Igbo Mass Readings for December 24 2024, Tuezde Izuụka nke Anọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị – Ụka ụtụtụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 24 2024, Tuezde Izuụka nke Anọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị – Ụka ụtụtụ.

Igbo Mass Readings for December 24 2024, Tuezde Izuụka nke Anọ n'oge Adventi
Igbo Mass Readings for December 24 2024, Tuezde Izuụka nke Anọ n’oge Adventi

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:1-5, 8-11, 16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ abụọ nke Samuel

Mgbe Yahweh nyere Devid ezumike n’ebe ndịiro gbara ya gburugburu nọ, Devid wee biri n’ụlọ ya. Devid sịrị onye amụma Natan, “Lee ugbu a, ebi m n’ụlọ osisi sida.

Ma igbe Ọgbụgbandụ Chineke dọrọ n’ime ụlọikwu.” Natan zara ya sị: “Gaa mee ihe ọbụla dị gị n’uche n’ihi na Osebụrụwa nọnyeere gị.” Ma na-abalị ụbọchị ahụ, Yahweh ziri Natan sị, “Jee gwa odibo m bụ Devid, na m sị ya, ‘Ọ bụ gị ga-arụrụ m ụlọ ebe m ga ebi?

Ya mere, jee gwa odibo m bụ Devid na mụ, bụ Chineke nke igwe ndịagha, sị ya, ‘Esiri m ebe Ị na-azụ atụrụ n’ọhịa kpọpụta gị, mekwaa ka Ị bụrụ onyendu ndị nke m bụ Izrel.

Anọnyekwaara m gị ebe ọbụla I jere merikwaa ndịiro gị niile, n’ihu gị. Aga m emekwa ka aha gị dị ukwu dịka ndị aha ha kacha dị ukwu. Aga m ahọpụtara ndị nke m bụ Izrel otu ebe, kụọkwa ha dịka osisi n’ebe ahụ.

Igbo Missal App

Igbo Mass Readings App is a android application developed by Catholic Lectionary Team for Catholic faithful who speak Igbo language. This App is SAFE and FREE. Learn more.

Ha ga-ebikwa n’ebe ahụ na-enweghị nsogbu ọzọ; ndị obi ọjọọ agaghị akpagbukwa ha ka na mbụ, bido mgbe m họpụtaara ndị nke m Izrel ndị ikpe; aga m enye ha ezumike site n’aka ndịiro ha.

Aga m eme ka Ị dị ukwu; aga m ewuru gị ụlọ. Ezinụụlọ gị na alaeze gị ga-adị ebeebe. Aga m akwụdosi ocheeze gị ike ebeebe.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 89: 2-3, 4-5. 27, 29

Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe.

1. Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe.

Bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ,

aga m na-ekwupụta ntụkwasịobi gị.

N’ihina ịhụnaanya gị ga-adị ebeebe,

ikwesị ntụkwasịobi gị ga-akwụdosi ike dịka igwe. Azịza

2. “Mụ na onye m họọrọ agbala ndụ,

añụọrọla m Devid nwodibo m ịyị.

Aga m eme ka ọchịchị gị dị ebeebe,

Aga m emekwa ka ocheeze gị dịgide ruo na ndụdụgandụ niile. Azịza

3. Ọ ga-ebeku m sị, “Ị bụ nna m”,

Chineke m na onye enyemaka m,

Aga m ahụ ya n’anya ebeebe,

Ọgbụgbandụ mụ na ya ga-adị ọkpụ. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Bịa n’etiti anyị Ịmmanuel, gị bụ Chineke nọ n’etiti anyị, gị bụ eze anyị, gị bụkwa onye ikpe anyị, zọpụta anyị Onyenweanyị na Chineke anyị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 1:67-79

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Nna ya bụ Zekarịa jupụtara na Mmụọ Nsọ, bue amụma sị: “Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel makana ọ bịara leta ma zọpụtakwa ndị nke ya. O weliterela anyị onye nzọpụta site n’agbụrụ Devid, nwodibo ya; Otu o siri kwuo n’oge ochie, site n’ọnụ ndị amụma ya: Na a ga-azọpụta anyị site n’aka ndịiro anyị, na sitekwa na-aka ndị niile kpọrọ anị asị.

Gosi ebere nke o kwere nnanna anyị ha na nkwa, bịa chetakwa ọgbụgbandụ ya dị nsọ. Ọ ñụụrụ nnanna anyị bụ Abraham iyi. Kwekwa nkwa na ya ga-azọpụta anyị na-aka ndịiro anyị.

Ka anyị nwee ike na-ekpere ya n’atụghị egwu ọbụla, n’ịdị nsọ na eziomume n’ihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị. Ma gị bụ nwa, ka a ga-akpọ onye amụma nke onye kacha elu, N’ihina Ị ga-aga n’ihu Dinwenụ idoziri ya ụzọ ya niile.

Ime ka ha nwee amamihe nke nzọpụta site na mgbaghara nke njọ ha. Site n’obi ebere nke Chineke anyị, ọ ga-eme ka anyanwụ ụtụtụ bịakwasa ndị nke ya; Inye ndị niile nọ n’ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ ihe. Bịa duzie ụkwụ anyị n’ụzọ nke udo.

Igbo Mass Readings for December 25 2024, Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụzọ Ụtụtụ / Igbo Mass Readings for December 25 2024, Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụtụtụ

Igbo Mass Readings for December 24 2024, Tuezde Izuụka nke Anọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị – Ụka ụtụtụ.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2023 (Soft copy)

X
Scroll to Top
error: Alert: Content is protected !!

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.