Connect with us
JUMIA TECH WEEK

Igbo Christmas Daily Readings

Igbo Mass Readings for January 6 2024 – Satọde

Published

on

Igbo Mass Readings for January 6 2024 – Satọde

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 6 2024 – Satọde.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:5-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Jọn nke mbụ

Onye bụ onye na-emeri ụwa ma ọ bụghị onye kwere na Jesu Kristi bụ Nwa nke Chukwu? Nke a bụ onye sitere na mmiri na ọbara bịa. Ọ bụghị naanị mmiri ka o ji bịa, kama, o ji mmiri na ọbara.

Mmụọ ahụ bụ onye akaebe, n’ihina ọ bụ eziokwu. E nwere ndị akaebe atọ. Mmụọ, mmiri na Ọbara; ha atọ kwekọrịtakwara n’otu. Ọ bụrụ na anyị na-anabata akaebe nke mmadụ, akaebe nke Chineke bụ ezi akaebe karịa.

Akaebe nke Chineke bụkwa nke ọ gbara banyere Nwa ya. Onye kwere na Nwa nke Chineke, nwere akaebe ahụ n’ime ya. Ma onye na ekwenyeghị n’akaebe ahụ, emeela Chineke onye ụgha, n’ihina o kwenyeghị n’akaebe Chineke gbara gbasara Nwa ya.

Advertisement

Akaebe ahụ bụ nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighịebi. Ndụ a dị na Nwa ya. Onye nwere Nwa ahụ nwere ndụ. Onye na-enweghi Nwa nke Chukwu, enweghị ndụ. Ana m edere ụnụ ihe ndị a, ụnụ ndị kwere n’aha nwa nke Chukwu; ka ụnụ mara na ụnụ nwere ndụ ebighịebi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 147:12-13, 14-15, 19-20.

Azịza: Jerusalem too Onyenweanyị.

1. Jerusalem too Onyenweanyị,

Zayọn too Chineke gị,

n’ihi na ọ bụ ya mere ọnụ ụzọ,

Advertisement

ama gị niile ka ha sie ike,

ọ na-agọzi ụmụ gị niile. Azịza

2. Ọ na-enye gị udo n’oke ala gị niile,

ọ na-eji ọka nke kacha mma azụ gị nri.

Ọ na-etiri ụwa iwu,

Advertisement

okwu ya agazuo ụwa niile ọsọọsọ. Azịza

3. Ọ na-ekpughere ụmụ Jekọb okwu ya,

na-egosikwa ụmụ Izrel iwu ya na ikpe ya.

Ọ naghị emere mba ndị ọzọ otu a,

ọ naghị akụziri ha iwu ya. Alleluia. Azịza

Advertisement

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

N’oge ochie, Chineke sitere n’ụzọ dị iche-iche gwa nna anyị ha okwu site n’ọnụ ndị amụma, n’ọgwụgwụ oge ndị a, ọ gwala anyị okwu site na Nwa ya.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 1:7-11.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jọn kwusara sị, “Onye ka m ike na-abịa na azụ m, onye m na etosighị ịhụlata ala tọpụ eriri akpụkpụ ụkwụ ya. Eji m mmiri mee ụnụ mmirichukwu, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee ụnụ mmirichukwu.”

Advertisement

N’oge ahụ Jesu siri n’obodo Nazaret nke Galili bịa. Jọn mere ya mmirichukwu na osimiri nke Jọdan. Ma mgbe Jesu si na mmiri pụta, ozigbo ahụ ọ hụrụ eluigwe ka o meghere.

Ọ hụkwara Mmụọ Nsọ ka ọ na-efedakwasi ya dịka nduru. Otu olu si n’eluigwe bịa sị, “Ị bụ Nwa m, m hụrụ n’anya ihe gị dị m ezi mma.”

Igbo Mass Readings for January 7 2024, Nleta nke Ndịeze Atọ si Ọwụwa Anyanwụ

Igbo Mass Readings for January 6 2024 – Satọde

Advertisement
Continue Reading
Advertisement

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.