Igbo Mass Readings October 9 2020, Fraịde Izu Iri Abụọ na Asaa n’Oge Adanyeghị n’Emume.
Page Contents
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ 3:7-14
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndi Galeshịa.
Ya bụ, ụnụ ahụla na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Abraham. Akwụkwọ Nsọ buru ụzọ hụ na Chineke ga-esite n’okwukwe gụọ ndị mba ọzọ na ndị eziomume.
N’ihi nke a, akwụkwọ Nsọ bur ụzọ zie Abraham oziọma sị, “Chineke ga-agọzi mba niile nke ụwa site n’aka gị.
N’otu aka ahụ, Chineke ga-agọzi ndị niile kwere dịka o si gọzie Abraham. Ndị niile tụkwasara obi n’ọrụ nke iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ, n’ihina e dere ya n’akwụkwọ nsọ sị onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye anaghị emezu ihe e dere n’akwụkwọ iwu.
Ugbu a, o weela anya na Chineke anaghị agụ onye ọbụla n’onye eziomume site naanị n’idobe iwu, n’ihina Akwụkwọ Nsọ kwuru sị Onye Chineke si n’okwukwe ya gụọ n’onye eziomume ga-adị ndụ; mana ọ bụghị n’iwu ka okwukwe dabeere, kama Onye ọbụla na-emezu ihe ọbụla iwu kwuru ga-esite na ya dị ndụ.
Kristi agbapụtala anyị site n’ịbụ ọnụ nke iwu na-eweta, site n’ịbụ onye a bụrụ ọnụ maka anyị: n’ihina e dere sị, “onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ bụ onye koro n’elu osisi.”
Jesu Kristi mere nke a ka ngọzi ahụ Chineke nyere Abraham rute ndị mba ọzọ aka, o mekwara nke a ka anyị wee nweta nkwa nke Mmụọ Nsọ site n’okwukwe.
ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 111:1-2, 3-4, 5-6.
Azịza: Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe ebeebe.
- Eji m obi m niile enye Onyenweanyị ekele,
n’ọgbakọ ndị eziomume.
Ọrụ Onyenweanyị niile dị ịtụnanya,
ndị niile ọ na-amasị kwesịrị ilekwasa ya anya. Azịza.
2. Ọrụ niile ọ na-arụ jupụtara n’otiti na ebube
eziomume ya enweghị ike ịgbanwe agbanwe
Ọ na-ekwe ka anyị na-echeta ọrụ ebube ya.
Onyenweanyị dị ebere dị obiọma. Azịza.
3. Ọ na-enye ndị na-atụrụ ya egwu nri
Ọ naghị echezọ ọgbụgbandụ ya.
Ọ na-echetara ndị nke ya ike ọ na-akpa
site n’inye ha oke mba ndịọzọ. Azịza.
MBEKU Ps. 95:8
Alleluịa, Alleluịa:
Taa, Ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
Alleluịa.
Oziọma maka October 9, 2020 – Luk 11:15:26
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ugbu a, Jesu na-achụpụ otu ajọ mmụọ nke dara ogbi; mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hapụrụ, nwoke ogbi ahụ kwuru okwu, nke a tụrụ ndị mmadụ n’anya.
Ma ụfọdụ n’ime ha kwur sị, “Ọ na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul, onyeisi ndị mmụọ ọjọọ,” ma ndịọzọ, iji nwalee ya chọọrọ n’aka ya ihe ama nke si n’igwe.
Ebe ọ bụ na Ọ ma ihe ha na-eche Ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla nke kewaranụ megide onwe ya ga-adakpọ, ụlọ ọbụla nke dagidere ibe ya na-adakpọ.
Ọ bụrụ na Ekwensu ekewakwa megide onwe ya, kedụ ka alaeze ya ga-esi kwụdo? Ụnụ na-asị na-ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul.
Ọ bụrụ na m na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul, site n’ike onye ka ụmụ ụnụ na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe ụnụ.
Ma, ọ bụrụ na ọ bụ site na mkpisi aka nke Chineke ka m na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, matanụ na alaeze Chineke abịakwasịla ụnụ.
Mgbe dike ji ngwaagha na-eche obi ya, ọ dịghị mfe izute ihe o ji biri. Ma mgbe onye ka ya ike bịara megide ya, wee merie ya, ọ na-anara ya ihe agha ya niile, bụ ihe ntụkwasịobi ya, kesaara ndị otu ya ihe ọ kwatara n’ụlọ dike ahụ.
Onye na-anọnyereghị m, na-emegide m; onye ọbụla na-adịghị eso ekpokọta ekpokọta na-ekposa ekposa.
Mgbe mmụọ ọjọọ siri n’ime onye o ji pụọ, ọ na-akpagharị n’ala kpọrọ nkụ na-achọ ebe izuike.
Mgbe ọ chọchara ma ọ chọtaghị, ọ na-ekpebi n’obi ya sị, ‘Aga m alaghachi n’ụlọ m ebe m si pụta.’ Mgbe o chighatara, ọ hụ na a zachaala ụlọ ahụ dozie ya nke ọma.
Ọ na-apụ, kpọta ndị mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị ka ya nwee obi ọjọọ, tinyere ya onwe ya, ha na-abata biri n’ebe ahụ. Ọnọdụ ikpeazụ nke onye ahụ adị njọ karịa nke mbụ.
IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings October 8 2020, Tọọzdee Nke Izu Iri Abụọ na Asaa Oge Adanyeghị n’Emume
IHE ỌGỤGỤ ECHI: Igbo Mass Readings October 10 2020, Satọde Izu Iri Abụọ na Asaa n’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings October 9 2020, Fraịde Izu Iri Abụọ na Asaa n’Oge Adanyeghị n’Emume.
Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings