WEDNESDAY: IZU UKA NKE ISII N’OGE MBILITE N’ONWU KRISTI.
Ihe Ogugu nke mbu – 17:15, 22-34; 18:1
Ihe ogugu ewetara n’Oru Ndiozi
Ndi dupuru Pol kporuru ya n’obodo Atens, tupu ha alaghachi na Beroa. Mgbe ha na-ala Pol ziri ha ozi ka Sailas na Timoti gbaa mbo, biakwute ya osooso. Pol guzoro n’etiti nzuko Ariopagus wee si: “Ndi Atens! Achoputara m na n’uzo obula na unu na-ekpere chi di iche-iche. N’ihi na ka m na akpaghari n’obodo unu, ahuru m ihe niile unu ji efe chi unu; ahuru m otu ebe ekwuaja nke e dekwasara n’elu ya, ihe e nyere chi nke amaghi ama. Chi ahu unu na-ekpere na-amaghi ama ka m na ekwusara unu. Chineke onye kere uwa na ihe niile di n’ime ya, bu Chineke nke eluigwe na uwa. O naghi ebi n’ulo arusi nke mmadu mebere, Ọ dighi anara ije ozi n’aka mmadu dika aga asi na o nwere ihe koro ya, n’ihina ya onwe ya na enye mmadu niile ndu, ume na ihe niile. O sitere n’aka otu onye, bu mmadu mbu ahu, kee agburu niile nke mmadu n’otu n’otu, ka ha biri n’elu uwa dum. O jiri aka ya na mbu kewachaa oge ogbo obula na ndudugandu obula, ga-achidebe. O kewakwara oke ala n’etiti mba na mba, Chukwu kere ihe ndi a niile, ka umu mmadu choba ya. O bu n’obi na, eleghi anya, o ga-adi ha mkpa, icho Chineke chota ya. Ma otu o di Chineke no onye obula n’ime anyi nso, n’ihina ‘N’ime ya ka anyi na-adi ndu, na-agaghari, na-adikwa;’ o buladi ufodu n’ime unu ndi na-ede abu, ekwuola otu udi okwu ahu si, ‘N’eziokwu, anyi bukwa umu ya.’ Ebe anyi bu umu Chineke, o kwesighi ka anyi na-eche na Chineke yiri ihe e jiri olaocha ma o bu olaedo, ma o bu nkume ruo, oru aka nke mmadu cheputara n’obi ya. Chineke lefuru anya n’oge niile nke amaghi ihe. Ma ugbu a o na-enye mmadu niile iwu n’ebe niile, ka ha niile chegharia. N’ihina o weputara otu ubochi mgbe o ga-eji eziomume kpee uwa niile ikpe, site n’aka otu nwoke o hoputara. O nyela mmadu niile ihe ha ga-eji kwere nke a, site n’ime ka o si n’onwu bilie.” Mgbe ha nuru ihe banyere mbilite n’onwu, ufodu n’ime ha jiri ya mee ihe ochi. Ufodu siri: “I ga-akorọ anyi akuko a ubochi ozo.” Nke a mere Pol jiri si n’etiti ha puo. Ma ufodu ndi mmadu sonyere ya ma kwere, ufodu n’ime ha bu Diyonishus, onye Ariopagus, ya na otu nwaanyi a na-akpo Damaris, na ndi ozo. Mgbe ihe ndi a gachara, o siri n’Atens puo gaba Korint.
ABUOMA NA AZIZA – Ps:148:1-2, 11 12, 13, 14.
Aziza: Eluigwe na uwa juputara na otito gi, Onyenweanyi.
- Si n’eluigwe too Onyenweanyi, toonu ya n’ebe kacha elu. Toonu ya ndi mmuoozi ya niile, toonu ya, igwe ndi agha ya niile. Az/
- Ndi eze niile no n’uwa, na mba niile; umu ndi eze niile, na ndi ochichi no n’ime uwa.
Umu okorobia na umu agboghobia, ndi okenye nakwa umu ntakiri. Az./ - Ka ha niile too aha Onyenweanyi, n’ihi na sooso aha ya di omimi, ebube ya kariri eluigwe na uwa. Az./
- O na-ewelite ike nke ndi nke ya, maka otito ndi ya di nso, nke umu Izrel bu ndio huru n’anya. Az./
ALLELUIA ALLELUIA:
Anyi maara na Kristi ebilitela n’onwu, eze nke mmeri bia nonyere anyi.
ALLELUIA.
OZIOMA – 16: 12-15.
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Jon dere:
Jesu gwara ndi na-eso uzo ya si: “Enwekwara m otutu ihe ndi ozo m ga-agwa unu, ma unu agaghi anabatali ha ugbu a. Mgbe Mmuo nke eziokwu ahu biara, O ga-eduba unu n’eziokwu niile. Qgaghi ekwu n’ike aka ya, ma o ga-ekwu ihe niile o nuru, kokwara unu ihe gaje ibia. Oga enyekwa m otito, n’ihi na o ga-esite n’aka m nata iheo ga-akoro unu. Ihe niile Nna m nwere bu nke m. Nke a ka m ji si na Mmuo Nso ga-esite n’aka m nata ihe o ga-akoro unų.