Igbo Mass Readings for January 7 2034 – Satọde tupu Epifani

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 7 2034 – Satọde tupu Epifani.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:14-21

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Jọn nke mbụ

Nke a bụ ntụkwasịobi anyị nwere na ya, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka uche ya si dị, Ọ na-ege anyị ntị. Ọ bụrụ na anyị ma na Ọ na-ege anyị ntị n’ihe ọbụla anyị rịọrọ, anyị amara na anyị enwetala ihe niile anyị rịọrọ ya.

Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ nwanne ya ka ọ na-eme obere njọ, ọ ga-arịọrọ ya arịrịọ, Chineke ga-enye nwanne ya ahụ ndụ, maka na njọ ahụ abụghị njọ ogbugbu. Enwere njọ nke bụ nnukwu njọ.

Anaghị m ekwu ka mmadụ kpee ekpere maka nke ahụ. Omume niile na-ezighị ezi bụ njọ. Mana e nwere nke na-abụghị nnukwu njọ. Anyị ma na onye ọbụla a mụrụ na Chineke anaghị eme njọ, n’ihina Kristi Nwa nke Chukwu na-echekwa ya.

Onyeiro ahụ anaghị emetụ ya aka. Anyị ma na anyị bụ ndị nke Chineke, mana ụwa niile nọ n’ike nke ajọ onye ahụ. Anyị makwa na Nwa nke Chukwu abịala, o nyekwara anyị nghọta ịmata onye ahụ bụ Eziokwu.

Anyị nọkwa n’ime onye ahụ bụ Eziokwu, n’ime Nwa ya bụ Jesu Kristi. Nke a bụ ezi Chineke ahụ na ndụ ebighịebi. Ụmụntakịrị, zerenụ ikpere arụsị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 149:1-2, 3-4, 5, 6, 9.

Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.

1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,

ka ọgbakọ ndị kwere na ya kweere ya ukwe otito.

Ka Izrel ñụrịa na ihi onye kere ya,

ka ụmụ Zayọn ñụrịa na ihi onye eze ha. Azịza

2. Ka ha were ịgba egwu too aha ya,

ka ha were ịgba na ụbọ akwara gbaara ya egwu.

N’ihina Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ,

O kpubela ndị umeala okpu nke mmeri. Azịza

3. Ka ndị nke ya ñụrịa na mmeri ha.

Ka ha daa n’ala n’ihu Chineke, na-eto ya oge niile.

Ka nnukwu ukwe otito Chineke jupụta n’ọnụ ha,

nke a bụ otito nke ndị nke ya kwere ekwe. Alleluia!. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Ụbọchị dị asọ adakwasala anyị, Mba niile bịa sekpuoru Dinwenụ. Taa nnukwu ihe achakwasala anyị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 2:1-12

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

N’ụbọchị nke atọ e nwere oriri agbamakwụkwọ na Kena nke dị na Galili, nne Jesu gakwara ebe ahụ. E zikwara Jesu na ndị na-eso ụzọ ya n’oriro agbamakwụkwọ a.

Mgbe mmanya gwụchara nne Jesu sịrị ya, “Ha enweghịzi mmanya.” Jesu zara ya sị, “Nwaanyị, olee ụzọ nke a si gbasa mụ na gị? Oge nke m erubeghị.” Nne ya gwara ndị na-eje ozi sị, “Meenụ ihe ọbụla ọ sị ụnụ mee.

Dịka omenaala ịsa ụkwụ na aka nke ndị Juu siri dị, ite mmiri nkume isii dọrọ n’ebe ahụ. Nke ọbụla n’ime ha na-eri ihe dịka udu mmiri iri abụọ ma ọ bụ iri atọ. Jesu gwara ha sị, “Gbajupụtanụ ha n’ọnụ.”

Ọ sịrị ha, “Ngwa gbapụtanụ ụfọdụ bugara onye isi oriri.” Ha mere nke a. Mgbe onye isi oriri detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ bụrụ mmanya ọnụ, ọ maghị ebe o si pụta.

(Ma ndị na-eje ozi, ndị gbapụtara mmiri ahụ, maara ebe o si). Ọ kpọrọ onye na-alụ nwaanyị, sị ya, “Onye ọbụla na-ele ọbịa, na ebu ụzọ bupụta mmanya dị ụtọ.

Mgbe ndị mmadụ ñụjuchara afọ ha, o bupụtazie nke na-adịghị mma. Ma gị onwe gị hapụrụ ibute mmanya dị ụtọ ruo ugbu a.” Nke a bụ ọrụ ebube nke mbụ n’ime ọrụ ebube ya niile.

Ọ bụ na Kena nke Galili ka ọ rụrụ ya. O gosipụtara ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwekwara na ya. Mgbe nke a gachara, Jesu gbadara na Kapanaum, ya na nne ya, ụmụnne ya na ndị na-eso ụzọ ya. Ha nọrọ ebe ahụ ụbọchị olemaole.

Igbo Mass Readings for January 8 2034, Nleta nke Ndịeze Atọ si Ọwụwa Anyanwụ

Igbo Mass Readings for January 7 2034 – Satọde tupu Epifani

Last Update: June 6, 2021