugbu a ka Mosis na ụmụ Izrel bụrụ abụ ọma nke a iji too Dinwenụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Ọpụpụ 15:1-6, 17-18. Az. 1

Azịza: Aga m ekwere Dinwenụ ukwe, mmeri Ya dị ebube.

1. Aga m ekwere Dinwenụ ukwe otito nke mmeri!

Ịnyịnya na ndị na-agba ha ka a tụnyere n’ime osimiri.

Dinwenụ bụ ike m, Dinwenụ bụ ukwe m.

Nke a bụ Chukwu nke m na-eto.

Chukwu Nna m, enye m Gị otito. Azịza.

2. Chineke bụ onye ọchị agha,

aha Ya bụ Dinwenụ.

Ọ tụnyere ndị agha Fero na mmiri.

Ozigbo ndị agha ya ka mmiri gbagburu.

Ha miri ka nkume, tọgbọrọ chaa n’ime mmiri. Azịza.

3. Dinwenụ, aka nri Gị bụ sọ ike n’ebube.

Dinwenụ, aka nri Gị hichapụrụ ndị iro anyị.

I ji otito Gị dị ebube gbupịa ndị iro anyị. Azịza.

4. Ị ga-edu ha, kụnye ha ka mkpụrụ osisi n’elu ugwu Gị.

Dinwenụ ebe a ka I ji mere ụlọ obibi Gị.

Ọ bụ ụlọ nsọ, Dinwenụ, I ji aka Gị rụọ.

Dinwenụ ga-achị ruo mgbe ebighị ebi. Azịza.

Agba Ọhụụ

IHE ỌGỤGỤ – 6:3-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Kristi ebilitela n’ọnwụ! Ọ gaghị anwụkwa ọzọ.

Ma ọ bụ ụnụ amaghị na mgbe e mere anyi niile mmirichukwu ịba n’ime Kristi Jesu, na e mekwara anyị mmirichukwu isonye n’ọnwụ Ya? Mgbe e mere anyị mmirichukwu, e likọtara anyị na Ya, ka anyị wee sonye n’ọnwụ Ya.

Ihe Chineke bu n’obi bụ nke a: Ka otu ahụ Chineke Nna sitere n’ike Ya dị ebube mee ka Kristi si n’ọnwụ bilie, ka anyị onwe anyị sikwa otu ahụ malite ịdị ndụ ọhụrụ.

N’ihi na, ọ bụrụ na Chineke mere ka anyị na Ya bụrụ otu site n’ime ka anyị nwụọ ụdị ọnwụ Kristi nwụrụ, Chineke ga-emerịrị ka anyị na Ya buru otu site n’ime ka anyị bilie n’ọnwụ dị ka Kristi si bilie.

Anyị makwaara nke a: Na a kpọgidekọrọ mmadụ ochie anyị na Kristi n’obe, ka e wee mee ka ahụ anyị nke mmehie nwezuru ghara ịdị ire, ka anyị gharakwa ịdị na-agbụ ahụ nke njọ ọzọ.

N’ihi na mgbe mmadụ nwụrụ ka e wepụrụ ya n’ike ọchịchị nke njọ. Ọ bụrụ na anyị soro Kristi nwụọ n’ọnwụ Ya, anyị nwekwara okwukwe na anyị na Ya ga-adịkọ ndụ ọzọ.

N’ihi na anyị ma na, ebe Chineke mere ka Kristi si na ndị nwụrụ anwụ bilie, Ọ gaghị anwụ ọzọ. Ọnwụ enweghịkwa ike n’ebe Ọ nọ ọzọ. N’ihi na ọnwụ Ọ nwụrụ, Ọ nwụrụ naanị otu ọnwụ n’ebe mmehie dị.

Ma ndụ Ọ na-adị. Ọ na-adị ya n’ebe Chineke nọ. Otu aka ahụ, na-agụnụ onwe ụnụ na ndị nwụrụ anwụ n’ebe mmehie dị: maka na ụnụ na-adị ndụ n’ime Jesu Kristi n’ebe Chineke nọ.

Oge a gụchara ihe ọgụgụ nke a, mmadụ niile ga-ekuli ọtọ. Ụkọchukwu ga e were olu dị ebube kwepụta Aleluya. Ndị otu Kristi zukọrọnụ ga-azaghachi n’otu olu ahụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 117:1-2, 16-17, 22-23

Azịza: Aleluya, Aleluya, Aleluya.

1. Nyenụ Dinwenụ ekele, n’ihi na Ọ dị mma.

Maka n’ịhụnanya Ya enweghị njedebe.

Ka ụmụ Izrel kwuo sị: “Ịhụnanya Ya enweghị njedebe.” Azịza.

2. Ka ụmụ Izrel kwuo sị: “Aka nri nke Dinwenụ emerigo.

Aka nri nke Dinwenụ kulitere m.

Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ,

wee na-eto aka ọrụ Ya.” Azịza.

3. Nkume ahụ nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ aghọọla ide ji ụlọ ugbu a.

Dinwenụ mere nke a.

Ọ bụ ihe ịtụnanya n’ebe anyị nọ. Azịza.

OZIỌMA – 28:1-10

Ihe Ọgụgụ nke e si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: “O bilitela n’ọnwụ. Ugbu a o butere ụnụ ụzọ na-aga Galili.”

Ma mgbe ụbọchị izuike na-agwụ, ụbọchị nke mbụ n’izu ụka wee na-abọta, Meri Magdalin na Meri nke ọzọ bịara ka ha lee ili ahụ. Na mberede, oke ala ọma jijiji wee daa.

N’ihi na Mmụọ ozi nke Onyenweanyị siri n’eluigwe rịdata, wee bịaruo, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili, wee nọkwasị kwa n’elu ya. Oyiyi ya dị ka amụma.

Uwe ya na-acha ọcha dị ka mkpụrụ mmiri. Ndị na-eche ili ahụ mara jijiji. Ha dịkwa ka ndị nwụrụ anwụ n’ihi egwu. Mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ okwu sị: “Ụnụ atụla egwu!

N’ihi na ama m na ụnụ na-achọ Jesu onye a kpọgburu n’obe. Ọ nọghị n’ebe a. O sitela n’ọnwụ bilie, dị ka O kwuru. Bịanụ lee ebe e liburu Ya. Gaanụ ọsọ ọsọ, gwa ndị Ụmụazụ Ya, sị: “O sitela n’ọnwụ bilie.

O burula ụnụ ụzọ gawa Galili. N’ebe ahụ ka ụnụ ga-ahụ Ya. Ọ bụ ozi a ka m na-ezi ụnụ!” Ha weere egwu na oke ọñụ, gbaa ọsọ, gaa izi Ụmụazụ Ya Ozi Ọma ahụ.

Jesu wee zute ha n’ụzọ na mberede sị ha: “Udo dịrị ụnụ!” Ha wee bịa, makụọ Ya n’ụkwụ, kpọọrọ Ya isi ala. Ma Jesu sịrị ha: “Ụnụ atụla egwu! Jeenụ bugara ụmụnna M Ozi Ọma nke a. Gwanụ ha ka ha gawa Galili. N’ebe ahụ ka ha ga-ahụ M.”

Igbo Mass readings for April 9 2023,

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for April 8 2023, Ụka Mbilite N’Ọnwụ Onyenweanyị (Satọdee N’Izuụka Dị Asọ) – Afọ nke Mbụ..

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X
Scroll to Top
error: Alert: Content is protected !!

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.