SATURDAY: IZU UKA NKE ASAA N’OGE MBILITE N’ONWU KRISTI.

Ihe Ogugu nke mbu – 28:16-20, 30-31
Ihe ogugu ewetara n’Oru Ndiozi
Ka anyi biaruru Rom, ochi agha kwenyere ka Pol biri iche, ya na otu onye agha nke na eche ya nche. Ka ubochi ato gachara, Pol kporo ndi isi nke ndi Juu, ndi bi na Rom, nzuko. Oge ha zukoro, o gwara ha si: “Umunne m! N’eziokwu odighi ihe ojoo obula m mere megide ndi Juu, ma o bu megide omenaala anyi natara n’aka nnanna anyi ha. Ha jidere m na Jerusalem, mee ka m buru onye mkporo, harakwa m nye n’aka ndi Rom.
Oge ha kpechara m ikpe ha choro ihapu m ka m laa, n’ihina ha choputara na o dighi ihe kwesiri onwu m mere. Ma mgbe ndi Juu ekwetaghi nzube ha o dighikwa ihe ozo m maara m ga-eme karia įkpoku Siza, eze Rom. Mgbe ha na-ekwu nke a, o bughi ebubo ka m na-ebogide obodo m. N’ihi nke a, ka m ji choo, riokwa, ka m hu unu anya gwa unu okwu, n’ihina o bu ihi olile anya nke Izrel ka e ji kee m agbu a.’ Pol biri na Rom afo abuo zuru oke n’otu ulo. O na-akwu ugwo n’onwa n’onwa na ya. N’ebe ahu, o na-anabata nke oma ndi niile biara ileta ya. O jikwa nkwuwa okwu, n’asoghi anya na-ekwusa maka alaeze Chineke, na-akuziri ndi mmadu maka Onyenweanyi Jesu Kristi. O dighikwa onye obula na egbochi ya.

ABUOMA NA AZIZA – Ps: 11: 4, 5, 7.
Aziza: Ndi eziomume ga-ahu ihu gi anya O Onyenweanyi.

  1. Onyenweanyi no n’ulo nso ya, Onyenweanyi onye ocheeze ya di n’eluigwe; O na-eledata anya n’uwa. O na-elezukwa mmadu niile. Az./
  2. Onyenweanyi na-enyocha ma ndi eziomume ma ndi ojoo, O na-akpokwa onye obula huru mmegbu na ogu n’anya asi. Az./
  3. Onyenweanyi bu onye eziomume, O hukwara eziomume n’anya, ndi eziomume niile ga-ahu ihu ya anya. Az./

ALLELUIA ALLELUIA:
Mmuo Nso ahu ga-akuziri unu ihe niile, ma chetakwara unu ihe niile m kwuru.
ALLELUIA.
OZIOMA – 21: 20-25.
Ihe ogugu ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere:
Pita tughariri hu onye ahu na-eso uzo Jesu bu onye o huru n’anya ka o na-eso ya n’azu. O bu onye ahu dabeere n’akukų Jesu na nri anyasi ahu wee juo ya si, “Onyenweanyi, onye ga-arara gi nye?” Mgbe Pita huru ya o juru Jesu si, “Onyenweanyi kedu maka onye a?” Jesu siri ya, “O buru na m choo ka o nogide ruo mgbe m ga abia ozo, ogbasara gi?” Sobe m! Akuko a gbasara n’etiti umunna n’ime Kristi na onye ahu na-eso uzo Jesu agaghi anwu. Kama o siri, “O buru na m choo ka o nogide ruo mgbe m ga-abia ozo, o gbasara gi?” O bu onye ahu na-eso uzo Jesu gbara akaebe banyere ihe ndi a. O bu ya dekwara ihe ndi a. Anyi ma na akaebe ya bu eziokwu. E nwekwara otutu ihe ndi ozo Jesu ruru. O buru na edebe ha niile n’Akwukwo, O dighi m ka uwa niile o ga-aba akwukwo aga-ede ya.

Share with a friend