Ekpere Nhunye, Ukwe Oriri Nsọ na Ekpere A Natachaa Oriri Nsọ maka Emume Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apọstụl

Emume Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apọstụl

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, nara ekpere na onyinye anyị na-ehunyere Gị n’ụbọchị taa anyị na-eri oriri Matiu dị asọ. Gaa n’ihu na-eduzi anyị n’ịhụnanya Gị dịka I siri wulite okwukwe nke nzukọ Gị site n’okwukwe nke ndị ụmụazụ Gị. Anyị na-arịọ …

UKWE ORIRI NSỌ:  Matiu 9:13

Abịaghị m ịkpọ ndị eziomume kama ndị omenjọ.

EKPERE A NATACHAA ORIRI NSỌ

Nna, anyị eketala oke n’añụrị nke nzọpụta n’emume Yukarịstịa nke a dịka Matiu dị asọ siri nata ya mgbe ọ nabatara Nwa Gị.

Anyị na-arịọ ka nri nke a nye anyị ndụ ọhụrụ n’ime Kristi, onye bịara ịkpọ, ọ bụghị ndị eziomume, kama ndị omenjọ ka ha keta nzọpụta n’alaeze Ya, ebe ọ bụ Dinwenụ ebighị ebi ebighị ebi.

error: Alert: Content is protected !!