TUESDAY: IZU UKA NKE ISII N’OGE MBILITE N’ONWU KRISTI.

Ihe Ogugu nke mbu – 16:22-34
Ihe ogugu ewetara n’Oru Ndiozi

Igwe mmadu ndi ozo, ndi Filipi, biliri sonye imegide ha. Ndi ikpe ahu dowara uwe Pol na Sailas, nye ikikere ka apia ha utali. Mgbe ha tichara ha ihe, ha tubara ha n’ulo mkporo, nye onye nche ulo mkporo iwu, ka o chesie ha ike, ka ha ghara ipu. Mgbe onye nche ahu natara iwu nke a, o tunyere ha n’ime ime ulomkporo, kposie ha iga ike n’ukwu. N’etiti abali, Pol na Sailas no n’ekpere, na ekwe ukwe otito nye Chineke.
Ndi mkporo ndi ozo nokwa na-ege nti, na mberede enwere oke ala oma jijiji, nke a mere ka ntoala ulo mkporo ahu maa jijiji. Ngwa ngwa onuuzo niile meghere, agbu ndi mkporo niile topukwara. Onye nche ulo mkporo tetara hu na onuuzo niile nke ulo mkporo ghe oghe. O chere na ndi mkporo niile agbalagala. O miputara mmaagha ya, ka o gbuo onwe ya. Ma Pol tiri mkpu n’oke olu si, “Emerula onwe gi ahu! Anyi niile no n’ebe a!” O kporo ka eweta oku. O mabara n’ime, daa n’ukwu Pol na Sailas na-ama jijiji. O kpoputara ha, na-aju ha si, “Ndi nwe mmadu. Gini ka m ga-emenu ka m wee nweta nzoputa?” Ha zara ya si: “kwere n’Onyenweanyi Jesu, a ga-azoputa gi na ezinuulo gi.” Ha gwara ya na ndi niile no n’ezinuulo ya okwuchukwu. N’otu elekere ahu, n’abali ahu, onye nche ulo mkporo ahu kpooro ha sachaa onya nke ihe e tiri ha. N’atufughi oge, ha mere ya na ezinuulo ya mmirichukwu. O kporo Pol na Sailas banye n’ulo ya, nye ha ihe oriri. Ya na ezinuulo ya niile juputara n’onu, n’ihi na ha aburula ndi kwere na Chineke.

ABUOMA NA AZIZA: Ps: 138:1-2, 2-3, 7-8.

Aziza: Aka nri gi ga-emere m ihe niile Onyenweanyi.

Flash Sales
  1. Eji m obi m niile na-ekele gi Onyenweanyi. n’ihina I nula ekpere m! N’ihu ndi mmuoozi niile aga m ekwere gi ukwe; Aga m akpo isiala n’ulo nso gi. Az/
  2. N’ihi ihunaanya na ikwudosiike gi, n’ihina aha gi na nkwa gi kacha di elu. N’ubochi m kpokuru gi, I zara m mekwaa ka ike m bawanye. Az./
  3. Aka nri gi ga-emere m ihe niile Onyenweanyi Chineke! ihunaanya gi na adi ebeebe. Ahapukwala anyi ndi I kere. Az/

ALLELUIA ALLELUIA:
Kristi bilitere n’onwu, ma mee ihe niile ka o di ohuru. O gosila ebere ya n’ebe mmadu no.
ALLELUIA.

OZIOMA – 16: 5-11.
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Jon dere:
Jesu gwara ndi na-eso uzo ya si: “Ugbu a ana m alakwuru onye zitere m. O dighi onye n’ime unu juru m si, Olee ebe I na-eje? N’ihina agwala m unu ihe ndi a, obi unu juputara n’ihe mwute. Ka o sila di, ana m agwa unu eziokwu; O bu maka odimma nke unu ka m ga-eji ala, n’ihina o buru na m alaghi, onye ntasiobi ahu agaghi abiakwute unu. Ma o buru na m laa aga m ezitere unu ya. Mgbe o biara, o ga-ata uwa uta banyere mmehie, eziomume na ikpe. O ga-ama ha ikpe mmehie n’ihi na ha ekwenyeghi na m. O ga-ama ha ikpe eziomume n’ihi na ana m alakwuru Nna m, unu agaghi ahukwa m ozo. O ga-akowara ha banyere ikpe Chineke, n’ihina ekpeela onye na-achi uwa a ikpe.

error: Alert: Content is protected !!

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.