Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa

Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa
Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa

UKWE MBATA      

Ekele, Nne dị asọ, Nne mụrụ Eze na-achị eluigwe na ụwa ebighi ebi, ebighi ebi.

EKPERE MMEGHE

 Ka anyị rịọ arịrịọ

Chetụ ntakịrị kpee ekpere n’ime obi.

Chineke Nna anyị, onye okike nke ihe niile, e wepụ Naijirịa, na-arịọ n’Emume Ncheta ịgba afọ nke … nke obodo anyị, ka Ị nye anyị, udo na aga m n’ihu.

Biko chekwaba ndị na-achị achị, na ndị a na-achị achị; na-agbazikwara ha, ka ha were ịkwụba aka ọtọ na egwu nke Chineke na-ebi ndụ.

Biko, mezie obodo anyị ka ọ bụrụ nnukwu obodo; ebe onye ukwu na onye nta ga-ebikọ n’udo, ka a ghara inwe onye megburu ibe ya, ma ọ bụ onye e megburu emegbu.

Mee  ka ọ bụrụ ebe ọgaranya na ogbenye ga-enwe añụrị; ka mmadụ niile bụrụ otu n’ịhụnanya na ezi ọrụ.

Tinye n’obi ndị mmadụ mmụọ nke na-eme ka nwanne na nwanne biri n’udo.

Anyị na-arịọ ihe ndị a site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa Gị Onye Gị na ya dị ndụ na-achị …

Ma ọ bụ

Ka anyị rịọ arịrịọ

Chetụ ntakịrị kpee ekpere n’ime obi.

Onyenweanyị, Chineke Nna ebere, biko nye anyị mgbasike. Anyị na-añụrị ọñụ  na nchedo nke Marịa dị ngọzi, Nwaanyị na-amaghị nwoke.

Biko mee  ka anyị site n’enyemaka ekpere ya zere ajọ ihe niile n’ụwa, iji rute na-añụrị dị ebighi ebi n’alaeze eluigwe. Site na Kristi Dinwenụ anyị ….

error: Alert: Content is protected !!