Igbo Mass Readings for December 21 2024, Satọde
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 21 2024, Satọde
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:8-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Abụ ka Abụ
Ana m anụ olu onye m hụrụ n’anya. Lee ka ọ na-abịa. O si n’ugwu ukwu wụrụ na-awụda n’ugwu ntakịrị. Onye m hụrụ n’anya yiri mgbada, ọ dịka nwaele.
Lee ka o guzo n’akụkụ mgbaaja, si na mpio ụlọ na n’oghere dị na ya elebata anya. Onye m hụrụ n’anya na-agwa m okwu na-asị m: Bilie onye m hụrụ n’anya pụta ka anyị pụọ, gị bụ o kacha mma nke m.
N’ihina oge oyi ọtụtụ agafeela; udummiri agafeela, mmiri ozuzo akwụsịkwala. Okooko osisi apụtabala n’elu ụwa. Ugbu a bụ oge e ji agụ egwu dị ụtọ, A na-anụ olu kparakuku n’ala anyị.
Osisi Fiig amịwala. Nduru m si na mgbawara okwute na ebe nzuzo dị n’okpuru ugwu gosịtụ m ihu gị, kwe m nụtụ olu gị, n’ihi na olu gị dị ụtọ, ihu gị makwara mma.
MA Ọ BỤ
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:14-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye amụma Zefanaya
Kwesie ukwe ike, gị ada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel! Were obi gị niile ñụrịa ma goriwe, gị ada Jerusalem! Yahweh akagbuola ikpe niile mara gị, Ọ chụpụla ndị iro gị niile.
Eze Izrel bụ Yahweh nọ n’etiti gị, egwu ihe ọjọọ ọbụla agaghị atụ gị ọzọ. N’ụbọchị ahụ a ga-agwa Jerusalem sị: “egwu atụla gị, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba.
Yahweh Chukwu gị nọ n’etiti gị, odogwu na-enye mmeri; ọ ga-eji obiụtọ ñụrịa na gị, ọ ga-emekwa ka ị dị ọhụrụ n’ịhụnananya ya, ọ ga-eji nnukwu ukwe gorie na gị dịka ụbọchị emume. “Aga m ewepụrụ gị ọdachi, nke na Ị gaghị enwe ihe mwute.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 33, 2-3, 11-12. 20-21.
Azịza: Tierenụ Chineke mkpu ọñụ ndị eziomume, kwerenụ Chineke ukwe ọhụrụ.
1. Werenụ ụbọ akwara too Chineke;
werenụ une kụọrọ ya egwu.
Kweerenụ Chineke ukwe ọhụrụ,
werenụ ike ụnụ niile kweere Onyenweanyị ukwe mmeri. Azịza
2. Mana atụmaatụ Chineke ga-adị ọkpụ,
Echiche obi ya niile ga-adị ebeebe.
Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke bụ Chukwu ha,
ndị nke ọ họọrọ dịka ndị nke ya. Azịza.
3. Mkpụrụobi anyị na eche Onyenweanyị,
Ya bụ onye enyemaka anyị na onye ogbugbo anyị,
Mkpụrụobi anyị na-añụrị n’Onyenweanyị,
n’ihi na anyị tụkwasịrịobi n’aha ya dị nsọ. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Bịa Ịmmanuel, ihu nke Chukwu n’ebe anyị nọ, onye eze anyị, onye ikpe anyị, Dinwenụ na Chineke.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 1:39-45
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
N’oge ahụ, Marịa biliri, gaa ọsịsọ n’otu obodo dị n’ugwu n’ala Judia. Ọ banyere n’ụlọ Zekarịa, kelee Elizabet. Mgbe Elizabet nụrụ olu ekele Marịa, nwa o bu n’afọ wụliri elu.
Elizabet jupụtara na Mmụọ Nsọ wee tie mkpu ọñụ sị, “Ị dị ngọzi n’etiti ụmụnwaanyị niile, ọ dịkwa ngọzi bụ nwa afọ gị bụ Jesu. Olee otu nke a si rute m aka na nne nke Onyenwe m bịara ileta m?
Lee, mgbe m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m n’afọ wụliri elu n’ọñụ. Ngọzi na-adịrị nwaanyị ahụ nke kwere n’ihe niile Dinwenụ gwara ya, ga-emezu.”
Igbo Mass Readings for December 22 2024, Ụka nke Anọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Atọ
Igbo Mass Readings for December 21 2024, Satọde