Ekpere Nhunye, Ukwe Oriri Nsọ na Ekpere A Natachaa Oriri Nsọ Nke Izu nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Nkiti

Ekpere Nhunye, Ukwe Oriri Nsọ na Ekpere A Natachaa Oriri Nsọ Nke Izu nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Nkiti

EKPERE NHUNYE

Onyenweanyị, anyị na-arịọ Gị, were obiọma meek a onyinye nke a, anyị bụ ndi nke Gị na-ehunyere Gị masị Gị. Ka ihe anyị ji okwukwe na ịhụnanya ebutere Gị ghọọrọ anyị ihe ọgbụgba ndụ nke eluigwe. Site na Kristi Onyenweanyị.

UKWE ORIRI NSỌ: Abuọma 118:4

I meela ka anyị mata iwu gị, ka anyị wee kwụdosiike na ya. Oh! Ka m kwụdosiike n’idobe iwu gị.

Ma ọ bụ

Abụ m ezigbo onye ncheatụrụ, amaara m atụrụ m, atụrụ m amarakwa m. (Jọn 10:14)

EKPERE A NATACHAA ORIRI NSỌ

Ka anyị rịọ arịrịọ

Onyenweanyị, I jirila ihe ọgbụgba ndụ Gị gbaa anyị ume. Biko were obiọma Gị na-enyere anyi aka mgbe dum. Mee  ka anyị site n’ihe omimi nke  a, na ezi ọrụ ndụ anyị rite uru nke nzọpụta. Site na Kristi Dinwenụ anyi.

error: Alert: Content is protected !!