Igbo Mass Readings for February 14 2024, Wenezde Ntụ

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka February 14 2024, Wenezde Ntụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:12-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Joel

Isi Okwu: Gbawaanụ obi ụnụ; ụnụ adọwakwala uwe ụnụ.

Ọ bụ Onyenweanyị na-ekwu nke a: Ugbu a, ugbu a, werenụ obi ụnụ niile chegharịa lọghachi azụ n’ebe M nọ. Werenụ ibu ọnụ na ịkwa akwa na ịgba mkpe lọghachikwute M ugbu a.

Dọwaanụ obi ụnụ. Ụnụ adọwakwala akwa ụnụ. Tụgharịanụ chee Chineke ụnụ ihu ọzọ, n’ihi na ọ bụ onye obi ọma bụrụkwa onye obi ebere. Ọ naghị ewe iwe ngwa ngwa.

Obi ọma ya ebuka. Ọ dịkwa njikere ịtụgharị obi mee ebere. Onye ma, ma ọ bụ na Ọ gaghị atụgharịkwa obi ọzọ bịakwa mee ebere? E leghị anyị. Ọ ga-enye anyị ngọzi mgbe Ọ na-agafe ebe anyị na-achụnyere Onyenweanyị Chineke aja, na-enyekwa Ya onyinye.

Fụọ opi ike na Zayọn! Tie iwu ka e buo ọnụ. Kpọọ nnukwu ọgbakọ dị ebube. Kpọkọta ndị mmadụ ọnụ. Kpọọ ọha obodo oku. Kpọkọtachaa ndị okenye.

Kpọkọtachakwa ụmụ ntakịrị niile, ma ndị e ku n’aka, ma ndị na-añụ ara. Ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ si n’ime ụlọ ya pụta. Ka nwunye a lụrụ ọhụrụ sikwa n’ebe ndina ya pụta.

Ka ndị Ụkọchukwu, bụ ndị e chiri echi maka ịgbara Onyenweanyị odibo, site n’ọnụ ụzọ ụlọ ụka bere akwa ruo n’ebe nchụaja, na-asị: “Biko Onyenweanyị, e gbula ndị nke Gị!

E kwela ka agbụrụ Ị họtara ahọta ghọọ ihe mba ndị ọzọ ji akpa ọchị. E kwela ka ihere megbuo ndị nke Gị. N’ihi gịnị ka ndị mba ọzọ ga-eji ajụ sị: “Olee kwanụ Chineke ha?” Mgbe ahụ ka Onyenweanyị, Onye nwere anya ukwu maka ala nke Ya, ga-emere ndị nke Ya ebere.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 50:3-6, 12-14. 17 Az. 3

Azịza: Biko Onyenweanyị, meere anyị ebere n’ihi na anyị emeela njọ.

1. Chineke m, were obi ọma Gị meere m ebere,

were obi ebere Gị hichapụ njọ m niile.

Biko sachapụ m mmehie m.

Ghụchaa m njọ m. Azịza

2. N’ezie, amaara m mmehie m.

Njọ m niile guzoro m n’ihu mgbe niile.

Emehiela m Gị. Sọ Gị ka m mehiere.

Emeela m ihe rụrụ arụ n’ihu Gị. Azịza

3. Chineke m, kenye m obi dị ọcha.

Tinye mmụọ kwụdosiri ike n’ime m.

Achụpụkwala m n’ihu Gị.

A napụkwala m mmụọ Gị dị asọ. Azịza

4. Nyekwa m añụrị nke enyemaka Gị.

Were mmụọ nke obi na-anụ ọkụ kwalite m.

Onyenwe m, meghee egbugbere ọnụ m.

Ka ire m wee kwusaa otito Gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:20-6:2

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Meenụ ka ụnụ na Chineke kpezie. Ugbu a bụ oge amara.

Anyị bụ ndị ozi na ndị nnọchite anya Kristi. A gara asị na Chineke si n’ọnụ anyị na-akpọ ụmụ mmadụ. Ya mere, anyị na-arịọ ụnụ n’aha Kristi, ka ụnụ na Chineke kpezie, dị n’udo.

N’ihi na ọ bụ maka anyị ka Chineke jiri mee Onye ahụ na-emeghị njọ ọ bụla ka O buru njọ. O mere nke a iji mee ka anyị bụrụ ndị ezi omume nke Chineke n’ime Kristi.

