Igbo Mass Readings for December 31 2021, Ezinuulo Di Aso

EKPERE MMEGHE
Chineke anyi, I gosila anyi ukpuru chara acha nke ezinuulo di nso ka o buru ihe kwesiri nnomi. Anyi na-ario Gi, biko site n’obioma Gį, were udo nke eziomume na jhunaanya jikoo ezinuulo obula bi na nkewa. Ka ezinuulo anyi biri n’udo na onu nke ga-amitara anyi mkpuru nke ndu ebighi ebi. Site na Dinwenu anyį Jesu Kristi …

Ihe ogugu nke mbu: 3:2-6, 12-14.

Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo Sirak:
Makana Yahweh enyela nna ike n’ebe umu ya no; tinyerekwa umu iwu ka ha na-asopuru nne ha. Onye obula na-asopuru nna ya na-akwukwa ugwo njo ya. Onye na-asopuru nne ya dika onye na akpakota akunuuba. Onye obula na-asopuru nna ya, umu nke ya ga eme ya obi uto, aga anu aririo ya mgbe o kpere ekpere. Onye obula na-enye nna ya ugwù ga-enwe ogolgo ndu, Onye obula na akpachapuru nne ya anya, na-egosi nrubeisi na ebe Yahweh no.
Nwa m, nyere nna gi aka mgbe o bu okenye, emekwala ya ihe ariri na ndu ya niile. Ma obu ladi na uche ya ezughi ezu, jiri nghota na ndidi sobe ya, elelikwala ya n’okorobia gi. Maka na a gaghi echefu ihe oma e meere nna. O ga-ewetara gi mgbaghara maka njo.

ABUOMA NA AZIZA: Ps:128:1-2,3,4-5.

Aziza: Ngozi na-adiri ndi na-aturu Chineke egwu, na-eso uzo ya.

  1. Ngozi na-adiri ndi na-aturu Chineke egwu,
    na- eso uzo ya!
    Ihe aka gi kutara ka i ga-eri,
    añuri na oganiihu ga-abu nke gi. Az
  2. Nwunye gi ga-adi ka osisi Vain,
    na-ami mkpuru n’ime ulo gi,
    umu gi ga-adi ka osisi Oliv,
    gbaa oche nri gi gburugburu. Az./
  3. Lee otu ahu ka a ga-esi gozie onye ahu,
    nke na-aturu Chineke egwu.
    Ka Onyenweanyi si na Zayon gozie gi,
    ka i hukwa oganiihu nke Jerusalem,
    ubochi ndu gi niile. Az./

Ihe ogugu nke abuo: 3: 12-21
Ihe ogugu ewetara na ozi Pol di aso degaara ndi Kolosi:

Dika ndi Chineke horola, ndi di nso, na ndi o huru n’anya, yikwasanu obi ebere, obioma, umeala, idi nwaayo na ndidi dika uwe. Na anagiderenu ibe unu. O buru na onye obula nwere mkpesa megide ibe ya, gbagharanu onwe unu. Dika Onyenweanyi si gbaghara unu, unu kwesikwara igbaghara onwe unu. Ma nke kacha ihe ndi a niile, yikwasanu ihunaanya, nke na ejikota ihe niile onu n’idiko n’otu nke zuru oke. Kweenu ka udo nke Kristi na-enye na-achi n’obi unu, nke e si na ya kpobata unu n’otu ahu. Na enyekwanu ekele. Ka okwu nke Kristi biri n’ime unu n’uju ya. Werenu amamihe niile na-akuzirita ibe unu ihe, ma na-aduritakwa ibe unu odu. Werekwanu abuoma na ukwe nke mmuo kweere Chineke ukwe ekele n’obi unu.
N’ihe obula unu na-eme, ma o bu okwu, ma o bu omume, meenu ha niile n’aha nke Dinwenu Jesu. Na-enyekwanu Chukwu Nna ekele site na ya. Ndi bu nwunye, na-asopurunu di unu dika o kwesiri n’usoro nke Dinwenu. Ndi bu di, hunu nwunye unu n’anya, unu ejikwala aka ike emeso ha omume. Umu, na-eruberenu ndi muru unu isi n’ihe niile, n’ihina nke a na-amasi Dinwenu. Ndi bu nna, unu akpasula umu unu iwe, ka ha ghara ida mba.

ALLELUIA ALLELIUA:
Kweenu ka udo nke Kristi na-enye na-achi na obi unu, ka okwu ya biri n’ime unu n’uju ya. ALLELUIA

(A) OZIOMA: 2:13-15, 19-23.

Ihe ogugu ewetaa n’Ozioma di aso nke Matiu dere:

Mgbe ndi amamihe ahu labara, mmuoma nke Onyenweanyi biakwutere Josef na nro si ya, “Bilie, kporo nwata ahu na nne ya gbaga Ijipt. Noro ebe ahu, ruo mgbe m ga-agwa gi, n’ihina Herod bu n’uche icho nwatakiri ahu ka o gbuo ya.” Josef biliri kporo nwata ahu na nne ya n’ime abali gbaga Ijipt. O noro ebe ahu ruo mgbe Herod nwuru. Nke a bu iji mejuputa ihe Dinwenu kwuru site n’onu ndi amuma si, “Esiri m n’ljipt kpoputa nwa m. Mgbe Herod nwuru, mmuoma nke Onyenweanyi biakwutere Josef na nro n’ljipt si ya, “Bilie kporo nwata ahu na nne ya laghachi n’ala Izrel, n’ihina ndi choro igbu ya anwuola.” O biliri kporo nwata ahu na nne ya laghachi n’ala Izrel. Ma mgbe Josef nuru na Akeleus anochiele anya nna ya Herod dika eze ndi Judia, egwu turu ya iga ebe ahu. Ebe o bu na a doola ya aka na nti na nro, o gara biri na Galili, n’obodo a na-akpo Nazaret. Nke a bu iji mejuputa ihe ndi amuma kwuru si, “A ga-akpo ya onye Nazaret.’

