Igbo Mass Readings for January 2 2024 – Tuzde

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 2 2024 – Tuzde (Ncheta Basil the Great na Gregory nke Nazianzen di asọ, ndị bishọp na Dọktọ nke ụka).

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:22-28

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi mbụ nke Jọn

Onye bụ onye ụgha? Ọ bụ onye na-ekwu na Jesu abụghị Kristi. Onye dị otu a bụ onye na-emegide Kristi. Ọ na-agọnarị Nna na Nwa. Onye ọbụla na-agọnarị Nwa, enweghịkwa Nna n’ime ya.

Onye ahụ nke na-ekwupụta Nwa, na-ekwupụtakwa Nna. Meenụ ka ihe ụnụ nụrụ na mbido biri n’ime ụnụ. Ọ bụrụ na ihe ụnụ nụrụ site na mbido ebiri n’ime ụnụ, mgbe ahụ, ụnụ ga-ebi n’ime Nwa na n’ime Nna.

Nke a bụ nkwa o kwere anyị, ndụ ebighịebi. Ana m edere ụnụ nke a maka ndị ga-eduhie ụnụ. Otite mmanụ nke ụnụ siri n’aka ya nweta na-adị n’ime ụnụ, ọ dịghịkwa mkpa ọzọ na onye ọbụla ga-akụziri ụnụ.

Ebe ọ bụ na otite mmanụ ya kụziiri ụnụ banyere ihe niile, ọ bụ ezie, ọ bụghị ụgha. Ebe ọ bụ eziokwu, nọgidekwanụ n’ime ya. Ugbu a ụmụ ntakịrị, nọgidenụ n’ime ya, ka ọ ga-abụ mgbe ọ pụtara ihè, anyị enwee ntụkwasịobi, ghara iji ihere pụọ n’ihu ya mgbe ọ ga-abịa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98: 1, 2-3, 3-4.

Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.

1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,

n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ebube,

aka nri ya na aka ya dị nsọ eweterela ya mmeri. Azịza

2. Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya,

o meela ka mba niile mata eziomume ya.

O chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya

n’ebe ezinụụlọ Izrel nọ. Azịza

3. Akụkụ ụwa niile ahụla,

nzọpụta nke Chineke anyị.

Ụwa niile tierenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ.

Were ukwe na mkpu ọñụ too ya. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Okwu ahụ bụụrụ mmadụ wee binyere anyị. Ma ndị niile nabatara ya, ka o nyere ike ịbụ ụmụ nke Chineke.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 1:19-28.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Nke a bụ akaebe nke Jọn gbara; mgbe ndị Juu siri na Jerusalem zigaara ya ndị nchụaja na ndị Levaị, ka ha jụọ ya sị, “Onye ka ị bụ? Jọn kwuru eziokwu, Ọ gọghị agọ, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kristi ahụ.”

Ha jụrụ ya sị, “Onyezi ka ị bụ? Ị bụ Elaija?” Jọn zara sị, “Abụghị m ya.” Ha jụkwara ya sị, “Ị bụ onye amụma ahụ?” Ọ zara sị “Mba.” Ha sịrị ya, “Onye ka ị bụ?” Gwa anyị ka anyị nwee ihe anyị ga-agwa ndị zitere anyị.

Gịnị ka I nwere ikwu banyere onwe gị?” Ọ sịrị, “Abụ m olu nke ahụ na-eti mkpu n’ime ọzara sị, ‘Meenụ ụzọ nke Osebụrụwa ka ọ kwụrụ ọtọ,’ dịka onye amụma Aịzaya siri kwuo.”

Ha bụ ndị, ndị Farisii zitere. Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere I ji eme ndị mmadụ mmirichukwu ma ọ bụrụ na ị bụghị Kristi ahụ ma ọ bụ Elaịja, Ị bụghịkwa onye amụma ahụ?”

Jọn zara ha sị, ‘Eji m mmiri eme mmirichukwu ma otu onye nọ n’etiti ụnụ, onye ụnụ na-amaghị. Ọ na-esochi m n’azụ, onye mụ na-etosịghị ike ịtọghe eriri akpụkpọụkwụ ya.” Ihe a mere na Betani n’ofe Jọdan, ebe Jọn nọ na-eme mmirichukwu.

Igbo Mass Readings for January 3 2024 – Wenezde

Igbo Mass Readings for January 2 2024 – Tuzde

Last Update: May 30, 2021