Igbo Mass Readings for Friday after Ash Wednesday (Wednezde Ntu)

EKPERE MMEGHE
Dinwenu, n’obioma Gi, duzie oge ncheghari nke a anyi malitere. Nyere anyi aka ka anyi jiri ihunaanya na įkwuwa aka oto kwudosie ike ruo na njedebe. Site na Dinwenų anyį Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu: 58:1-9
Ihe ogugu ewetara n’ Akwukwo onye Amuma Aizaya

Besie akwa ike, ahapukwala ihe obula, welie olu gi elu dika opiike gwa ndi nke m mmehie ha, gwakwa ulo nke Jekob njo ha. N’agbanyeghi, ha na-acho m kwa ubochi na enwe mmasi n’imata uzo m, ka a ga-asi na ha bu mba ndi na-eme ihe oma, ma o bu ndi na-anaghi agbahapu iwu nke Chineke ha; ha na-asi m nye ha ikpe nkwumoto, o na-amasi ha ibiakete Chineke nso. “Gini kpatara anyi jiri buo onu ma i hughi ya? Kedu ihe meree anyi jiri butuo onwe anyi ala, ma i mara uma dika i maghi maka nke a?
Ma lee, n’ubochi ibu onu unu, o bu ihe uto nke unu na-acho, na-emegbu ndi niile na-aruru unu oru Lee, unu na-ebu onu ma na-aga n’ihu n’esemokwu na ilu ogu na iji obi ojoo na-etigbusi onwe unu. Udi ibuonu unu n’ubochi taa agaghi eme ka a nu olu unu n’ebe di elu. O bu udi ibuonu di otu a na-amasi m; nke bu onu unu buru ubochi mmadu na-emeru onwe ya ahu?O bu ibudata isi ala dika ahihia puru n’akuku mmiri ma o bu I jiri akwa iru uju na iwere ntu wuo n’ahu? Unu ga-akpo nke a ibuonu n’ubochi nke Oseburuwa hooro? O bu na nke a abughi ibuonu nke na-amasi m:I tohapu agbu nke obi ojoo, ibutu ndi mmadu ibu aru, were hapu ndi a na-akpagbu akpagbu ka ha nwere onwe ha wee kujisie inyagba niile? O bughi ime ka unu na ndi aguu na-agu kee nri unu, ikpobata ndi ogbenye na enweghi ulo n’ime ulo unu; were kpuchie onye gbaoto akwa mgbe unu huru ya ka o ghara ibu na unu na-ezo onwe unu n’ebe umunne unu no. Mgbe ahu ka ihe unu ga-achawaputa dika ututu, otu aka ahu ka ogwugwo oria unu ga-esi abia ngwa ngwa. Eziomume unu ga-eburu unu uzo. Ebube nke Chineke ga-abu nche azu unu.
Mgbe ahu ka unu ga-akpo Yahweh oku, o wee zaa unu, mgbe ahu ka unu ga-ebeku ya akwa, o wee zaa unu; Ebe a ka m no. O buru na unu ewepu n’etiti unu mmegbu, itu aka ma o bu ikwu okwu na-agbawa obi.

ABUOMA NA AZIZA: Ps 51: 3-4, 3-5,18-19.
Aziza: I naghi aju obi gbawara agbawa na nke loghara elogha.

  1. Meere m ebere O Chineke site n’ihunaanya gi,
    Site na nnukwu obi ebere gi hichapu njo m niile;
    Sachapu mmehie m niile,
    wuchapu m na njo m. Az./
  2. N’ihi na amarala m mmehie m niile,
    njo m no na mmuo m oge niile.
    O bu so gi, naani gi ka m mere njo megide,
    ihe di njo na ihu gi ka m mere. Az./
  3. I naghi enwe mmasi obula n’aja,
    Aja nsureoku anaghi ato gi uto,
    Aja a na-achuru Chineke bu obi gbawara agbawa,
    I naghi aju obi gbawara agbawa na nke loghara elogha. Az./

MBEKU: Mt: 4:4
O bughi naani site na nri ka mmadu si adi ndu, kama site n’okwu obula nke si n’onu Chineke puta.

ΟΖΙΟΜΑ: 9:14-15.
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Matiu dere.

Mgbe Jesu rutere n’akuku nke ozo, n’obodo Gadara, umuazu Jon biakwutere ya juo ya si, “Gi ni mere anyi na ndi Farisii ji ebu onu ma umuazu gi anaghi ebu onu?” Jesu zara ha si, “Ndi biara oriri agbamakwukwo ha ga-ano n’uru mgbe ha na nwoke na-agba akwukwo ka no? Oge na-abia mgbe a ga-anapu ha nwoke na-agba akwukwo, mgbe ahu, ha ga-ebube onu.”

EKPERE NHUNYE
Dinwenų, site n’amara nke Eucharistia nke oge ebumonu a, mee ka anyį na-eto n’ihunaanya na n’ijeozi, wee buru ihe nchuaja nke ga-ekwesį Gi inara. Anyi na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSO
Dinwenų, biko mee ka oke anyį na-eketa n’ihe omimi nke a tohapu anyi na njo ma meekwa ka anyi kwesi ogwugwo Gį. Anyi na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

error: Alert: Content is protected !!