Igbo Mass Readings for January 3 2024 – Wenezde
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 3 2024 – Wenezde.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2: 29, 3:1-6.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ ozi mbụ Jọn
Ọ bụrụ na ụnụ ma na ọ bụ onye eziomume, ụnụ aghaghịkwa ịma na onye ọbụla na-eme eziomume bụ nwa ya. Lee ụdị ịhụnaanya Nna gosiri anyị, na a ga-akpọ anyị ụmụ nke Chukwu.
Ọ bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị, bụ n’ihina ọmaghị Nna ahụ. Ma ugbu a, ndị m hụrụ n’anya, anyị bụ ụmụ Chineke. Ihe anyị ga-abụ n’ọdịniihu apụtabeghị ihe.
Kama, anyị maara na mgbe ọ ga-apụta ihè, anyị ga-adị ka ya, n’ihi na anyị ga-ahụ ya otu ọ dị. Onye ọbụla nwere nchekwube dị otu a ga-edobe ndụ ya ọcha dịka Kristi si dị ọcha.
Onye ọbụla nke na-eme njọ, ikpe ọmụma mmebi iwu ji ya. Njọ bụ mmebi iwu. Ụnụ maara na Kristi bịara ikpochapụ njọ, o nweghịkwa njọ dị n’ime ya. O nweghị onye ọbụla bi n’ime ya na-eme njọ. O nweghịkwa onye ọbụla na-eme njọ hụrụla ya anya ma ọ bụ mara onye ọ bụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98: 1, 3-4, 5-6.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ebube,
aka nri ya na aka ya dị nsọ,
eweterela ya mmeri. Azịza
2. Akụkụ ụwa niile ahụla,
nzọpụta nke Chineke anyị.
Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ,
werenu ukwe na mkpu ọñụ too ya. Azịza
3. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe,
werenụ ụbọ akwara na ihe egwu dị iche- iche tiere Onyenweanyị egwu!
Weerenụ opi igwe na mpi,
kwupụta na Onyenweanyị bụ eze. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
N’oge ochie Chineke sitere n’ụzọ dị iche-iche gwa nna anyị ha okwu site n’ọnụ ndị amụma, n’ọgwụgwụ oge ndị a, ọ gwala anyị okwu site na nwa ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 1: 29-34.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
N’ụbọchị nke ọzọ Jọn hụrụ Jesu ka ọ na-abịa n’ebe ọ nọ, ọ sị, “Lee nwaatụrụ nke Chukwu onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa! Ọ bụ ya bụ onye m kwuru maka ya sị, “Onye na-esote m kariri m, n’ihi na o bu m ụzọ dịrị.
Mụ onwe amabughị ya, mana ọ bụ n’ihi nke a ka m ji bịa na-eme mmirichukwu iji kpugheere ya ụmụ Izrel.” Jọn gbara aka ebe sị, “Ahụrụ m mmụọ nsọ ka o si n’eluigwe fedata n’ụdị nduru nọgide n’ahụ ya.
Mụ onwe m amabughị ya, ma onye ahụ zitere m iji mmiri na-eme mmirichukwu gwara m sị, ‘Onye ọbụla ị hụrụ Mmụọ Nsọ ka o fekwasịrị nọgidekwa n’ahụ ya bụ onye ahụ nke m ga-eji Mmụọ Nsọ na-eme mmirichukwu’. Ugbu a, ahụla m ya ma gbaa akaebe na ọ bụ nwa nke Chineke.”
Igbo Mass Readings for January 4 2024 – Thursday
Igbo Mass Readings for January 3 2024 – Wenezde