Ukwe Mbata na Ekpere Mmeghe maka Emume Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apọstụl

Emume Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apọstụl
Emume Ncheta Matiu Dị Asọ, Onye Apọstụl

UKWE MBATA:  Matt 28:19-20

Ya bụ gaanụ, meenụ ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha mmirichukwu. Kụzierenụ ha idobe ihe niile nke m nyere ụnụ n’iwu, ọ bụ Dinwenụ na-ekwu.

EKPERE MMEGHE:

Chineke onye ebere, Ị họrọla onye ọnaụtụ, Matiu dị asọ, ka oketa oke n’ugwu nke ndị ụmụazụ.

Site na ntụzi aka ya na ekpere ya nyere anyị aka ịdị na-eso Kristi ma kwụdosikwaa ike n’ijere Gị ozi. Site na Dinwenụ anyị Kristi, Nwa Gị …

error: Alert: Content is protected !!