Igbo Mass Readings for December 20 2022, Tuezde Izuụka nke Anọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 20 2022, Tuezde Izuụka nke Anọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị .

Igbo Mass Readings for December 20 2022, Tuezde Izuụka nke Anọ n'oge Adventi
Igbo Mass Readings for December 20 2022, Tuezde Izuụka nke Anọ n’oge Adventi

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ  – 7:10-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye amụma Aịzaya

Yahweh gwakwara Ahaz ọzọ sị ya, “Rịọ Yahweh Chineke gị akara ọbụla; ọ sọkwa, ya bụrụ nke si n’ala mmụọ ma ọ bụ nke si n’eluigwe.” Mana Ahaz kwuru sị, “Mba, agaghị m arịọ ihe ọbụla agaghịkwa m anwale Yahweh.

O wee sị, “Nụrụnụ nke a ụnụ ụlọ nke Devid niile! Ọ bụụrụ ụnụ obere ihe na ụnụ na-eme ndị mmadụ ka ike gwụ ha, ụnụ ji bịa ime Chineke m otu aka ahụ?

N’ihi nke a, Yahweh n’onwe ya ga-enye gị akara. Lee, otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime mụta nwa nwoke; aha ọ ga-akpọ ya bụ Immanuel.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 24: 1-2, 3-4, 5-6.

Azịza: Ka Dinwenụ bata, ọ bụ ya bụ eze nke otito.

1. Chineke nwe ụwa na ihe niile dị na ya,

ụwa na ndị niile bi n’ime ya;

ọ bụ ya wukwasara ya n’elu mmiri

Ọ bụ ya wuru ya n’elu osimmiri. Azịza

2. Onye nwere ike ịrịgoro n’ugwu nke Onyenweanyị?

Onye nwere ike ịnọ n’ebe ya dị nsọ?

Onye aka ya na obi ya dị ọcha

onye anaghị etinye obi ya n’ihe efu. Azịza

3. Onye dị otu a ga-anata ngọzi n’aka Onyenweanyị,

Ọ ga-anatakwa eziomume n’aka Chineke onye nzọpụta ya.

Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị.

ndị na-achọ ihu Chineke nke Jekọb! Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Bịa igodo nke Devid, meeghee ọnụ ụzọ nke Onyenweanyị, tọghapụ ndị nọ na mkpọrọ nke isii.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 1:26-38

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị nsọ nke Luk dere.

N’ọnwa nke isii, Chineke zigara Mmụọọma Gebrel ka ọ gaa n’obodo Galili a na-akpọ Nazaret, ka ọ gakwuru otu nwagbọghọ na-amaghị nwoke, onye ikwunibe ya kwekọrịtara na otu nwoke aha ya bụ Josef, nke si n’agbụrụ Devid, ga-alụ.

Aha nwagbọghọ ahụ bụ Marịa. Mmụọọma ahụ bịakwutere Marịa sị ya, “Ekele, “I jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyere gị.” Obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu n’ụdị ekele a, nke mere na ọ malitere ịtụle n’uche ya ihe ụdị a pụtara.

Mmụọọma ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, Marịa, n’ihina Ị natakwa ngọzi na-aka Chineke. Lee, Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke; aha Ị ga-akpọ ya bụ Jesu. ọ ga-adị ukwuu, a ga-akpọkwa ya nwa onye kacha elu.

Dinwenụ Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. Ọ ga-achị ezinụụlọ Jekọb ebeebe: alaeze ya agaghị enwe ọgwụgwụ. Marịa jụrụ Mmụọọma ahụ sị, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe ọ bụ na amaghị m nwoke.

“Ma Mmụọọma ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasa gị; ike nke onye kacha elu ga-ekpuchi gị. N’ihi nke a, a ga-akpọ nwa ahụ Ị ga-amụ onye nsọ, nwa Chineke.

Lee, Elizabet onye ikwu gị, onye ndị mmadụ na-akpọ nwaanyị aga, atụrụla ime n’agadi ya; ugbu a ọdị ime ọnwa isii. N’ihi na ebe Chineke nọ, o nweghị ihe nyịrị omume.”

Marịa kwuru sị, “Lee, abụ m odibo nwaanyị nke Osebụrụwa, ka o reere m ka I siri kwu.” Mmụọọma ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for December 20 2022, Tuezde Izuụka nke Anọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2023 (Kindle Version)

X
Scroll to Top
error: Alert: Content is protected !!

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.