Igbo Mass Readings for Chrism Mass – March 28 2024 (Tọọzde)
Nke a bụ Igbo Mass Readings for Chrism Mass – March 28 2024 (Tọọzde)
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 61:1-3.6.8-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: Onyenweanyị eteela m mmanụ ka m butere ụmụ ogbenye Oziọma, ka m tee ha mmanụ añụrị.
E nyela m mmụọ nke Onyenweanyị, n’ihi na Onyenweanyị eteela m mmanọ. O zipụtala m ka m bugara ụmụ ogbenye Oziọma; ka m kechie obi gbawara agbawa; ka m kwupụtara ndị e ji eji na ha e nwerela onwe ha, bịakwa mee ndị e kere agbụ n’ụlọ mkpọrọ ka ha nwere onwe ha; ka m kwupụta afọ amara nke Onyenweanyị na ụbọchị Chineke anyị ga abọrọ onwe ya ọbọ.
O zipụla m ka m kasie ndị niile na-eru ụjụ obi, bịakwa were itube ha abụba ugo dechie anya ntụ; ka m were ite ha mmanụ añụrị dochie anya uwe mkpe ha; bịakwa nye ha ezigbo otito ebe obi jụrụ ha oyi.
Ma ụnụ n’onwe ụnụ, a ga-akpọ ụnụ “Ụkọchukwu nke Onyenweanyị”. Ha ga-akpọ ụnụ “Ụmụ odibo nke Chineke anyị.” Aga m akwụ ha ụgwọ kwesịrị ekwesị.
Mụ na ha ga-agbakwa ọgbụgba ndụ dị ebighị ebi. Agbụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama na mba niile. Ụmụ ụmụ ha ga-adị n’agbụrụ niile. Ndị ọ bụla hụrụ ha ga-ekweta na ndị a bụ agbụrụ Chineke gọziri agọzi.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 88:21-22, 25.27 Az. 2
Azịza: Onyenweanyị, aga m ekwe ukwe añụrị Gị ruo mgbe ebighị ebi.
1. Achọtala M nwodibo M bụ Devid,
bịakwa tee ya mmanụ nsọ.
Aka M ga-anọnyere ya mgbe niile.
Ogwe aka M ga-eme ka ọ gbasie ike. Azịza.
2. Eziokwu M na ịhụnanya M ga-anọnyere ya.
Ike ya ga-ala elu n’aha M.
Ọ ga-asị M: “Ị bụ Nna m, Chineke m, na nkume bụ nzọpụta m.” Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:5-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe
Isi Okwu: O meela anyị agbụrụ ndị eze na ndị Ụkọchukwu ga na-efe Chineke Nna anyị.
Ka amara sitekwara n’ebe Jesu Kristi nọ, onye sitere n’ikwesị ntụkwasị obi ya kpughe eziokwu a nye anyị, dịrị ụnụ. Ọ hụrụ anyị n’anya, bịakwa were ọbara Ya sachapụ njọ anyị.
O wee mee ka anyị bụrụ agbụrụ ndị eze na ndị Ụkọchukwu, ndị ga na-efe Chineke na Nna nke Ya. Ka ebube niile na ike niile dịrị Ya mgbe niile, ebighị ebi, ebighị ebi! Amen.
Lee Ya ka Ọ na-abịa n’urukpu! Onye ọ bụla ga-ahụ Ya. Ọ bụrụgodu ndị ahụ mara Ya ube, ha ga-esokwa hụ Ya. Agbụrụ niile dị n’ụwa ga-erukwara Ya ụjụ. Ọ ga-adị otu a! Amen.
Onyenweanyị Chineke, Onye ahụ dị adị, Onye ahụ dịkwarị na mbụ, Onye ahụ na-abịanụ, na Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru sị: “Abụ M Isi Mbido na Isi Njedebe”.
MBEKU – Luk 4:18
E nyela m mmụọ nke Onyenweanyị. O zitela m ka m bugara ụmụ ogbenye Oziọma.
OZIỌMA – 4:16-21
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: E nyela m mmụọ nke Onyenweanyị, n’ihi na O teela m mmanụ.
Jesu bịaruru Nazaret, nke bụ obodo a zụrụ Ya, wee banye n’ụlọ nzukọ ha, n’ụbọchị izuike, dịka Ọ dị mbụ eme. O biliri ịgụ ihe ọgụgụ. Ha weere akwụkwọ nsọ nke onye amụma Aịzaya dere nye ya n’aka. O wee meghee akwụkwọ ahụ, chọta ebe e dere sị:
“Mmụọ nke Onyenweanyị dakwasịrị M, n’ihi na O teela M mmanụ ka M zie ndị ogbenye Oziọma. O zipụtakwara m ikwusara ndị e ji eji n’agha na ha enwerela onwe ha. Na ịgwọ ndị isi ka ha hụwa ụzọ. Na ịtọhapụ ndị e ji n’ala ka ha nwere onwe ha. Na ikwusara ndị mmadụ afọ amara nke Onyenweanyị.”
O wee kpuchie akwụkwọ ahụ, nyeghachi ya onye na-eje ozi, nọdụ ala. Mmadụ niile nọ n’ụlọ nzukọ ahụ wee wụkwasị Ya anya n’ihu. O wee malite ịgwa ha okwu sị: “Taa, ka e mezuru na ntị ụnụ ihe e dere n’akụkụ ebe a m gụrụ n’ Akwụkwọ Nsọ.”
Igbo Mass readings for March 29 2024, Ezi Fraịdee
Igbo Mass Readings for Chrism Mass – March 28 2024 (Tọọzde)