Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Nkiti

Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Uka Nke Iri Abuo na Isii Noge Nkiti

Ukwe Mbata     Dan 31:29. 30. 43. 42

Onyenweanyị, ihe niile ahụ I meere anyị, I jiri ikpe  mkwụmọtọ mee anyị ha, n’ihi na anyị emeghiela Gị; bịakwa nupu isi n’iwu Gị.

Ma bịa nye aha Gị otito, ka I mere anyị ebere dịka nnukwu ebere Gị si dị.

Ekpere Mmeghe

 Ka anyị rịọ arịrịọ

(Maka mgbaghara Chineke na añụrị na ọ na-eweta)

Chetụ ntakịrị kpee ekpere n’ime obi.

Chineke anyị, na nnukwu ebere na mgbaghara Gị ka I na-egosi ike Gị pụrụ ime ihe niile. Biko hukwasa anyị amara Gị n’akwụsịghị akwụsị.

Nyere anyị aka ka anyị were ọsọ na-agbaga na nkwa I kwere anyị, wee bịa keta oke n’añụrị nke eluigwe. Site na Dinwenụ anyị.

Ma ọ bụ

Ka anyị rịọ arịrịọ

(Maka udo nke alaeze e kwere anyị na nkwa)

Chetụ ntakịrị kpee ekpere n’ime obi.

Nna nke Onyenwanyị Jesu Kristi, I gosiri anyị ịdị mma nke Gị. Site n’ebere Gị na-enweghị ngwụcha, Ị na-agbaghara anyị njọ anyị mgbe niile.

Biko mee ka ike ịhụnanya nke a nọrọ n’obi anyị oge niile. Wetara ndị niile anyị na ha na-emekọrịta mgbaghara; kpọbatakwa ha n’alaeze Gị. Site n’Onyenweanyị Jesu Kristi.

error: Alert: Content is protected !!