(B) OZIOMA: 2:22-40

Ihe ogugu nke a si n’Ozioma di aso nke Luk dere:

Mgbe oge biara maka emume nke idiocha dika iwu Mosis siri di, Josef na Maria kutere Jesu na Jerusalem n’ihu nke Dinwenu. Dika e dere n’iwu nke Yahweh si, “Nwa mbu obula nke bu oke ga abu ihe di nso n’ihu Yahweh.” Ha biara ichu aja dika e nyere n’iwu nke Dinwenu, “Nduru abuo ma o bu umu kparakwukwu abuo.” N’oge a, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem, aha ya bu Simion, o bu onye eziomume burukwa onye na atu egwu Chineke. O no na-elekwa anya maka nkasiobi nke Izrel, Mmuo Nso nonyekwaara ya. Mmuo Nso emeelarii ka o mata na o gaghi ahu onwu tupu o hu Kristi nke Onyenweanyi. Site n’odudu nke Mmuo Nso, nwoke a batara n’Ulonso ma mgbe nne na nna Jesu kubatara ya n’ulonso ka e meere ya dika omenaala nke iwu si di. Simion kuuru ya n’aka ya abuo, kelee Chineke si: “Ugbu a, Onyenwe m, ka nwodibo gi laa n’udo, dika nkwa gi siri di. N’ihi na anya m ahula nzoputa gi, nke i kwadobere n’ihu mmadu niile. O bu ihe nke ga-ekpughe uzo nye ndi mba ozo, na, otito nke ndi gi bu Izrel.” Ihe niile Simion kwuru gbasara nwatakiri ahu bu Jesu turu nne na nna ya n’anya. Simion wee gozie ha, gwa Maria nne Jesu si:
“Lee e dobere nwatakiri a maka odida na mbili otutu mmadu n’Izrel, na maka ihe omumaatu a ga-ekwuto ekwuto, (ma mmaagha ga-amawa gi obi) ka e were kpughee ihe di otutu mmadu n’obi.”

O nwere otu onye amuma nwaanyi aha ya bu Ana, nwa Fanuel, onye si n’agburu Asha. O meela ezi agadi, onye ya na di ya biri naani afo asaa site n’agbogho ya tupu di ya anwuo. O noro onodu nwaanyi isimkpe ruo iri afo asato na ano. O pughi n’ulo nso Chineke, ebe o ji ibu onu na ekpere na-efe Chineke, abali na ehihie. O putara n’oge ahu, kelee Chineke, kwuputakwa maka onye ahu n’ihu ndi niile na-atu anya maka nzoputa nke Jerualem. Mgbe ha mezuru ihe niile dika iwu nke Dinwenu si di, ha laghachiri na Galili, ruo obodo nke ha bu Nazret. Nwata ahu toro, siekwa ike, juputa n’amamihe, grasia nke Chineke nonyekwaara ya.
(C) OZIOMA: 2:41-52.
Ihe ogugu ewetara na Ozioma di aso nke Luk dere:

Kwa afo, nne na nna Jesu na-aga Jerusalem n’oge emume ngabiga. Mgbe Jesu gbara afo iri na abuo, ya na nne ya na nna ya soro gaa dika omenaala si di; oge e mechara emume ahu, ka ha na-alaghachí, nwata ahu bu Jesu noduru na Jerusalem. Nne na Nna ya amataghi. Ha chere na o sonyere n’etiti ndi mmadu. Ha gara ije otu ubochi tupu ha bido choba ya n’etiti ndi ikwuniibe ha na ndi ha maara. Mgbe ha na achotaghi ya, ha laghachiri azu na Jerusalem na achoghari ya. Mgbe ubochi ato gachara, ha huru ya n’ime ulonso Chineke, ka o no n’etiti ndi nkuzi na-ege ha nti na ajukwa ha ajuju. Nghota na oguguisi o ji zaa ajuju turu ndi niile nuru okwu ya n’anya. Mgbe nne na nna ya huru ya, o turu ha n’anya. Nne ya wee si ya, “Nwam, gini mere iji mee mu na nna gi otu a? Lee, mu na nna gi na-achoghari gi kamgbe.” Ma o zara ha si, “Gini ka unu na-achoghariri m, o bu na unu amaghi na aga m anoriri n’ulo nna m. Ha aghotaghi okwu o gwara ha. O soro ha laghachi na Nazaret, na erubekwara ha isi, nne ya dobere okwu ndi a niile n’obi ya. Jesu na-abawanye n’amamihe, na-agba dimkpa, o na-etolitekwa na mmasi nke Chukwu na mmadu.

EKPERE NHUNYE
Onyenweanyi, anyi na-ehunyere Gi aja nke a iji medaa Gį obi. Biko, anyi ji umeala ario Gi, site n’aririo nke Maria, Nne nke Chukwu, bu nwaanyi na-amaghi nwoke, na nke Josef di nso, nye ezinuulo anyi amara iji na-ebi nke oma n’udo. Anyi na-arjo ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSO
Nna kacha obioma, mee ka ndi niile natara achicha nke eluigwe nke a na-eso ukpuru nke ezinuulo di nso, nke o ga-abu, anyį tachaa ahuhu nke uwaa, anyi esoro rite uru nke ndu ebighi ebi. Anyi na-ario ihe ndja site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

error: Alert: Content is protected !!