Ekpere Nhunye, Ukwe Oriri Nsọ na Ekpere A Natachaa Oriri Nsọ maka Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Nkiti

EKPERE NHUNYE

Chineke Onye ebere, nara onyinye anyị na-ebutere Gị. Biko mee ka o megheere anyị ụzọ ebe ngọzi Gị niile sị abịara anyị. Site na Kristi Onyenweanyị.

UKWE ORIRI NSỌ: Abụọma 118:49-50

Dinwenụ, cheta okwu ahụ Ị gwara nwodibo Gị; nke m ji biri na nchekwube; wee nweta ntasị obi n’ahụhụ na nsogbu m.

Ma ọ bụ     Jọn 3:16

Otu a ka anyị si mata ihe bụ ịhụnanya nke Chineke: N’ihina na Kristi weere ndụ Yan ye maka anyị, iwu ji anyị iwerekwa ndụ anyị nye maka ụmụnne anyị.

EKPERE A NATACHAA ORIRI NSỌ

Ka anyị rịọ arịrịọ

Chetụ ntakịrị kpee ekpere n’ime obi.

Onyenweanyị, biko mee  ka ahụ na ọbara Nwa Gị nke anyị ji akwụ ụgwọ maka njọ anyị bụụrụ anyị ihe  nzọpụta nke ahụ na mkpụrụobi.

Ka anyị soro keta oke n’otito ya, ebe anyị so na-ekwupụta ọnwụ Ya n’ụwa a. Site na Kristi Dinwenụ anyị.

error: Alert: Content is protected !!