Ekpere Nhunye, Ukwe Oriri Nsọ na Ekpere A Natachaa Oriri Nsọ maka Izu Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Nkiti

Ekpere Nhunye, Ukwe Oriri Nsọ na Ekpere A Natachaa Oriri Nsọ maka Izu Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Nkiti

EKPERE NHUNYE

Chineke Onye ebere, nara onyinye anyị na-ebutere Gị. Biko mee ka o megheere anyị ụzọ ebe ngọzi Gị niile si abịara anyị. Site na Kristi Onyenweanyị.

UKWE ORIRI NSỌ: Abuọma 118:49-50

Onyenweanyị, cheta okwu nke Ị gwara nwodibo gị, nke I mere ka m nwee ntụkwasịobi na ya, nke a bụ ihe na-enye m ntasịobi mgbe m nọ n’ahụhụ.

Ma ọ bụ

Na nke a ka anyị ji mara ihe ịhụnanya bụ: na Ọ tọgbọrọ ndụ ya n’ihi anyị. Anyị kwesikwara ịtọgbọ ndụ anyị maka ụmụnna anyị. (I Jọn 3:16)

EKPERE A NATACHAA ORIRI NSỌ

Ka anyị rịọ arịrịọ

Onyenweanyị, biko mee  ka ahụ na ọbara Nwa Gị nke anyị ji akwụ ụgwọ maka njọ anyị bụụrụ anyị ihe nzọpụta nke ahụ na mkpụrụobi.

Ka anyị soro keta oke n’otito Ya, ebe anyị so na-ekwupụta ọnwụ Ya n’ụwa a. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

error: Alert: Content is protected !!