Ma, ebe anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọkwa ụnụ ọzọ ka ụnụ ghara ikwe ka amara Chineke ụnụ natara laa n’iyii. N’ihi na Chineke kwuru sị: N’oge dị mma anụrụ M olu ụnụ. N’ụbọchị nzọpụta, abịara M nyere ụnụ aka. Lee, ugbu a, bụ oge ahụ dị mma. Taa bụ ụbọchị nzọpụta ahụ.

MBEKU – Abụọma 50:12.14

(Enwere ike ịhọrọ otu n’ime mbeku ndị a n’ụbọchị nkịtị ọ bụla nọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi) N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi tupu a gụọ mbeku ma ọ bụ mgbe a gụchara mbeku, e nwere ike ikwu nke ọ bụla n’ihe ndị a.

(a) Kristi, Eze dị ebube ruo mgbe ebighị ebi, otito dịrị Gị.

(b) Onyenweanyị Jesu, otito na ebube dịrị Gị.

(c) Kristi, ebube dịrị Gị. Ị bụ Okwu nke Chineke.

1. Chineke m, kenye m obi dị ọcha. Nyekwa m añụrị nke enyemaka Gị.

Abụọma 94:8

2. Ụnụ agbachikwala obi ụnụ taa. Ma geenụ ntị n’olu nke Onyenweanyị.

OZIỌMA – 6:1-6, 16-18.

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Isi Okwu: Nna ụnụ, Onye na-ahụ ihe a na-eme na nzuzo ga-akwụ ụnụ ụgwọ.

Jesu gwara ụmụazụ Ya, sị: “kpacharanụ anya ka ụnụ ghara ịrụ ọrụ eziomume ụnụ n’ihu mmadụ, naanị ka ha hụ, wee too ụnụ. Ọ bụrụ na ụnụ emee otu a, Nna ụnụ nke eluigwe agaghị akwụ ụnụ ụgwọ ọrụ.

“Ya mere, mgbe ọ bụla Ị na-enye onyinye ebere, a fụla opi, dị ka ndị ihu abụọ si eme, n’ụlọ nzukọ ha, na n’okporo ụzọ niile. Ha na-eme otu a, ka ndị mmadụ hụ, wee too ha.

N’ịgwa ụnụ ezi okwu: Ha enwezuola ụdị ụgwọ ọrụ kwesịrị ha. Ya mere, mgbe ọ bụla Ị na-enye onyinye ebere, e kwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-eme.

Kama mee ka ọ bụrụ onyinye I nyere na nzuzo. Nna gị Onye na-ahụ na nzuzo ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ. “Mgbe ọ bụla ụnụ na-ekpe ekpere, ụnụ emekwala ka ndị ihu abụọ, ndị ọ na-amasị ịkwụrụ ọtọ n’ime ụlọ nzukọ na n’akụkụ okporo ụzọ, ka ndị mmadụ wee hụ ha.

N’ịgwa ụnụ ezi okwu: Ha enwezuola ụdị ụgwọ ọrụ kwesịrị ha. Ma mgbe ọ bụla ị na-ekpe ekpere, banye n’ime ime ụlọ gị, mechie ụzọ, wee kpeere Nna gị Onye dị na nzuzo.

Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụghachi gị. “Ọzọ, mgbe ụnụ na-ebu ọnụ, ụnụ agbarụla ihu ụnụ, dị ka ndị ihu abụọ si eme. Ha na-agbarụ ihu ha, ka ha wee gosị ndị mmadụ na ha na-ebu ọnụ.

N’ịgwa ụnụ ezi okwu, ha enwezuola ụgwọ ọrụ kwesịrị ha. Ma, mgbe ị na-ebu ọnụ, tee isi gị ude, sakwaa ihu gị. Mee otu a, ka ndị mmadụ wee ghara ịma na ị na-ebu ọnụ. Naanị Nna gị Onye na-ahụ na nzuzo ga-ama na ị na-ebu ọnụ. Nna gị ahụ na-ahụ na nzuzo ga- akwụ gị ụgwọ ọrụ.

Igbo Mass readings for February 15 2024, Tọọzde na-eso Wednezde Ntụ.

Igbo Mass Readings for February 14 2024, Wenezde Ntụ.

Igbo Mass Readings for February 14 2024, Wednezde Ntụ
Igbo Mass Readings for February 14 2024, Wenezde Ntụ

Last Update: March 30, 2023