Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Izu nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Nkiti

Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Izu nke Iri Abụọ na Ise n'Oge Nkiti
Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Izu nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Nkiti

UKWE MBATA:

A bụ m onye nzọpụta nke ụwa niile, ọ bụ Dinwenụ  na-ekwu. Na nsogbu ha niile, aga m anụ mkpu akwa ha, aga m a bụ Dinwenụ ha ebeebe.

EKPERE MMEGHE:

Ka anyị rịọ arịrịọ:

Chineke Nna anyị, I dowere ihe niile I kere eke n’usoro iwu Gị dị nsọ; bịakwa dowe iwu ịhụ mmadụ ibe anyị n’anya n’ime iwu Gị.

Biko mee ka anyị bụ ụmụodibo Gị site n’idowe iwu Gị, tosị iketa oke na ndụ ebighi ebi. Site na Dinwenụ anyị…

Ma ọ bụ

Ka anyị rịọ arịrịọ:

Nna nke eluigwe, Ịhụnanya Gị na-egosị ikpe nkwụmọtọ zuru ezu. Iwu gị dị mmadụ niile mkpa.

Biko, nyere anyị aka ịchọta ịhụnanya nke a n’ime mmadụ ibe anyị; ka anyị site n’ịhuwere iwu Gị isi nweta ikpe nkwụmọtọ Gị. Site na Dinwenụ anyị …

error: Alert: Content is protected !!