Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Izu Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Nkiti

Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Izu Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Nkiti
Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Izu Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Nkiti

UKWE MBATA:  Dan 3:31, 29, 30, 43, 42

Onyenweanyị, Ị kpeela anyị ikpe ma nye anyị ntaramahụhụ zir ezi, n’ihina anyị emeela njọ megide gị. Anyị egeghị ntị n’iwu gị.

Ma ugbu a, nye anyị nzọpụta nke tosiri ọrụ ebube niile Ị na-arụ.

EKPERE MMEGHE:

Ka anyị rịọ arịrịọ:     

Chineke anyị, na nnukwu ebere na mgbaghara Gị ka Ị na-egosị ike Gị pụrụ ime ihe niile. Biko hukwasa anyị amara Gị n’akwụsịghị akwụsị.

Nyere anyị aka ka anyị were ọsọ na-agbaga na nkwa Ị kwere anyị, wee bịa keta oke n’aụrị nke eluigwe. Site na Dinwenụ anyị ..

Ma ọ bụ

Ka anyị rịọ arịrịọ:

Nna nke Onyenweanyị Jesu Kristi, Ị gosịrị anyị ịdị mma nke Gị. Site n’ebere Gị na-enweghị ngwụcha, Ị na-agbaghara anyị njọ anyị mgbe niile.

Biko mee  ka ike ịhụnanya nke a nọrọ n’obi anyị oge niile. Wetara ndị niile anyị na ha na-emekọrịta mgbaghara; kpọbatakwa ha n’alaeze Gị. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi …

error: Alert: Content is protected !!